Lisa Presley: Ihe ndị maghị maka otiegwu a bụbụ nwunye Michael Jackson, lara mụọ n'afọ 54

Lisa Marie Presley

Ebe foto si, Getty Images

Lisa Marie Presley, nwaanyị otiegwu Michael Jackson lụburu anwụọla ka ọ gbachara afọ 54, dịka nne ya bụ Priscilla Presley si kwuo.

Lisa bụ naani otu nwa okaibe otiegwu bụ Elvis Presley mụrụ, lụrụ Michael Jackson n'afọ 1994 mana alụmdinanwunye ha dịrị naanị ọnwa iri na itoolu(19).

O mechara lụọ ome ejije Nicolas Cage n'ọgọstụ afọ 2002, mana ha lụrụ onwe ha naanị abalị 107.

Nne Lisa kwuru na ozi o wepụtara sị, "Ọ bụ n'obi mwute ka ji na ekwupụta ozi mgbawa obi na nwa m nwaanyị mara mma Lisa Marie ahapụla anyị."

Ọ gara n'ihu kọwaa nwaanya nwaanyị dịka " Nwaanyị kachị eji obi ya nile eme ha mabụrụkwa onye hụrụ mmadụ n'anya nke ukwu". ma rịọ ka ndị mmadụ nye ha ohere iru ụjụ ọnwụ ya n'udo mana o kwughị ihe gburu ya.

Lisa Presley na Michael Jackson

E ji ọsọ buga Lisa bụ otiegwu n'ụlọọgwụ ụbọchị Tọzde.

Akwụkwọ akụkọ na-ekwu na ọ nwụrụ site n'ọrịa obi Bekee kpọrọ 'cardiac arrest."

A hụrụ ya n'ụlọ ya dị na Calabasas, California, ebe ọ naghị ekusi ume dịka otu onye si gwaa ụlọntaakụkọ Amerịka a kpọrọ TMZ."

Lisa gwara ndị ntaakụkọ na ya hụrụ Michael Jackson n'anya mana Jackson na-agawara onwe ya izuụka kwuru izuụka a gaghị ahụ ya anya.

Ihe ndị i maghị maka Lisa Presley

Priscilla Presley, Lisa Presley and Benjamin Keough

Ebe foto si, Reuters

A mụrụ Lisa Marie Presley n'afọ 1968.

O mechara soro nzọụkwụ nna ya bụ Elvis Presley n'iti egwu.

O tipụtara efere egwu atọ gụnyere efere egwu mbụ ya nke erere puku kwuru puku.

A ma ya ama maka ịlụ ndị nwere agba nke gụnyere Michael Jackson, ome ihe ejije ama ama bụ Nicholas Cage, otiegwu Danny Keough nakwa Michael Lockwood.

Lisa Marie mụrụ Michael Lockwood bụ di nke anọ ya ,onye ya na ya lụrụ n'afọ 2006 ejima nwaanyị abụo.

Ọ mụrụ ụmụ anọ, otu n'ime ha bụ ome ihe ejije bụ Riley Keough. 

Nwa ya nwoke bụ Benjamin Keough,gburu onwe ya n'afọ 2020.