Michael Jackson Vs Beyonce: Onye bụ obu, onye bụ nza?

Beyonce na Michael Jackson

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Michael Jackson na Beyonce na-ewu na soshal midia dịka ndị mmadụ na-arụrịta ụka onye ka ibe.

Nke a na-eme dịka akụkọ Mark Lester bụ otu onye ya na Jackson bụbu enyi boro ebubo imetọ ụmụaka megide Jackson na ihe nkiri a kpọrọ, 'Neverland Landing.'

Michael Jackson bụ otiegwu mba Amerịka a ma ama mabụrụkwa onye na-ede ma na-agbakwa egwu ka okoso.

N'aka nke ọzọ, Beyoncé Giselle Knowles-Carter nke a ma dịka Beyonce bụ kwa onye Amerịka na-eti egwu, na-ede ma na-agbakwa agba , onye bidoro iwu na agbata afọ 1990.

@Ediong kwuru na o nweghị onye ga-adịka Michael Jackson ma n'ọnwu , ebeBeyonce rerela efere egwu ihe karịrị nde 17 ugbua intanet dị, ma Michael Jackson rere efere egwu 750.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@Tjames_Debayo kwuru na Beyonce bụ agbara mana onweghị ka o siri rute Michael Jackson.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@Royaltyuso dụrụ ọdụ ka mmadụ ghara iji Beyonce tụnyere Michael Jackson na agbanyeghị ihe niile o merela na ime nke a bụ iwetu ya ala.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Nzere Michael Jackson

Jackson, onye bidoro iti egwu na nwata n'otu egwu, "Jackson 5' ndị bụ a n'ụmụnne ya eritela nturugo gụnyere:

  • Guinness world records (asatọ n'afọ 2006 sọọsọ)
  • Grammy Awards
  • Grammy Legend Award
  • American Music Awards (dị iri abụọ na asatọ)
  • Songwriters Hall of Fame
  • Hollywood Walk of Fame n'afọ 1980
  • World Music Awards' Best-Selling Pop Male Artist of the Millennium,
  • Songwriters Hall of Fame

Nzere Beyonce

Beyonce, onye bidokwara iti egwu na nwata n'otu egwu, 'Destiny Child'ritere gụnyere:

  • American Music Awards
  • Grammy dị 23
  • International Artist of Excellence award nke ndị American Music Awards nyere ya n'afọ 2007
  • MTV Video Music Awards dị ugboro 25,
  • a Peabody Award for Entertainment
  • BET Awards

Akụkọ ndị ga-amasị gị: