Anyị ka-na achọ nwaanyị onye otu anyị ndị ntọ tọorọ - Ndị Agha Naijirịa

Ndị agha Naijirịa

Ebe foto si, Nigerian Army Twitter

Ndị agha Naịjirịa ekwuola na akụkọ na-ekwu na ha azọpụtala otu onye otu ha bụ PP Johnson atọọrọ n'ụbọchị 26 nke ọnwa disemba a abụghị eziokwu.

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi Onyema Nwachukwu depụtara ka ha kwuru nke a.

Ha kwuru na ihe onyonyo na-efegharị bụ ihe onyonyo mgbe ha zọpụtara onye ọzọ na mbụ.

Atọọrọ Johnson dịka ọ si ọzụzụ ndị agha pụta ebe e nyere ya ọkwa Lietenant ma gaa ileta nnenne ya n'Aku-Okigwe mgbe atọọrọya.

Nke a na-eso ihe onyonyo nke gosiri ebe ndị tọọrọ ya na-ekwu na ịtọrọ nwata nwaanyị a so n'usoro ha ji achọta nwereonwe Biafra.

Akwụkwọ ozi a kwuru sị, " Ihe a na-egosi mpụ ndị Ipob/ESN na-eme ndị Igbo, ndị ha sị ha na-azọrọ ha nwereonwe".

Ha jikwa ohere a rịọ ndị mmadụ ka ha zitere ha ozi ọbụla nke ga-enyere aka ịzọpụta nwata nwaanyị a.

Ihe ọzọ anyị ma maka ntọ nwata nwaanyị a

Ọtụtụ na-ajụ ma ọ bụ eziokwu na a tọhapụla nwaada a sị bụ onye agha Naịjirịa a tọrọ n’Abia steeti?

Ihe onyonyo gbara na soshal midia n’ụbọchị Tọọzde ma na-efegharị ugbua, gosiri otu nwaada a sị bụ onye agha Naịjirịa ndị otu ojiegbe kpọrọ onwe ha ‘Unknown gunmen’ nwụchịrị, gbaa ọtọ ma na-emekpa ahụ.

Ihe onyonyo gosiri na nwaada ahụ nọzị na-eme ka onye ume gwụrụ dịka ọbara si n'ime ya na-arịpụta.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Na ya bụ ihe onyonyo ahụ, ndị otu a kọwara na ha ga-emekwa nwaafọ Igbo ọbụla ụdịrị ihe a e mere nwaada ma ha gaa n’ihu na-arụrụ Naịjirịa ọrụ ọkachasị site n’ịbanye otu ndị agha Naịjirịa.

Ha kwuru ugboro ugboro ha ga-egbufu ya bụ nwaada dịka ha kọwara na ha esila Abia steeti ebe a sị a tọọrọ ya bụ nwaada ma nọrọzịe n’ime ọhịa dị n’Enugu steeti.

Olu otu onye n’ime ndị ahụ kwuru:

“Nke a bụ ozi magburu onwe ya nye ndị be anyị ka nọ n’otu otu ndịagha Naijiria. Etu a ka unu ga-esi na-anwu otu otu.”

“Lee, ihe na na-eme n’Enugwu taa bụ ụbọchị 26 nke ọnwa Disemba 2022, onye agha ji ọkwa ‘A Lieutenant, nke nwere akara ọkwa kpakpando abụọ n’agha Naịjrịa “

Olu ndị na-ada ya bụ ihe onyonyo kọwara na ndị otu ojiegbe a kpọrọ onwe ha ‘Unknown gunmen’ na-achọ nnwereonwe Biafra.

Otu onye n’ime ha kwuru:

“Otu ‘Unknown gunmen’ amaghị ndị Ipob bụ. Ihe anyị na-achọ bụ Biafra. Ma ha achọrọ ya ma ha achọghị ya, anyị ga-enwetariri nnwereonwe.”

Ha gara n’ihu were olu mmanja gwa ya bụ nwaada agbara ọtọ n’onyonyo ahụ:

‘Sị ụmụ ụwa nakwa ndị agah ebe ahụ ‘ka ọ dịzie’, nke a bụ etu is ga-esi ala”

‘Nke a na-eme n’okporoụzọ Enugwu, anyị ga na-egbufusi ha n’otu, n’otu”.

Akụkọ kọwara na ya bụ nwaanyị onye agha Naịjirịa si ọzụzụ ndịagha lọta obodo ya n’obodo ya bụ Ihube nke Abịa steeti.

A na-akọwa na ya bụ nwaada mere njem gaa be nna ya maka emume ezimuike nke ekeresimesi mgbe ndị a bịara tọrọ ya na be nna ya.

Ozi ọzọ nakwa ọtụtụ foto pụtakwara n’ụbọchị Tọọzde nke kwuru na ndị agha Naịjirịa agbapụtala onye otu ha dịka ha nwụchịrị mmadụ abụọ n’ime ndị otu ahụ.

Kama ndị agha kwuru na nke a abụghị eziokwu.

 N'afọ a, a nụrụ akụkọ ugboro ugboro si akụkụ mpaghara Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ebe a tọrọ maọbụ gbuo ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa.

Ọtụtụ otu ndị ojiegbe apụla kemgbe afọ ole m ole na-akpa ike n'akụkụ mpaghara ahụ.

N'ihe onyonyo ndị na-apụta ọtụtụ oge ndị a na-akpọ onwe ha otu 'unknown gunmen', ahụla ugboro ugboro ka na-ekwu okwu megide ịdịnaotu Naịjịrịa ma na-ekwu okwu megide Naịjrịa, na-awakpo ụlọọrụ gọọmentị ma na-emegide ndị ọrụ gọọmentị Naịjriịa ọkachasị ndị ọrụ nchekwa.

Cheta na n'ọnwa Eprel nke afọ a na ndị otu ojigbe gburu otu nwaanyị onye agha Naịjirịa na ọdịn'obi ya nke aha ya bụ Gloria Matthew.

E gburu ma bepu Linus Audu bụ onye agha lara ezumike nka na nwaanyị ya bụkwa onye agha (Private) bụ Gloria Matthew isi, dịka ha na-aga ịgba nkwụ ha n'Imo steeti, n'ụbọchị Satọde 30 Eprel 2022.

Onyema Nwachukwu kwuru mgbe ahụ na nke a mere mgbe ha na-aga n'obodo Gloria bụ Nkwere dị n'Imo Steetị ịga kwụọ ụgwọ isi ya dịka omenala Igbo siri dị.N'ọnụ okwu ya, "Anyị natara ozi gbasara etu ndị Ipob na ndị ọgụ ga bụ Eastern Security Network si gbuo ndịagha anyị abụọ ma hapụ ha n'ime ọbara ha mgbe ha na-eme njem ị ga gbaa nkwụ ha."

Ọ sị na ndị Ipob/ESN eleghi anya na Gloria bụ nwanne ha nwaanyị mana ha gara n'ihu gbuo ya na di ya.Ọ sị na arụ a ndị Ipob na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ gosiri ihe ọjọọ niile ha na-eme megide ndị mmadụ ha sị na ha chọrọ ichekwa nakwa ndị ọzọ na-eme njem aga na mpaghara ahụ.

Ndị agha Naịjirịa

Ebe foto si, AUDU M LINUS NA GLORIA MATTHEW

Ọnọdụ nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa

Ọ bụghị akụkọ ọhụrụ na ọnọdụ enweghi ezi nchekwa bụ okwu akpụ n'ọnụ n'akụkụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ugbua. Ọnọdụ a malitere na-akawanye njọ kemgbe ebe afọ 2021. Ọtụtụ ihe dị egwu malitere ime na mpaghara ahụ nke a gụnyere mwakpo ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa, ogbugbu ndị uweojii na ndị agha, ntọrọ mmadụ na ihe ndị ọzọ.

Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ otu 'Indigenous People of Biafra' nakwa ndị ọrụ nchekwa ha bụ Eastern Security Network (ESN) nke bụ ndị na-alụ ọgụ maka nnwereonwe mpaghara ahụ, na-eme mwakpo ndị a nakwa ntọrọ ndị a.

Mana Ipob ekwuola ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.

Onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ka nọ na mkpọrọ n'ụlọọrụ 'Department of State Services', nke bụ ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa.

Gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ya na Kenya na-afọ 2021 ma kpọlata ya Naịjirịa.

E boro Kanu ebubo na ọ bụ onye na-eyi ndụ egwu nakwa onye na-achọ ịkwatu ọchịchịonye kwuo uche ya na Naịjirịa.

Mana n'ọdị nso a ka ụlọikpe mkpegharị kụchapụrụ ebubo ndị ahụ ma kwuo na e kwesịrị ịtọhapụ Mazi Kanu ka ọ laa.

Ndị gọvanọ steeti ndị nọ ebe ekwuola ugboro ugboro, ma gwa ọha na ha dị njikere n'ọrọ ibuso ndị na-eme mkwapo ndị a agha.

Ndị ọrụ nchekwa wụchiri akụkụ steeti dị na mpaghara adị iche iche dịka a na-anwụchi ụfọdụ ndị ojiegbe a na-akpa ike mana ọ dị ka ya bụ ọnọdụ enweghị nchekwa ka na aga n'ihu.