Amnesty: Gọvanọ Ugwuanyi agbagharala ndị n'ebute tigbuo zọgbuo n'Igboeze North

Ndị gọọmentị Enugwu Steeti gbahara

Ebe foto si, Ezike Satellite TV

Ụmụ ikorobịa ji tigbuo zọgbuo mere aka ọrụ n'Igboeze north enwetala mgbara nke bụ Amnesty site na aka na-achị Enugwu steeti bụ Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyi.

Ụmụnwoke ahụ ọnụ ọgụgụ ha dị iri anọ na otu zara oku nchegharị gọọmenti Enugwu kpọrọ iji kwụsị oke igbu mmadụ, izu ohi nakwa ntọrị mmadụ na-aga n'ihu ebe ahụ ọkachasị n'Enugwu Ezike.

Mmemme ngbaghara ndị omekome a bụ n’ụbọchị 31 nke ọnwa December afọ 2022 ka e mere ya.

Gọvanọ Ugwuanyị, aka na achị okpuru ọchịchị Igboeze North bụ Ejike Itodo, ndị eze obodo na ndị ọrụ nchekwa nọrọ n’ogige okpuru ochịchị ahụ n'Ogurute gbaa aka ebe na ndị omekome ahụ ekwela nkwa na ha agaghị ememina mmadụ ọzọ ma kwekwaa nkwa na ha agaghị na atọ mmadụ ma ọ bụ arụ ndị ọzọ.

Mmadụ iri anọ na otu ahụ chegharịrị wepụtara ngwọ ọgụ ha dịka Egbe, mma, anyaike na akụrụngwa ndị ọzọ ha ji akpa ike.

Mmadụ atọ na anọchite anya ndị a gbanwere bụ Somadina Omeje onye Umuogbuagu, eji "King George Bush" mara na Odinaka Odoh onye Olido kwuru na aha ndị ọzọ na agwa ọjọọ ha kpara mgbe gara aga na ewute ha n'ime obi wee kwee nkwa na ha ga ejikọ aka were hụ n’udo lọghachiri n'Igboeze north niile tumadụ Enugwu Ezike .

Gọọmenti Enugwu jikwa ohere ahụ bunye ndị uweojii Ignoeze north nke DPO Simon Akor na-elekọta ụgbọala hillux abụọ ka onye ndị ngalaba neighborhood watch ya na ha na arụkọ ọrụ.

Ọtụtụ ndị obodo zụkọrọ na Ogurute kwuru na ya bụ Amnesty ga eme ka igbu mmadụ na ntọrị kwụsị na be ha, ha rịọkwara ndị ka nọ n'ime ọhịa na enupu isi ka ha mara na ọ bụ aka mgbaghara ka gọọmenti Enugwu n'enye ha ugbua.