Unknown Gunmen Attack: Ndị oji egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'Anambra, gbuo onye nche n'Enugwu

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ si obodo Uli nke dị n'okpuruọchịchị Ihiala n'Anambra Steeti na-ekwu na ndị oji egbe amaghi ndị ha bụ wakporo ụlọọrụ ndị uweojii nọ n'ebe ahụ taa bụ ụbọchị Fraịdee.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga gwara BBC Igbo na ihe a mere n'ezie.
O kwukwara ha gbochiri ndị ekperima ahụ imezu ebumnuche ha.
N'okwu ya, ọ sị 'Agbabenyi na ndị a mere mwakpoo n'ụlọọrụ anyị dị n'Uli, enweghi onye Uweojii ha gburu"
Okpuruọchịchị Ihiala n'Anambra steetị bụ ebe ndị oji egbe na ndịagha Naịjirịa na-akwakọrịta mgbọ kwa mgbe kwa mgbe.
N'abali ole na ole gara aga, ndị agha Naịjirịa gburu ndị oji egbe anọ dịka ha kwakọrịtara mgbọ.
Mana ụgbọala ndị agha nwere ihe mberede okporoụzọ dịka ha na-agbaga ebe ahụ, otu onye agha nwụrụ na ya bụ ọdachi.
Ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ n'Anambra steeti
Ọtụtụ ọgbaghara na okwu mwakpoo n'aka ndị oji egbe adapụtala n'akụkụ Ekwulobia na Ihiala nke Anambra steeti na nso nso a dịka ndị ọrụ nchekwa na-agba mbọ idajuu ọgbaghara ndị a.
Cheta na oge e mere ntuliaka gọvanọ Anambra steeti n'afọ 2021, emeghi ntuliaka n'okpuruọchịchị Ihiala n'ụbọchị ehibere ime ya n'ihe etu ọnọdụ nchekwa si dị ebe ahụ.
Mana e mechara yigharịa ma mee ya ntuliaka ahụ n'izuụka na-esote ya.

Ebe foto si, Getty Images
N'afọ 2021, Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa banyere n'ọnọdụ nchekwa dị egwu.
Ụfọdụ ihe egwu so nke a gụnyere mwakpo na ntọrọ ndị mmadụ, ntọrọ ndị eze odinala, mwakpo ụlọọrụ ndị uweojii, ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntulika bụ Independent National Electoral Commission (Inec), oke ogbugbu ndị mmadụ, mwakpoo ụfọdụ ụlọ mkpọrọ na ebe ndị ọzọ.Gọọmentị Naịjirịa ka na-agba mbọ n'waghachịte udo na nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa ugbua.
Etu e si gbuo onye nche bụ Jango n'Enugwu
Na nke dịka ibe ya, akụkọ apụtala na ndị oji egbe gbagburu otu onye nche a ma ama n'Enugwu aha ya bụ 'Jango' n'ụbọchị Tọzde.
Nke a na-abịa dịka ndị Enugwu ka na-ama jijiji maka ogbugbu ndị oji egbe gburu ndị uweojii atọ n'ime ụbọchị Tọzde ahụ.
E gburu onye nche a e ji 'Jango' maara n'ogige Meniru street dị na Gariki nke Enugwu.
Anya hụrụ ka o si mee gwara BBC Igbo na ọ bụ na mgbede Tọzde ka ndị oji egbe wakporo Meniru street were egbe chụsaa ndị mmadụ.
Ngwagwa ha ruru n'ụlọ onye ha na-achọ bụ Jango, ha were egbe gbagbuo ya.
Ndị uweojii Enugwu steeti ekwubeghị ihe ọbụla banyere nke a, mana BBC Igbo ezigarala ha ozi.
Ọtụtụ ndị bi n'Enugwu nọ n'oke ụjọ ugbua maka ndị oji egbe a na-amaghị ndị ha bụ na-akpagharị mana na-egbu ndị mmadụ.












