'Unknown gunmen' gburu Gloria Matthew, Linus Audu, ndị ọzọ n'ọhịa Orlu - Nchọpụta BBC Disinformation Unit

Ebe foto si, Family
Ngalaba nnyocha akụkọ ụgha BBC bụ 'BBC Disinformation Unit' ekwuola kpọmkwem na e gburu onyeagha Private Gloria Matthew, na onye na-achọ ilụ ya bụ onye agha lara ezumike nka, Linus Musa Audu (Warrant Office retired) na ndị ezinaụlọ ya abụọ na mpaghara Orlu, Imo steeti.
Otu onye ezinaụlọ nwaanyị a na ọdịnaobi ya gwara BBC na mkparịtaụka na ọdachi ahụ mere dịka ndị ntorobia anọ wakporo ha na nso Banana Junction dị n'Orlu,Imo steeti.
"O mere n'ebe Elekere Atọ nke ehihie. Ha si Legọs na-aga Nkwerre."

Ebe foto si, Family Source
Onye ahụ gwara BBC Disinformation Unit na ha na ndị ezinaụlọ ha na-aga ịgbankwu Gloria na Audu bụ nke a gaara eme na Mọnde, abalị abụọ nke Ọnwa Mee, 2022, n'Okpuru Ọchịchị Nkwerre, Imo Seeti.
"Linus Audu bụ onye 'Southern' Kaduna mana o bi na Markurdi. Gloria bi na Sokoto."
"Ha si Kaduna rute Legọs n'abalị 26 nke ọnwa Eprelụ ịkpọrọ nne Gloria ka ha na ya gawa ịgbankwụ ahụ."
Onye ahụ kwuru na o doghị ya anya ma ọ bụ n'abalị 30 nke Ọnwa Eprelụ ka e gburu Gloria Matthew na ọdịnaobi ya, mana o kwuru na ha hụrụ foto ozu Gloria n'akara Whatsapp nke ya bụ Gloria n'abalị mbụ nke ọnwa Mee.
Nke a bụ ebe ndị zara ekwentị Gloria ziri ha ka ha gaa chọọ onye nwe ekwentị ahụ dịka ha kpọrọ ekwentị ya ugboro ugboro.
"E gburu ụmụnne Linus n'otu ụbọchị ahụ. Onyeisi otu ndị ahụ bu egbe nyere ha iwu ka e gbuo ha na ha bụ ndị Awụsa; ndị iro ha."
"E gburu ha n'ihu nne Gloria nakwa nwa Gloria dị afọ iri."
Ọnụ na-ekwuru ndị agha bụ Onyema Nwachukwu kwuburu na ozi mgbasaozi o wepụtara n'akara Facebook ndịagha Naijiria, na e gburu ndịagha a.

Ndịagha Naijiria na Onyeisiala Muhammadu Buhari boro otu 'Indigenous People of Biafra (Ipob) na alaka ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network (ESN)' ebubo igbu nwoke na nwaanyị ahụ.
Ipob gọrọ na aka ha adịghị ya.
Ka ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ otu izuụka ihe onyonyo ahụ gbara n'ịntanetị, akụkọ malitere fegharịwa na ogbugbu Gloria na Linus bụ ihe a rụrụ arụ.
Ndị na-akọ ya bụ akụkọ na ndị na-akwado Ipob na soshal midia bụ ndị kachasị na-efesa akụkọ na ya bụ ihe bụ ihe arụrụ arụ, na ọ bụ na kamerun ka ya bụ ihe mere.
Mana e doro anya wee nyochaa ya bụ ihe onyonyo nke gosiri na olu dị na ya bụ vidio abụghị ihe e tinyere etinye dịka ndị na-efesa akụkọ ụgha ahụ na-ekwu na ọ bụ arụrụ arụ.
Ị ga-ahụ gbowam dịka Gloria lara mmụọ na-aza otu olu nwoke dịka ọ bụ ya bụ onye ndu otu ndị ojiegbe ahụ.
Ọzọ, i lee gburugburu ihe onyonyo ahụ, ị ga-ahụkwa na arụgharịrị ya bụ onyonyo arụgharị.
Nchịkọta olu nakwa onyonyo ahụ na-aga n'anya ya n'anya ya.
Onye kpọrọ onwe ya Chidi Cali kere akụkọ na-ekwu na ihe onyonyo ahụ bụ arụrụ arụ mbụ na Facebook na Mee 7, 2022.
N'ime awa 24 o tinyere akụkọ ahụ, e kesara akụkọ ahụ ugboro 1000, ebe okwu asara n'akụkọ ahụ dị 1700.

Ebe foto si, Chidi Cali/Facebook
Ndị na-akwado Ipob na Facebook na Twitter na-ekerịtakwa ozi akpọmoku agbamakwụkwọ di na nwaanyị ahụ.
Ndị nọ na soshal midia kwukwara na ọ bụghị eziokwu na di na nwunye ahụ na-aga Imo steeti dịka akwụkwọ agbamakwụkwọ ha kwuru na ọ bụ ụbọchị ahụ ha na-eme njem ahụ ka akwụkwọ agbamakụkwọ ha kwuru na a na-eme agbamakwụkwọ ha na Makọdị, isiobodo Benue, Naijiria.
Mana otu onye ezinaụlọ ha kwuru na akwụkwọ akpọmoku agbamakwụkwọ nke kwuru na agbamakwụkwọ ha bụ na Makọdị, isiobodo Benue, Naijiria bụ ezigbo ya.
O kwuru na a kagburu agbamakwụkwọ ahụ a gaara eme n'abalị 30 nke Ọnwa Eprelụ bụ ụbọchị nwoke ahụ na nwaanyị ya zutere ọnwụ ha dịka ha na-aga Imo n'ihi na Ndịagha Naijiria ekweghị enye ha ikike ime agbamaakụkwọ n'oge ha kwesịrị.

Ebe foto si, Iopb Rapture Media/Facebook
"Ọ bụladị ịgbankwụ akanyeghị ya oge e kwesịrị n'ihi na a na-eche oge a ga-ehiwe ya dịka omenala Igbo siri dị, a na-eche itinye ya n'ụbọchị ahịa e ji eme ịgbankwụ n'obodo ha."
Gloria Matthew banyere ọrụ ndịagha n'afọ 2019, onye na-achọ ilụ ya bụ Linus Audu lara ezumike nka na nsonso a ka ọ rụchara dịka 'Warrant Officer', dịka ndị ezinaụlọ ha siri kọwaa.
Ogbugbu ndị a so na ndị e gburu na nsonso a n'Ọwụwa Anyanwụ Naijiria bụ ebe ndị bu egbe na-egbugsịsị ndị ọrụ nchekwa na ndị nkịtị.
E gbuola ihe karịrị ndị nchekwa iri anọ nakwa ndị nkịtị kemgbe ọnwa Jenụwarị rue Eprelụ afọ 2022.













