Ndị ojiegbe bịara ịgba Ihiala LGA ọkụ gburu ndị 'vigilante' atọ ma bepu otu onye isi

Ihiala LGA

Ebe foto si, Anambra Police

Ndị uweojii Anambra Steeti ekwuola na ndị ojiegbe wakporo isiụlọọrụ okpuruọchịchị Ihiala dị na steeti gbuo ndị ọrụ nchekwa ‘vigilante’ mmadụ atọ ma gbaa ụfọdụ ụlọ ọkụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii a bụ Tochukwu Ikenga sị na ha natara oku maka mkpamkpa ndị na-akpa n’ihe dịka elekere abụọ nke isi ụtụtụ ụbọchị Tọzde 12 Jenụwarị 2023.

“Na-egbughi oge, ndị uweojii na ndịagha ji ọsọ wuchie n’isiụlọọrụ Ihiala ahụ, ebe ha na ndị ojiegbe a malitere ịkwarịta mgbọ.

Ọ sị na a gbagburu otu onye n’ime ndị ojiegbe ahụ ebe ndị ọzọ bu mmerụ ahụ ha ngwa ọgụ ha ma rie mbọ mbọ ọsọ.

Ihiala LGA

Ebe foto si, Anambra Police

Ọ gara n’ihu kwuo na ha gbachiri ngwa ọgụ ndị dịka ogbunigwe na ihe e ji agba ya, ọtụtụ gbọ egbe nakwa egbe AK47, mma nakwa ọtụmọkpọ dị iche iche.

Ikenga sị tupu ha na-erute ebe ahụ, na ndị ojiegbe a adịla mbụ gbuo ndi ọrụ nchekwa ‘vigilante’ atọ ma bepu otu n’ime ha isi.

Ọ gbakwụnyere na e burula ozu ndị a e gburu dịka nyocha amalitela n’ike inwuchi ndị otu a gbara ọsọ.

'Anyị zọpụtara otu nwoke a tọọrọ n'Uga/Akokwa'

Ụgbọala nwoke a tọọrọ

Ebe foto si, Anambra Police

N’otu aka ahụ, Ikenga sị na ndị uweojii nọ n’ọrụ nchekwa n’okporoụzọ Uga na Akokwa zọpụtara otu nwoke ndị ntọ tọọrọ nakwa ụgbọala ya n’ụbọchị Tọzde a.

Ikenga sị na ndị uweojii hụrụ ka ụgbọala ahụ nọ n’akụkụ ụzọ mgbe ha ruru nso, ha hụrụ ka nwoke a e merụchara ahụ na-azọ ume ya n’ụgbọala ahụ.

Ọ sị na e burula nwoke a gawa n’ụlọọgwụ ebe ọ na-anata ọgwụgwọ.

Ndị ojiegbe egbuola ihe karịrị mmadụ iri n'Anambra naanị na 2023

Ndị ojiegbe

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Foto a bụ nke e tinyere iji kọwaa akụkọ

Ndị nwụrụla n'aka ndị ojiegbe n'Anambra steeti n'ime afọ 2023, akarịala iri ugbua.

Ọnwa Jenụwarị 2023 agaala naanị abalị 11 nke pụtara na opekatampe ndị ojiegbe na-egbu otu onye kwa ụbọchị n'Anambra n'ime afọ 2023, bụ ndị pụtara n'akụkọ.

Nke a na-eme n'agbanyeghị na Gọvanọ Steeti ahụ bụ Chukwuma Soludo, jara onwe ya ike n'ozi ekeresimesi ya oge o kwuru na ọchịchị ya emeela ka Anambra Steeti soro n'ebe a kacha nwee udo na Naịjirịa.

Ngagharịiwe ụmụakwụkwọ Unizik

Ebe foto si, Twitter

Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ Unizik mere ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde n'ihi oke ogbugbu mmadụ n'ụlọakwụkwọ ahụ.

N'ụbọchị abụọ nke Jenụwarị, ndị ojiegbe gbagburu onyeisi oche otu jikọrọ ndị obodo Obosi, bụ mazị Ikechukwu Okolo, ma gbukwaa mmadụ anọ ọzọ n'Okpuno Awka, nke otu onye n'ime ha bụ onye a sị na o ji ọkwa onyeisioche pati PDP n'obodo ahụ.

Gọọmentị Anambra Steeti kwuru na ọ bụ ọgụ dị n'etiti ndị otu nzuzo kpatara ogbugbu ndị ahụ.

O teghịkwa aka, N'abalị atọ nke ọnwa Jenụwarị, ndị ojiegbe, e chere bụ ndị otu nzuzo, gbagbukwara mmadụ atọ n'ihu ụlọ akwụkwọ Mahadum Nnamdi Azikiwe dị n'Awka.

Onyonyo ozu mmadụ atọ a fesara na soshal midia nke mere aha Unizik ji wuo ewu na 'Twitter' n'ụbọchị ahụ.

Ọzọkwa, N'abalị ụbọchị Sọnde, abalị asatọ nke ọnwa Jenụwarị, ndị ojiegbe wakporo otu nwata akwụkwọ Unizik n'ụlọ ya, zuo ya ohi ma gbagbuo ya.

Nke a mere ka ụmụakwụkwọ Unizik mee ngagharịiwe n'ụbọchị Mọnde ma na-ekwu na ụlọakwụkwọ ha aghọọla ebe onye ọbụla na-atụ ụjọ maka ndụ ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Etu ndị ojiegbe si gbuo nwaanyị dị ime na mmadụ atọ ọzọ n'Ihiala na Jenụwarị 10

Ndị ojiegbe

Ebe foto si, Screengrab

Mmadụ anọ, nke gụnyere otu nwaanyị dị ime, tufuru ndụ ha n'aka ndị ojiegbe wakporo obodo Ihiala n'abalị ụbọchị Tuzde.

Akụkọ kwuru na ndị ekperima a wakporo mpaghara Nzomiwe 'street' nke dị n'obodo Eziani, n'okpuruọchịchị Ihiala, ma malite ịgba egbe aghara aghara, we gbagbuo mmadụ anọ.

Ndị uweojii Anambra Steeti, kwuru na ya bụ ihe mere eme n'ezie.

Toochukwu Ikenga bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii sị na ọbụ otu nwaanyị na ụmụnwoke atọ nwụrụ na mwakpo ahụ, mana ndị obodo gwara ndị ntaakụkọ na nwaanyị ahụ dị ime.

"Mmalite nnyocha anyị gosiri na ndị ojiegbe bucha AK47 malitere ịgba egbe aghara aghara n'enweghị onye kpasuru ha iwe, mgbọ wee tụọ ndị nkịtị anọ. Anyi ebugala ozu ha n'ụlọ ozu," Ikenga kwuru.