Ihe Wilson Ndubuisi kwuru maka ebubo na o gburu nwunye ya n'ihi 'bread'

Ebe foto si, Ogochukwu na Wilson
Akụkọ na-efegharị na soshal midia ugbua bụ na otu nwoke a kpọrọ Ndubuisi Wilson tigburu nwunye ya bụ Ogochukwu Anene n’ihi achịcha n’Enugwu Steeti.
Mgbe BBC Igbo kpọtụụrụ ezinaụlọ Ogochukwu, nwanne ya nwoke bụ Chukwuebuka Anene kọrọ etu mmiri si banye n’opi ụgbọghọrọ.
Anene kwuru “ihe a malitere n’ụbọchị atọ nke ọnwa Disemba, 2022 mgbe Ogo gwara di ya ka o nye ya ego ka ọ zụtara ụmụaka achịcha maka nri ụtụtụ mana di si na o jighi ego ọbụla.
“Ogo mechara jiri ego zụta achịcha ma meere ụmụaka nri ahụ mana di ya gara n’ime usekwu were achịcha niile e dosaara ụmụaka ha tachaa.
“Mgbe Ogo jụrụ di ya bụ Wilson ihe mere o jiri kpaa ụdịrị agwa, ha malitere ise okwu di ya wee kụwazie ihe.
“Wilson weere ughegbe (mirror) ha kowara n’ụlọ tie Ogo nke merụchara ya nnukwute ahụ, ọ gakwara n’ihu tie ọkpara ya dị afọ iri na anọ ihe mgbe ọ sị ka o gboo ọgụ dị n’etiti nne na nna ya.
“Ogo kpọro anyị (ezinaụlọ ya) na-ekwentị, nwanne anyị nwaanyị ji ọsọ bịa n’ụlọ ha ma hụ ka Ogochukwu na-ebe akwa nakwa ahụ ndị o merụchara site n’ihe di ya Wilson tiri ya.
“Ha gwara Ogo gawa n’ụlọọgwụ ka e nyochaa ya ahụ mana ọ sị na ọ ga-azụrụ ọgwụ ṅụọ maka ahụ ndị o merụrụ”.
Anene sị e ruziri n’elekere abụọ nke isi ụtụtụ Fraịde 9 Disemba, 2022 ka Ogo kpọrọ ya n’ekwentị na-ebe akwa na afọ na-enye ya nsogbu nke ukwuu.
“Ọgọ kpọrọ m n’ekwentị na-eti na afọ na-enye ya nsogbu, mgbe m jụrụ maka di ya bụ Wilson, nwa ya sị na o mere njem mana o mechara lọta ma kpọrọ Ogo gawa n’ụlọọgwụ a kpọrọ ‘Niger Foundation dị n’Enugwu.
“Ndị dọkịta nyochara Ogo ahụ ma sị na ọ merụrụ ahụ n’ime ahụ nke mere ọbara jiri gbajuo ya n’ime ahụ (internal bleeding) site n’akwara ya gbawara agbawa.
“Ha sị ka e buru Ogo gawa n’ụlọọgwụ UNTH Enugwu, e ruru ebe ahụ ma malite ịlekọta ya anya mana tupu a na-emecha nyocha ọzọ, Ogo nwụrụ n’ihe dị ka elekere iri na otu nke abalị.”
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
“Di ya bụ Wilson gwara m na ọ chọrọ ka o buru ozu nwanne m nwaanyị gaa lie, agwara m ya mba na anyị ga-eme nyocha nke a kpọrọ ‘autopsy’ ka a chọpụta kpọmkwem ihe gburu Ogo.
Anene sị na o mechara kpọọ ndị uweojii ha nwụchie Wilson, ma tinye na mkpọrọ ruo mgbe a ga-emecha nyocha.
“Dịka Wilson nọ n’ụlọmkpọrọ, akụkọ pụtawaziri na-ekwu na o dịla anya ọ malitere iti Ogo ihe, nke ọtụtụ ndị mmadụ gbara akaebe.
“Ndị uweojii mechara sị ka e mee nyocha ya bụ ‘autopsy’ n’ụlọọgwụ UNTH, anyị kwụrụ ndị dọkịta ụgwọ maka nyocha ahụ.”
Ọ sị na e mechara nyocha ahụ, onye dọkịta na ndị uweojii apụtazie na-ekwu na Ogochukwu nwụrụ ọnwụ chi ya, na ọ bụghị site n’ihe Wilson tiri ya.
“Ha sị na Ogo nwere ọbara mgbalielu (hypertension), na ọ bụ ya dọwara akwara dị n’ime ahụ ya mere ọbara jiri gbajuo ya n’ahụ.
“Ha sị na ọbara gbabara Ogochukwu n’ime ahụ ruru lita abụọ na ụma (2.5litres).”
Anene sị na ọ nabataghị nyocha ahụ onye dọkịta UNTH mere maka na onwere ka ya ndị uweojii nakwa otu onye na-achịteanya Wilson sị na-akpa agwa tupu e mee ya bụ nyocha.
Ọ gakwara n’ihu kwuo na dọkịta ahụ maọbụ ndị uweojii ekweghi egosi ya akwụkwọ mpụtara nyocha ahụ e mere.
“Anabataghị nyocha a sị na Ogochukwu nwanne m nwụrụ ọnwụ chi ya, ọdị m ka ndị uweojii na dọkịta ahụ nakwa Wilson ọ kpara nkata wepụta mpụtara nyocha a.
“Dịka ọ dị ugbua, ndị uweojii atọhapụla Wilson ma sị na aka ya dị ọcha maka na ‘autopsy’ sị na Ogo nwụrụ ọnwụ chi ya”.
“Ihe anyị chọrọ (ezinaụlọ Ogochukwu) bụ ka ọha nụrụ olu anyị, ka e mee ezigbo nyocha ma kpee ikpe ziri ezi banyere ọnwụ Ogochukwu.
“Ọ bụghị m gburu nwunye m, aka m dị ọcha”

Ebe foto si, Wilson
Ndubuisi Wilson Uwadiegwu bụ onye a na-ebo ebubo ikugbu nwunye ya Ogochukwu Uwadiegwu gwara BBC Igbo na aka ya dị ọcha, na o nweghi ihe ọbụla o tiri nwunye ma ọ fọdụzie igbu ya.
Ọ sị na-agbanyeghi na ya nwunye ya nwere esemokwu n’ụbọchị atọ ọnwa Disemba, 2022 kama na o nweghi mgbe o jiri tie nwunye ya ihe.
Ọ sị o tetara ụra n’ụbọchị ahụ, agụụ wee gụọ ya, o were achịcha dị n’ụsekwu ha ṅụọ mmiri ọkụ bekee (tea) ka o nwee ike ṅụọ ọgwụ.
“Nwunye m bịara jụọ kedụ o nye tara achịcha ahụ, m wee sị ya na ọ bụ m tara ya, m weere naanị otu puku naịra fọrọ n’akpa nye nwa m nwoke ka ọ zụta achịcha ọzọ.
“Nwunye m siri ọnwụ na m wetekwuo ego ka e were zụta ihe ndị ọzọ mana a gwara m ya na ego adịzighi m n’aka.
Nke a mere o ji na-akọ m ọnụ mana na-arụ m aka n’ihi, a ka na-ekwu nwa m nwoke bịara ịlụso m ọgụ maka nke a”
“Akụghị m nwunye m ihe, e wepụtara eriri ukwu m (belt) mana e jighi m ya pịa ya. Kama e ji m iwe were aka kụwaa ughegbe kosara n’ụlọ nke merụrụ nwunye m obere ahụ n’aka.
“Eji m iwe na nwa m nwoke kparịrị m ma cheere m aka ọkụ kụwaa ughegbe ahụ”
Wilson kwuru na ọ bụ naanị otu ugboro ka metụrụ nwunye ya aka sị na ọ na-eti ya ihe, na o teela aka mgbe o mere.
Wilson sị na ya na nwunye ya mechara mezie n’ụbọchị ahụ tupu ọ lawazie obodo ya bụ Awkunanaw Obiagu, Enugwu Steeti.
Ọ sị na ọ nọzi n’obodo ya n’elekere abụọ nke isi ụtụtụ ụbọchị 9 Disemba 2022, mgbe nwa ya nwoke kpọrọ n’ekwentị na nwunye ya na-arịa ọrịa.
“E si m n’obodo m nyara ụgbọala lọtawa n’Enugwu n’isi ụtụtụ ahụ bịa kpọrọ nwunye m gawa ụlọọgwụ Niger Foundation.”
Wilson sị na ọ bụzi n’ụlọọgwụ UNTH bụ ebe a sị ha kpọrọ nwunye ya gawa ka ọ nọ nwụọ.
Ọ sị na ọ bụghị ya gburu nwunye ya, na ọ bụ ọrịa metụtara ọbara mgbalielu gburu nwunye ya.
“Agakwuru m dọkịta na UNTH jụọ biko kedụ ihe gburu nwunye m?
“Ọ gwara na ọ bụ ọrịa a na-akpọ ‘aneurysm’ nke ihe butere ya bụ ọbara mgbalielu.
Ihe i kwesịrị ịma maka Wilson na Ogochukwu
- Ndubuisi Wilson Uwadiegbwu bụ onye obodo Awkunanaw Obiagu, Enugwu Steeti ebe Ogochukwu Anene bụ onye Awka dị n'Anambra Steeti.
- Ha alụọla onwe ha kamgbe ihe ruru afọ iri na ise.
- Ha mụrụ ụmụ anọ, nwoke anọ na otu nwaanyị.
- Wilson bi na Legọs ebe ọ na-arụ ọrụ mana Ogochukwu nwunye ya na ụmụ ya bi n'Enugwu bụ Wilson na-abịa eleta ha kwa mgbe kwa mgbe.









