Unknown Gunmen Video: Ihe Ipob sara unknown gunmen si na ha na-achọ isi Emma Powerful

Getty Images/ Screengrab

Ebe foto si, Getty Images/ Screengrab

Ọnụ na-ekwuru otu Idigenous People of Biafra bụ Emma Powerful na ndị unknown gunmen ekwuola na ndị 'unknown gunmen' na-anya isi na ha na-achọ isi ya , chere ha maka na ha na-abịa.

Ọ gwara BBC Igbo, "onye ọbụla nwereike ikwu ihe sọrọ ya mana ọ gbasaghị anyị makana anyị ma ihe anyị na-eme".

"Oteela aka m bụ odee akwụkwọ Ipob kamgbe afọ iri, ndị ekperima si ha na-achọ isi m chere anyị, anyị na-abịa, ọ kwa ha si ha bụ unknown gunmen, anyị ga-amata ha n'ọgbọ a".

"Ihe anyị na-eme anyị anaghị eme ka ọha mara", bụ ihe Emma Powerful kwuru.

Ihe ndị ọzọ Emma Powerful zara gụnyere:

  • Powerful kwuru na etu a ndị unknown gunmen si kwuo na onweghị onye na-achị ha gosiri na ha na-ezo ndị isi ha ezo
  • O kwuru na Ipob ka ga-ekwu uche ha gbasara ntuliaka 2023 na-abịanụ mana ọ bụbeghị ugbua
  • Ndị unknown gunmen na-ekwu okwu ntụliaka ugbua ka ha wee dọta uche ndị mmadụ n'ebe ha nọ

Ihe ndị unknown gunmen kwuru n'onyonyo na-efegharịnụ

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-egosi ndị kpuchiri ihu ha ma kpọ onwe ha "unknown gunmen"

N'ime onyonyo ahụ, ndị a kpuchiri ihu ha bucha egbe ma na-ekwu na agaghị enwe ntuliaka n'ala Igbo n'afọ 2023 belụsọ atọghapụrụ onyeisi ha Nnamdi Kalu.

Ha kwukwara na onye ọbụla ha hụrụ na-eme ihe ọbụla gbasara ntuliaka na-abia n'afọ 2023, na ha ga-egbu onye ahụ.

Ha gara n'ihu kwuo na ha na-achọ ndị dịka Emma Powerful nakwa Chinasa Nworu ndị ha na-ebo ebubo nrụrụaka na mpụ.

Ndị unknown gunmen ahụ kwukwara na atụmaatụ onye nọrọ n'ụlọ ka na-aga n'ihu ruo mgbe gọọmenti etiti ga-atọghapụ Nnamdi Kanu bụ onyeisi Ipob

Aha onyonyo, 'Asari Dokubo enweghị ike imegheri anyị anya n'inweta Biafra'- Ipob

Ihe Inec kwuru maka mmaja ndị unknown gunmen

Festus Okoye bụ National commissioner nakwa onye na-ahụ maka information and voter education nke National Electoral Independent Commision ekwuola na ụlọọrụ ha ahụla ihe onyonyo na-efegharịnụ ebe a na-amaja atụmatụ nkwado ntụliaka na-abia n'afọ 2023.

N'ọnụ ya. "anyị enweghị ikike ime nyocha, inwụchi maọbụ ima onye ọbụla ikpe maka enweghị ezi nchekwa."

O kwuru na ọ bụ ndị uweojii nakwa ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-eme nyocha ma gosi Inec ihe ha chọpụtara maka ndị na-achọ imebesi nkwado ntụliaka nke 2023 na-abịanụ.

Okoye kwuru na Inec na ndị uweojii, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu ga-enwe mkparịtaụka ebe ha ga-elebanya n'okwu gbasara enweghị ezi nchekwa n'akụkụ Naịjirịa dị iche iche, tụmadị ala Igbo ma nweta ogbugbo ga-eme ka ndị mmadụ nwe ezi nchekwa ga-eme ka ha pụta bia tụọ vootu n'ụbọchị ntuliaka.

O kwuru na mee enu mee ala, iwu Naịjirịa kwadoro na a ga-emeriri ntuliaka oge eyiri ya, ya bụ na mmaja niile a enweghị ike ime ka akagbuo maọbụ yigharịa ntuliaka.

Gịnị mere gọọmenti Naịjiria ji nwụchie Nnamdi Kanu?

Gọọmenti Naịjirịa kwuru na ha nwuchigharịrị Nnamdi Kanu n'ọnwa June , 2021 na mba Kenya.

Ha mechara kpụpụ ya ụlọikpe dị n'Abuja ebe ọ pụtagoro ihe karịrị ugboro atọ ị zara ọnụ maka ebubo ndị a na-ebo ya.

Kamgbe ahụ Kanu nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị Department for State Service(DSS).

A na-ebo ya ebubo ikwu okwu ga-eme ka ọha mebisie ọtụtụ ihe n'obodo, ịgwa ọha ka ha gbuo ndị ọrụ nchekwa ma yie ndụ egwu wdgz.

N'ụlọikpe ikpeazụ Nnamdi Kanu pụtara, ọkaikpe Binta Nyako na-ekpe ikpe dị n'etiti Kanu na gọọmenti Naịjịrịa kụchapụrụ ụfọdụ a na-ebo Kanu nke mere ka ọnụ ọgụ ebubo ndị ahụ si na iri na ise datuo asaa.

Cheta na gọọmenti etiti nwuchiburu Kanu n'afọ 2015, emecha ndị agha wakpoo bee ya nke mere o ji gbapụ na Naịjirịa n'afọ 2017.

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Ọkaiwu Mike Ozekhome, Nnamdi Kanu na ọkaiwu Ifeanyi Ejiofor
Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya (Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor)

Nnamdi "Nwannekaenyi" Kanu hibere ma bụrụ onye ndu otu a ma dịka 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) n'afọ 2012.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ochie (old Eastern State)kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru nde, atọ ,atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ya, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu(terrorist group).

Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa 'London Metropolitan University'.

Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum.

A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.

O kwenyere ma bụrụ onye ofufe Judaism.