Peter Obi awụbala otu ndọrọndọrọ ọchịchị ADC

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Disemba 2025.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Usoro ụtụisi ọhụrụ ga-amalite n'abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị - Tinubu

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, Nigeria Presidency

    Onyeisiala Naijiria bu Bola Tinubu ekwuola na atụmatụ ụtuisi ọhụrụ gaebido dịwa ire malite n'abalị mbụ nke onwa Jenụwarị afọ 2026.

    N'ozi nke onyeisiala ma wepụta na nsonso a, Tinubu kwuru na usoro ọhụrụ abụghị 'iji bulie ego ụtụisi , kama ọ bụ ịhazigharị a ya'.

    Ọ gara n'ihu rịọ ka onye ọbụla kwado atụmatụ ahụ.

    N'okwu ịwu ụtụisi a sị na ọcụlọọrụ ya bipụtara ihe dị iche na ihe Ụlọomeiwu binyere aka, o kwuru na "o nweghị ihe nwere isi a gbanwere ga-eme ka a kwụsị atụmatu ahụ".

  2. 'Ọ bụ mpaghara ọdọahịa a na-ere 'ọkịrịka bale' n'Ahịa Arena' Legọs ka ọkụ gbapịara'

    Ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ bịara n'ebe ọkụ gbara nArena Mall dị n'Oshodi Leg os na mgbede Tuzde

    Ebe foto si, Nema

    Ndị ọkụ gbara ụlọ ahịa ha n'ahịa Arena dị n'Oshodi Legọs steeti na-agụkọzi ihe o funarịrị ha.

    Opekatampe ọkụ ahụ gbara ọdọahịa ọnụ ọgụgụ ya ruru iri.

    Aha ebe ọ metụtara bụ 'Arena Military Mall' dị n'Oshodi, Legọs .

    Nke a mere na mgbede ụbọchị Tuzde.

    Otu onye na-azụ ahịa n'ebe ahụ bụ Onyinye Nwajindu gwara BBC n'ekwentị na ọkụ ahụ metụtara ndị na-ere ọkrịka n'akpa n'akpa."

    "Ọ bụ ndị na-ere ọkịrịka beelụ, ọ bụghịkwa ndị na-ere otu otu ka o metụtara."

    Ngalaba na-ahụ maka ịgbanyụ ọkụ na Legọs steetị kwuru na ihe niile ederela jụụ.

    Onyeisi ha bụ Margaret Adeseye, onye gbara ama na o nweghị onye nwụrụ n'ọkụ ọgbugba ahụ kwuru n'ozi o wepụtara sị 'a ga-eme nnyocha, mata ihe butere ya".

    Nke a bu ọkụ nke abụọ na-agba n'ahịa na Legọs n'otu izuụka.

    Ọkụ gbara ụlọelu ogogo 22 na Martin Street dị na Legọs Island a kpọrọ 'Great Nigeria Insurance House" bụ ụlọ ọtụtụ ndịagha na-edowe ngwahịa ha.

  3. Peter Obi awụbala otu ndọrọndọrọ ọchịchị ADC

    Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambra steeti

    Ebe foto si, Peter Obi / Facebook

    Nkọwa foto, Peter Obi

    Peter Obi bụbu Gọvanọ Anambara steeti ma zọkwaa ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 abanyela n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị 'African Democratic Congress' (ADC).

    Obi hapụrụ 'Labour Party' bụ ebe ọ nọ zọọ ọkwa Onyeisiala n'afọ 2023 ma banye n' ADC.

    N'oge Peter Obi na-ekwu okwu ka ọ sị na "emume a na-egosi na ADC ebidola ịnapụta Naịjirịa n'aka APC".

    "Taa bụ ụbọchị dị mkpa, ụbọchị ikpeazụ n'afọ 2025, anyị na-emechi afọ na-enwe orilaanya na afọ 2026 ga-abụ mmalite usoro idozi Naịjirịa, mee ka mpaghara Naịjirịa niile dị n'otu, ma nweta ọnọdụ ọchịchị onye ọbụla ga-eso kwado".

    "Anyị ahụla ọtụtụ ndị ritere erere si n'ọchịchị onye kwuo uche ya bụzị ndị na-eme usoro ọchịchị site n'ụzọ dị icheiche. Nke a bụ ihe anyị agaghị ekwe ọzọ, anyị agaghị anabata ya".

    Ndị ndịda Ówụwa Anyanwụ bịara n'emume ahụ Peter Obi jiri banye na ADC gunyere ndị Emeka Ihedioha; Sịnetọ Ben Obi, Victor Umeh, Tony Nwoye, Gilbert Nnaji, Onyema Ugochukwu; Enyinnya Abaribe; Sịnetọ Sam Egwu na ndị ọzọ.

  4. Sydney ejirila egbe ihuigwe mara mma nabatala afọ 2026

    Foto na-egosi etu e si anabata afọ 2026 na Sydney bụ isi obodo mba Ustralia

    Ebe foto si, EPA

    Naanị nkeji ole ma ole ka mba Australia ji banye n'afọ 2026 ugbua.

    N'isi obodo ha bụ Sydney ka e jiri egbe ihuigwe mara mma chọọ mma.

    Ọtụtụ ndị nọ na mpaghara dịka Vanuatu, Solomon Islands na Bougainville sokwa na ndị banyere n'afọ 2026 ugbua.

    Foto na-egosi etu e si anabata afọ 2026 na Sydney bụ isi obodo mba Ustralia

    Ebe foto si, EPA

    Foto na-egosi etu e si anabata afọ 2026 na Sydney bụ isi obodo mba Ustralia

    Ebe foto si, Getty Images

  5. Mba New Zealand abanyela afọ 2026

    Etu ndị mmadụ si enwe anụrị na-anabata afọ 2026 na mba New Zealand

    Ebe foto si, Andy Corson

    Dịka mba dị icheiche n'ụwa na-akwado ịbanye n'afọ ọhụrụ, mba New Zealand eburula ọtụtụ ụzọ nabata afọ 2026.

    Andy Corson so na ndị so na-enwe aṅụrị maka afọ 2026 na mba New Zealand.

    Ọ nọ n'iro na-ekiri etu ndị mmadụ si enwe anụrị ma jiri 'egbe ọkụ a na-agba n'ihu igwe na-enwe na-anabata afọ 2026.

    Andy nọ n'ụlọ ebe o bi na maghara ugwu mba ahụ.

    Ọ sị na "afọ 2025 siri obele ike dịrị ọtụtụ ndị mmadụ, mana ọtụtụ ndị mmadụ n'ụwa niile na-atụanya na afọ 2026 ga-adị mma karịa afọ garaaga.

  6. Onyeisi ndịagha Guinea Mamady Doumbouya emeriela ntuliaka ọkwa onyeisiala

    Doumbouya welili aka ya elu n'ekele ndị mmadụ dịka oyi uwe ọcha ma kpuru enyo anya nakwa okpu uwe ọcha

    Ebe foto si, Reuters

    Nkọwa foto, Doumbouya bụ onyeisi ndịagha nọ n’ọchịchị na Guinea na-achọ ime ka ọchịchị ya bụrụ nke iwu kwadoro dịka o weghaara ọchịchị n'ike afọ anọ gara aga.

    Ọchiagha Mamady Doumbouya emeriela ntuliaka ọkwa onyeisiala mba Guinea e mere n'ụbọchị Sọnde 28 Disemba, 2025.

    Mpụtara ntuliaka ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka wepụtara, gosiri na Doumbouya ji vootu dị pasentị 86.72 merie ntuliaka ahụ.

    Doumbouya bụ onyeisi ndịagha nọ n’ọchịchị na Guinea, na-achọ ime ka ọchịchị ya bụrụ nke iwu kwadoro dịka ọ napụrụ ọchịchị n'ike afọ anọ gara aga.

    Ọtụtụ ndị mmadụ akatọọla ntuliaka ahụ maka na egbochiri ọtụtụ ndị ha na Doumbouya kwesịrị ịzọ ọkwa onyeisiala.

  7. Ọtụtụ ọma Igbọ ndị ọma anyị ji eme ọnụ

    Anyị ji oni ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Wenezde 31 Disemba, 2025.

    Anyị ji akụkọ gbara ọkpụrụpụ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa bịa taa.

    Sonyere anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche maka akụkọ foto na vidio ndị ọzọ anyị na-ewetara gị.

    Daalụ.

  8. Ndị ntaakụkọ asaa anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ

    People stand at the scene of an accident after a truck kills six and destroys several vehicles in Karu, Abuja

    Ebe foto si, Getty Images

    Ihe mberede okporoụzọ ọjọọ mere na Gwombe Steeti eriela isi ndị ntaakụkọ asaa.

    Ihe ọdachi ahụ zutere ụgbọala bọọsụ nke otu jikọtara ndị ntaakụkọ Naịjirịa (NUJ), oge ha si agbamaakwụkwọ onye otu ha n’okpuru ọchịchị Kaltungo nke steeti ahụ.

    Ozi anyị nwetara kwuru na afọ ụgbọala ha gbawara na mpaghara Kumo dị n’okpuru ọchịchị Akko, nke mere ka ụgbọala bọọsụ ahụ tinye isi n’ọhịa.

    Onyeisi ụlọọrụ Federal Road Safety Corps (FRSC) na Gwombe Steeti bụ Samson Kaura na Nnukwu Onyeisi mgbasaozi n’obi ọchịchị Gwombe Steeti bụ Ismaila Misilli kọwara na ndị ntaakụkọ asaa nwụrụ n’ihe mberede ahụ ebe anọ ndị nke ọzọ nwetara ogogo mmerụahụ dị iche iche.

    E bugaala ozu mmadụ ndị nwụrụ anwụ n’ọbaozu dị na Gwombe, ebe ndị nke merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ ugbua.

    Ndị ntaakụkọ nwụrụ n’ihe ọdachi ahụ gụnyere Onyeisi na-ahụ maka akụkọ nakwa Nnukwu onye enyemaka gọvanọ n’ụlọọrụ nwunye gọvanọ bụ Zara Umar, Onyeisi na-ahụ maka ọrụ n’ụlọmgbasaozi NTA bụ Haruna Kwami, Onye nhazi onyonyoo n’ụlọmgbasaozi NTA bụ Isa Lawan na Onyeisi na-ahụ maka akụkọ lara ezumike nka bụ Musa Tabra.

    Ndị ọzọ bụ Nnukwu ọkwọụgbọala bụ Aminu Adamu, onye ọrụ ụlọmgbasaozi StarTimes bụ Adams Danladi nakwa Onye ọrụ na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ State Universal Basic Education Board (SUBEB) na Gwombe Steeti bụ Judith Kutus.

    Aka na-achị Gwombe Steeti bụ Inuwa Yahaya ezigarala ezinaụlọ ndị ha nwụrụ ozi nkasiobi ma gọọrọ ndị nke nọ n’ụlọọgwụ ọfọ ka ha gbakee ngwangwa.

  9. Yukren agọnarịla na ha atụghị ogbunigwe n’ụlọ Onyeisiala Putin

    Onyeisila mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Volodymyr Zelensky

    Onyeisila mba Yukren bụ Volodymyr Zelensky agọnarịla ebubo kwuru na ha tụrụ ogbunigwe n’ụlọ Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin.

    Yukren na-ebo ebubo na Rọshịa na-achọ ụzọ ha ga-esi kposaa atụmatụ mkparịtaụka udo n'agha ahụ dị n'etiti ha abụọ.

    Mana Mịnịsta mba Rọshịa na-ahụ maka mba ofesi bụ Sergei Lavrov na-ekwu na mba Yukren ji droonu ruru 91 tụọ ogbunigwe n’ụlọ Onyeisiala Putin dị na mpaghara Novgorod.

    Onyeisiala Zelensky kọwara nke a dịka asị ọcha mba Rọshịa na-atụ mgbe ọbụla ma kwuo na Rọshịa na-achọ ihe ha ga-agbado ụkwụ ma na-atụ ogbunigwe na Yukren.

    Rọshịa kwuru na ha ga-atule etu ha etu ha si kwụrụ n'atụmatụ mkparịtaụka udo ha na mba Yukren. Mana edoghị anya ebe Onyeisiala Putin nọ mgbe a tụrụ ogbunigwe ahụ n'ụlọ ya.

  10. Mmadụ abụọ anwụọla n’ihe mberede okporoụzọ mere n'Abịa Steeti

    Ndị mmadụ ji ụgbọala ha na-agafee dịka ụgbọala gwaongworo so n'ihe mberede okoproụzọ nọ n'etiti ụzọ

    Ebe foto si, bbc

    Nkọwa foto, Ndị mmadụ ji ụgbọala ha na-agafee dịka ụgbọala gwaongworo so n'ihe mberede okoproụzọ nọ n'etiti ụzọ

    Mmadụ abụọ anwụọla dịka ihe mberede okporoụzọ mere n’etiti onye ọkwọ ọgbaatumtum ‘keke’ na ụgbọala gwongworo n’okporoụzọ Ubakala Ụmụahịa dị n'Abịa Steeti.

    Ihe mberede a mere n’ụbọchị Sọnde n'akụkụ ụlọụka Deeper Life nke nọ tupu e ruo n'ụlọmgbasaozi Nigerian Television Authority.

    Dịka ndị akebe hụrụ oge ihe mberede a mere si kwuo, mmadụ anọ nọ n’ime keke mgbe gwongworo ahụ si na-azụ kụọ ha nke mere ọtụtụ ha ji merụọ ahụ.

    Onye ọkwọ keke ahụ na otu nwaanyị o bu nwụrụ ozugbo dịka a kpọọrọ mmadụ abụọ ndị nke ọzọ gụnyere otu nwoke na otu nwaanyị gawa ụlọọgwụ FMC nọ n'Ụmụahịa.

    Ụgbọala 'Keke' kpọkashịrị dịka ụgbọala gwongworo kụrụ ya na okporoụzọ Umuahia
    Nkọwa foto, Ụgbọala 'Keke' kpọkashịrị dịka ụgbọala gwongworo kụrụ ya na okporoụzọ Umuahia
  11. A na-atụ anya egbe eluigwe na mmiri ozuzo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ - NiMet

    A na-atụ anya egbe eluigwe na mmiri ozuzo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ - NiMet

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahụ maka ihu igwe na Naịjirịa bụ Nigerian Meteorological Agency (NiMet) ekwuola na nchọcha ha mere gosiri na a ga-enwe nnukwu anwụ na urukpuru n’ụfọdụ akụkụ Naịjirịa.

    Dịka NiMet siri kwuo, ọnọdụ a ga-amalite n’ụbọchị Mọnde 29 Disemba, 2025 ruo n’ụbọchị Wenezde 31 Disemba, 2025.

    Ụlọọrụ ahụ kwuru na anwụ ga-awa n’oge n’ụtụtụ dịka a ga-enwekwa ụfọdụ urukpuru na mpaghara Etiti Naịjirịa, ebe ọnọdụ ahụ ga-adịgide ruo n’ehihie nakwa na mgbede.

    NiMet kwuru na a ga-enwe anwụ, urukpuru nakwa egbe eluigwe, tinyere obere mmiri ozuzo n’ụfọdụ akụkụ Legọs, Krọs Riva, Akwa Ibom, mpaghara ndịda Ondo nakwa mpaghara ndịda Edo Steeti n’oge ụtụtụ.

    "A na-atụkwa anya na a ga-ahụta egbe eluigwe na obere mmiri ozuzo n’ụfọdụ akụkụ Riva Steeti, Bayelsa, Akwa Ibom, Krọs Riva, Edo, Delta, Ondo, Lagọs, Ọyọ, Ọshụn, Ogun, Imo, Abịa, na Anambra Steeti n’oge ehihie," ka NiMet kwuru.

  12. Onyeisiala Trump chọrọ ịkwụsị ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa – Riley Moore

    Onyeomeiwu mba Amerịka Riley Moore kwuru na Naịjirịa nyere mba Amerịka nkwado tupu ha atụọ ogbunigwe ahụ n'ụbọchị Ekeresimesi

    Ebe foto si, RepRileyMoore/X

    Onye omeiwu mba Amerịka bụ Riley Moore ekwuola na ihe mere Onyeisiala Donald Trump ji tụọ ogbunigwe na mpaghara ugwu Naịjirịa bụ iji gbochie ogbugbu ndị ụka Kraịst na Naịjirịa.

    N’okwu Moore “Ọ dị mkpa ime ka onye ọbụla mara na anyị tụrụ ogbunigwe ahụ site na nkwado gọọmenti Naịjirịa. Gọọmenti Naịjirịa nyere anyị nkwado iji hụ na enwere ezi nchekwa na Naịjirịa ma kwụsị ogbugbu ndị Ụka Kraịst.

    Okwu ya na-abịa dịka gọọmenti Amerịka tụrụ ogbunigwe n’ọhịa Bauni dị n’okpuru ọchịchị Tangaza dị na Sokoto steeti ebe e kwuru na ndị na-eyi ọha egwu nwere ọnọdụ n’ụbọchị Ekeresimesi.

    Moore gara n’ihu kwuo na e gburu ọtụtụ ndị Ụka Kraịst n’ụbọchị Ekeresimesi n’afọ abụọ gara aga. Ọ bụ n’ihi nke a ka Onyeisiala Trump jiri mee mwakp ahụ iji kpochapụ ndị oyi ọha egwu ahụ.

  13. Trump kwuru na enwere ọganihu na mkparịtaụka udo na Yukren mana 'obere nsogbu ka dị na ya’

    Trump kwuru na enwere ọganihu na mkparịtaụka udo na Yukren mana 'obere nsogbu ka dị na ya’

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Trump mba Amerịka na Onyeisiala Volodymyr Zelensky mba Yukren kwuru na mkpatrịtaụka udo ha nwere banyere agha dị na Yukren mịtara ezi mkpụrụ mana Trump kwuru na enwere ihe ụfọdụ na-echere ha aka mgba.

    N’agbanyeghị na Trump na Zelensky kwuru na mkparịtaụka ahụ mịtara mkpụrụ, Trump kwuru na out ihe na-eche aka mgba nye atụmatụ udo ahụ bụ okwu banyere okeala. Cheta na Rọshịa kwuru n amba Yukren ga-enye ha ọtụtụ ala.

    Onyeisiala Zelensky kwuru na ndị nnọchiteanya mba Yukren ga-ezute n’izuụka na-abịa iji tinye ọnụ n’okwu ahụ ma hụ na a kwụsịrị agha ahụ Rọshịa na-ebuso Yukren nke malitere kemgbe afọ anọ.

  14. Ọtụtụ Igbọ ndị ọma anyị ji eme ọnụ

    Anyị ji oni ụtọ anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Mọnde 29 Disemba, 2025.

    Anyị ji akụkọ gbara ọkpụrụpụ si Naịjirịa, Afrịka nakwa mbaụwa bịa taa.

    Sonyere anyị n'akara soshal midịa anyị dị iche iche maka akụkọ foto na vidio ndị ọzọ anyị na-ewetara gị.

    Daalụ.

  15. Onyeisiala Bola Tinubu esila Legọs steeti gaa Yurop

    Bola Ahmed Tinubu bụ Onyeisiala Naịjirịa

    Ebe foto si, Bayo Onanuga / X

    Nkọwa foto, Bola Ahmed Tinubu.

    Bola Ahmed Tinubu bụ Onyeisiala Naịjirịa esila na Legọs steeti gaa Yurop.

    Gọọmenti Naịjirịa mere ka a mata nke a site n’ozi Onye ndụmọdụ Onyeisiala bụ Bayo Onanuga wepụtara n’akara X soshal midịa ya.

    Mana n’ozi ahụ, Bayo Onanuga ekwughị mba dị na Yurop Onyeisiala Tinubu na-aga nakwa onye ọ na-aga izute maọbụ ihe ọ na-aga ime n’ebe ahụ.

    Kama, ọ sị na “Onyeisiala Tinubu esila Legọs gaa Yurop n’ụbọchị Sonde, Desemba 28, 2025 dịka ezumike ya na-aga n’ihu”.

    Ọ gara n’ihu kwuo na “nke a na-eme dịka ọ ga-aga Abu Dhabi, dị na United Arab Emirates ebe a kpọrọ ya oku sị ya bịa”.

    “Eze obodo Sheikh Mohamed Bin Zayed Al Nahyan, Onyeisiala mba United Arab Emirates zitere ozi sị Onyeisiala Tinubu bịa sonyere ha n’ọgbakọ ha kpọrọ “Abu Dhabi Sustainability Week (ADSW 2026) Summit” a ga-eme na mbido Jenụwarị 2026.”

    Bayo Onanuga gara n’ihu kwuo na “Onyeisiala Tinubu ga-alọghachị Naịjirịa ma e mechaa ọgbakọ ahụ”.

    Ozi ahụ Bayo Onanuga wepụtara maka njem Onyeisiala si Legọs gaa Yurop

    Ebe foto si, Bayo Onanuga / X

  16. Brigitte Bardot na-eme ejije na mba Fransị anwụọla n'afọ 91

    Brigitte Bardot bụ nwaanyị a maama na-eme ejije na mba Fransị nwụrụ anwụ.

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Brigitte Bardot

    Nwaanyị a maama na-eme ejije na mba Fransị aha ya bụ Brigitte Bardot anwụọla mgbe ọ dị afọ iri itoolu na otu (91).

    Brigitte so na ụmụnwaanyị nwuruewu mgbe ọ dị n’agbọhọbịa maka ejije nakwa ihe gbasara ịgụ egwu ọ na-eme.

    Mana Brigitte mechara hapụ ejije nakwa ihe gbasara ịgụ egwu bido na-ahụ maka ọdịmma na nchekwa ụmụ anụ ọhịa dị icheiche.

    Ụlọọrụ o guzobere a nakpọ ‘Brigitte Bardot Foundatio’ bụ ndị wepụtara ozi maka ọnwụ ya mana ha ekwughị ebe, nakwa oge ọ nwụrụ.

  17. Gọọmenti Etiti azụpụtala ndị nchekwa 'forest guard' puku asaa maka nchekwa ime ọhịa

    Ndị ọrụ nchekwa 'forest guard' mgbe a na-edu ha n'iyi ọrụ na Naịjirịa

    Ebe foto si, Min of Information/Facebook

    Gọọmenti etiti site n’ụlọọrụ onye ndụmọdụ nchekwa ekwuola na ha azụpụtala ndị ọrụ nchekwa ‘forest guard’ dị puku asaa site na steeti asaa bụ ebe nchekwa kachasị dị njọ na Naịjirịa.

    Nke a site n’ozi onye ndụmọdụ pụrụiche nke Minista na-ahụ maka mgbasaozi bụ Rabiu Ibrahim wepụtara n’ụbọchị Satọde 27 Disemba 2025.

    O kwuru na ndị a natara ọzụzụ kara aka n’ime ọnwa atọ site na ntuziaka Onyeisiala Bola Tinubu nke a kpọrọ ‘Forest Guard Initiative’ nke o hiwere n’ọnwa Mee afọ 2025.

    O kwuru na atụmatụ a gụnyere ndị ọrụ nchekwa Gọọmenti etiti na gọọmenti steeti nke ọrụ ha bụ iwere ọnọdụ n’ime ọhịa Naịjirịa ma kpochapụ ndị omekome jiri n’ime ọhịa ndị a.

    E duru ndị a n’iyi ọrụ n’emume e mere na steeti dị iche iche gụnyere Borno, Sokoto, Yobe, Adamawa, Niger, Kwara, na Kebbi Steeti n’ụbọchị 27 Disemba 2025.

    E hiwere atụmatụ a maka ibu agha megide ndị na-eyi ndụ egwu, ndị ekperima, ndị ntọrị ndị omekome ndị ọzọ ma wulite ọnọdụ nchekwa n’ime obodo Naịjirịa.

    Ibrahim kwuru na e nyere ndị a ọzụzụ dị iche iche gụnyere izọpụta ndị a tọọrọ, ipiogharị n’ime ọhịa, ngalaba ahụike, ụbụrụ ịsị nakwa ihe ndị ọzọ onye ọrụ nchekwa kwesịrị ịma.

    Cheta na Onyeisiala Tinubu nyere ngalaba nchekwa DSS iwu ka ha zụpụta ma ziga ndị nchekwa ‘forest guard’ n’ime ọhịa dị na Naịjirịa iji kpochapụ ndị omekome.

    O nyere iwu mgbe o tinyere ọnọdụ gbata gbata na ngalaba nchekwa na Naịjirịa site n’oke ntọrị ndị mmadụ n’ọnwa Nọvemba gụnyere ụmụakwụkwọ na Kebbi Steeti, ndị ụka na Kwara Steeti nakwa ụmụakwụkwọ na Niger steeti.

  18. Zelensky ekwuola na Rọshịa achọghị udo dịka ya na Onyeisiala ga-ezute n’ụbọchị Sọnde

    Foto oge Onyeisiala Donald Trump nabatara Onyeisiala Yukren Volodymyr Zelensky n'ọgbakọ ha nwere n'obi ọchịchị White House in Washington, DC, n'Ọktoba 17, 2025.

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Volodymyr Zelensky na-achị mba Yukren na Onyeisiala Trump mba Amerịka ga-ezute na Flọrịda n’ụbọchị Sọnde 28 Disemba, 2025 maka mkparịtaụka banyere ịkwụsị agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren nọgoro afọ anọ ugbua.

    Ihe ụfọdụ ha ga-akpa maka ya gụnyere atụmatụ udo ọhụrụ a mapụtala mana mba Rọshịa akwadoghị ya.

    Nzukọ a bụ nke a ga-eme n’ụlọ Onyeisiala Trump dị na Mar-a-Lago, na-abịa dịka mba Rọshịa wakporo Kyiv isiobodo Yukren na ngwụcha izuụka a nke Zelensky kọwara na o gosịrị na mba Rọshịa achọghị udo.

    Mwakpo ogbunigwe ahụ nwere ihe ruru awa iri gburu mmadụ abụọ ebe mmadụ 32 ndị ọzọ merụrụ ahụ.

  19. Ụtụtụ ọma ndị ọma

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 28 Disemba, 2025.

    Ọ bụ obi aṅụrị ka anyị ji asị gị nnọọ dịka anyị na-ewetara gị akụkọ si Naịjirịa, Afrịka nakwa ụwa niile.

    Sonyekwara anyị n'akara soshal midịa anyị maka akụkọ foto na vidio ndị ọzọ anyị ji bịa taa.

    Nnọọ.

  20. Izrel-Somaliland: Naijiria akwụnyerela Somalia -Gọomenti Naijiria

    Onyeisiala Bola Tinubu

    Ebe foto si, The Presidency

    Gọọmentị Naijiria ekwupụtala nkwado ha nye Gọọmentị mba Somalia.

    Nke a na-abịa dịka Izrel mara ọkwa na ha anabatala Somaliland, bụ obodo si Somalia kewapụta dịka mba kwụrụ onwe ya.

    N'ozi nke Ministrị na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ wepụtara n'ụbọchị Satode nke ọnụ na-ekwuru Ministrị ahụ bu Kimiebi Ebienfa binyere aka,Gọọmenti Etiti kwuru na "Naijiria nabatara Gọọmentị mba Somalia dịka ikike dị n'iwu na-anọchite ụmụamala Somalia."

    Ozi nke Ministrị na-ahụ maka mmekọrịta Naijiria na mba ndị ọzọ

    Ebe foto si, MInistry of Foreign Affairs