Stanley Obi and Sarah Mudge death: Etu enyi nwaanyị ochie Stanley Obi si jiri ọkụ gbagbuo ya n'Australia

Ebe foto si, Others
Akpataoyi ka na-atụ ndị ogbe Queensland dị na Australia ka Mazị Stanley Obi, onye Naijirịa, na enyi nwaanyị ochie siri gbaa ọkụ n'obodo ahụ.
Ọkụ gbagburu Stanley gbara afọ iri atọ na atọ (33) mgbe enyi ya nwaanyị ya na ya yiburu mbụ mụnyere ọkụ n'ụlọ ya n'abalị Wenezde.
Ndị uweojii ogbe ahụ sị na Sarah Mudge gbara afọ iri atọ na otu (31) zubara na be Stanely n'abalị ahụ ga wụọ ya petrolu, mụnye ya ọkụ gbara ha abụọ na ụlọ ya.
Ha kpọrọ ndị uweojii ebe ahụ bụ ebe ihe niile dị n'ụlọ ahụ repịara erepịa.
Obi na enyi ya nwaanyị ọhụrụ gbapuru na ya bụ ọkụ mana onye nke mụnyere ya bụ ọkụ bụ Mudge nwụrụ anwụ.
E bugara Obi ụlọọgwụ mana ọ fọrọ nwantịị ka ya bụ ọkụ gbazuo ahụ ya niile.
Ọ mechere nwụọ n'elekere iri nke abalị Tọzde, dịka akụkọ 9news nke Australia kwuru.

Ebe foto si, 9news
Ihe ndị mmadụ hụrụ ebe ahụ
Ọtụtụ ndị agbataobi ebe ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ha kọọrọ 9news ka Obi siri gbapụta n'ime ọkụ ahụ na-arịọ ndị mmadụ ka ha kpọọ ndị uweojii.
Otu onye agbataobi ya sịrị, "e sị m na mpio windo m, na ahụ ka anwụrụọkụ sị n'ime ụlọ Stanley na-apụta".
Nwoke ahụ sịkwara na ọ hụrụ ka enyinwaanyị ọhụru Obi ka ọ chị ụmụaka atọ si n'ime ụlọ ahụ gbapụta.
Ọ sị na ya chekwa na petrolu Mudge wụrụ juru ha ahụ.
Nwoke ahụ kwuru na "a ejidere m nke nta hụ na petrolu juru ya ahụ niile".
"Mgbe m kuuru ya n'akụ, afe m niile bụrụ sọ petrolu".
"ihe a niile mere na-agbata n'uche ma m muchie anya".
Onye agbataobi ọzọ sị na Obi na-eti mkpu n'asị na ya bụ nọsụ, na ọnọdụ ya nọ adịghị mma ma ọlị.
" Ọ nọ na-eti mkpu n'asị na ọnọdụ m adịghị mma. gwa ha na ọnọdụ m adịghị mma. E nwere m ike iwụ. Nyere m aka ọsịsọ".
"Ihe anyị hụrụ na enyi egwu. Anyị na-akasị ya obi na-asị na ọ ga-adị mma."
Onye agbataobi ọzọ sị na ya bụ ihe ha hụrụ dị egwu na mgbede ahụ.
Ndị uwojii gbara ama na Obi na Mudge enwebuola nsogbu mbụ nke mere e jiri napụ ya ụmụaka ha nye Obi.
Otu chọrọ ịchụru ezinaụlọ Obi ntaego n'intanetị sị na Obi na-aṅụrị maka agba ọhụru o ruru na ndụ ya, ma na-akọwa ya dịka ezigbo mmadụ nwere obi umeala.
Permier ebe ahụ bụ Annastacia Palaszczuk kwuru okwu maka ọnwụ ya.
Ọ sị na " nke a bụ ajọ ọnwụ gburu nwantorobia bụ nke mere ka ọkụ gbagbuo ya na ntabi anya".
O kwuru na "ọgụ ezinaụlọ kwesiri ịkwụsị ozugbo"
Ọ sịkwa, "anyị chọrọ obodo ebe nwoke na nwaanyị ha nhatanha bụkwa ebe ugwu na nsọpụrụ dị".
Ndị uwojii ahụ sị na afọ gara aga, ihe dịka 120,000 ọgụ ezinaụlọ ka ha kwuru.
Osote Kọmishọna ndị uweojii Queensland sị na ọgụ ezinaụlọ ha hụru ruru pasentị 40% na steeti niile dị na mba ahụ.








