Nkpor Killings: Etu ndị omekome si gbagbuo mmadụ atọ n'ọgbakọ emere na Nkpor - Ndị uweojii Anambra steeti

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ n'ehihie ụbọchị Tuzde ka akụkọ pụtara na agbagbuola ụmụ nwoke atọ na Nkpor.
Ndị uweojii kwuru na ọ bụ ndị omekome abụọ bu egbe nọ n'ime ụgbọala ojii mere ya bụ ihe.
Dika ha si kwuo "ụmụ nwoke abụọ ahụ gbanyere egbe n'ime ọha mmadụ dịka emechara nhọpụta ndị ọrụ 'Tax force' n'Eke Nkpor.
E bugara ndị ahụ ụlọọgwụ mana dọkịta hụrụ ha kwuru na ha anwụọla nke mere ka ebugazie ozu ha n'ụlọozu ugbua.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii ekwuola na ha na-eme nnyocha zuruoke iji mata ihe butere ya bụ ọdachi.
O dobeghi anya ma mmadụ edeere mmadụ atọ a ede ka ọbụ mgbọ nkịtị agbapụrụ tụrụ ha.
Akụkọ ka na-abịa




