Soludo akatọọla ogbugbu onyeisioche 'town union' Obosi na mmadụ anọ ọzọ

Ebe foto si, Anambra Government
Ndị ekperima amabeghị ndị ha bụ egbuola mmadụ ise n'obodo Obosi nakwa Okpuno, Anambra Steeti, n'ụbọchị Mọnde, bụ abalị abụọ nke ọnwa Jenụwarị 2023.
Ọ bụ Christian Aburime, bụ onye enyemaka mgbasaozi Gọvanọ Chukwuma Soludo, kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'abalị ụbọchị Mọnde iji katọọ ya bụ ihe.
Aburime kwuru na ndị ojiegbe gbagburu Mazi Ike Okolo, bụ onyeisioche otu jikọrọ obodo Obosi, n'ebe a na-ere mmanụ ụgbọala n'Obosi, dị n'okpuru ọchịchị Idemili.
Mmadụ anọ ọzọ - Onyiebo Okoye, Kenechukwu Okeke, Jude Ebenezer na Obinna Maduka - bụ ndị a gbagburu n'obodo Okpuno nke dị n'okpuruọchịchị Awka South.
Aburime kwuru na ọ bụ ọgụ dị n'etiti ndị otu nzuzo butere ọnwụ ndị a, ma kwukwaa na Gọvanọ Soludo ekwela nkwa na "aka ga-akpara ndị niile aka ha dị n'ọnwụ ndị a, ebe ọ sọrọ ha gbaga".
Otu onye Okpuno na-achọghị ka a kpọọ aha ya gwara ndị ntaakụkọ na otu n'ime ndị e gburu n'Okpuno, bụ Kenechukwu Okeke, bụ onyeisi ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'Peoples Democratic Party' n'okirikiri ahụ.
Onye ahụ kwuru na ọ bụ ụmụokorobịa bu ụgbọala 'hilux' bata n'ime ụlọ otu onye aha ya bụ Obi Maduka
Ndị uweojii Anambra Steeti ekwubeghị ihe ọbụla maka nke a.
Ọnụ na-ekwuru ha bụ Toochukwu Ikenga azabeghị ozi anyị zigaara ya gbasara ya.
Ọnọdụ nchekwa n'Anambra steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ogbugbu mmadụ a na-abịa naanị ka ọ gachara ụbọchị olemole Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo turu ọnụ na ọchịchị ya ewetala udo na steeti ahụ.
N'ozi o ziri ndị Anambra n'oge ekeresimesi 2022, Soludo kwuru na tupu ọ malite ọchịchị, Anambra steeti dịka mpaghara ebe a na-alụ agha.
"Ndị ekperima dịka ha weere ọnọdụ n'ọtụtụ okpuruọchịchị na steeti anyị, mana kamgbe anyị malitere ọrụ, anyị ekpochapụla ha niile. Ugbua, e nwereike ikwu na Anambra so na steeti nchekwa kacha mma na Naịjirịa," Soludo kwuru.
Mana mwakpo a mere n'Obosi nakwa Ọkpụnọ egosila na nnukwu ọrụ ka fọkwara n'okwu gbasara nchekwa nakwa mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile.
N'Imo, steeti ya na Anambra nwere oke ala, ndị ojiegbe wakporo aka chịburu steeti ahụ bụ Ikedi Ohakim n'ụbọchị Mọnde kwa, ma gbuo ndị uweojii na-eche ya nche.
Ntakịrị ihe ka Ohakim na ụmụ ya abụọ ji gbalahụ ọnwụ na ya bụ mwakpo nke mere na mpaghara Mbano.
Ọnọdụ nchekwa akawanyela njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa n'ọdị nso a, n'ihi ike ọjọọ ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ na-akpa.
Ndị ọrụ nchekwa na-ekwu na ọ bụ ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ 'Indigenous People of Biafra' na-akpa ike ọjọọ a, mana ndị Ipob agọọla na ọ bụghị ha.










