Ihe anyị ma maka nwagbọghọ a sị bụ onye ESN ndịagha nwuchiri n'Igboeze South, Enugwu

Ebe foto si, Other
Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ka ndị nchekwa gụnyere ndịagha Naịjirịa, ndị Directorate of State Services (DSS) na ndị ọzọ nwuchiri otu nwata nwaanyị a sị bụ onye otu Eastern Security Network (ESN) n’Igboeze South dị n’Enugu Steetị.
N’ihe onyonyo a a na-amaghị kpọmkwem mgbe e wepụtara ya, nwata a ji ọnụ ya na-ekwepụta onye ọ bụ, otu ọ nọ na ya nakwa ihe ndị ha megasịrị.
Ndịagha, ndị DSS nakwa ndị uweojii ewepụtabeghi ozi ọbụla banyere ihe onyonyo ahụ.
Mana otu onye na-achọghị ka a kpọọ aha gwara BBC Igbo na ọ bụ otu n'ime ndịagha so nwuchie nwata a ziteere ya ihe onyonyo ahụ na-efegharị ugbua.
BBC Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndịagha bụ Onyema Nwachukwu nakwa nke ndị uweojii n’Enugwu bụ Daniel Ndukwe mana ha azabeghi rute ugbua.
N’otu aka a kpọkwara onyeisioche okpuruọchịchị Igboeze South bụ Vitus Okechi ịmata ma ọ nụla maka nwata a nwuchiri mana ọ zabeghi oku rute ugbua.

Ebe foto si, Other
Ihe Amaka kwuru n'ihe onyonyo ahụ

Ebe foto si, Other
Ndị ọrụ nchekwa jụrụ nwata a ajụjụ banyere etu ya na ndị otu ya si akpa nkata eme ihe ndị ha na-eme.
O kwuru na “Aha m bụ Amaka Onah, adị m afọ iri abụọ na abụọ, abụ m onye Igboeze South dị n’Enugwu Steeti.”
A jụrụ ya mgbe ọ banyere ESN, Amaka kwuru “abanyere m n’otu ESN n’ọnwa anọ gara aga.”
Ọ gakwara n’ihu kwuo na o gbuola ihe ruru mmadụ ise kamgbe ahụ.
“egbuola m mmadụ ise kamgbe m banyere n’otu ESN.”
Amaka kwuru na ọ bụ n’ogige ha dị n’obodo Unado nke Igboeze, Enugwu ka e gburu ọtụtụ ndị ahụ.
Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ ndị otu ya gburu Igwe na-achị obodo Unado ọ sị na aha ya bụ Baniko ma gbaa ụlọọrụ ya ebe a na-ere mmanụ ụgbọala ọkụ.
Mpaghara Igboeze North na South so n'ebe ọnọdụ nchekwa dị ọjọo n'Enugwu Steetị na nso nso a.
Nke a mere gọọmentị Enugwu Steeti ji nọrọ n'ụbọchị atọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023 gbaghara ọtụtụ ndị ntoroọbịa na-akpa ike n'Igboeze North na South dịka ha wụsara ngwa ọgụ ha.
Amaka sị na ndị otu ya nụrụ maka oku mgbaghara a gọọmentị kpọrọ mana ha jụrụ ịza ya.









