Anyị gburu ndị IPOB/ESN anọ wakporo ụlọọrụ uweojii dị n'Omuma - Uweojii Imo steeti

Ndị uweojii Naịjiria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Foto a na-egosi ndị uweojii Naịjiria e zigara maka ọrụ nchekwa na ntuliaka ọkwa gọvanọ Anambra steeti na Nọvemba afọ 2021

Ndị uweojii Imo steeti ekwuola na ha gburu mmadụ anọ n'ime ọtụtụ ndị ha sị bụ ndị otu Indigenous People of Biafra/ Eastern Security Network (Ipob/ESN) wakporo ụlọọrụ ha dị n'Omuma, Okpuru ọchịchị Oru East nke steeti ahụ.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Michael Abattam ziputere, o kwuru na ndị ojiegbe ahụ ha na-enyo bụ ndị otu Ipob/ESN, bu ọtụtụ egbe na ogbunigwe pụta n'igwe iwakpo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Omuma, ebe elekere atọ nke isi ụtụtụ Sọnde, 20 nke ọnwa Maachị 2022.

ESN

Ebe foto si, ESN/Facebook

O kwuru na ndị uweojii na ndị uweojii pụrụ iche bụ Department of States Services (DSS), jikwa ịkwa mgbọ nke ha zaghachị ha ozugbo.

Abattam kwuru na enweghi onye uweojii nwụrụ na ya bụ mwakpo, mana ha dulara mmadụ anọ n'ime ndị wakporo ha mmụọ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ bu mgbọ tụrụ ha gbaba ọhịa.

O kwukwara na ha wetara ogbunigwe ise na-agbapụghị agbapụ nakwa nsi a gwọrọ agwọ, n'aka ndị omekome ahụ, nke ndị na-atụsasị ogbunigwe ga-atụsa.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na ndị uweojii abanyela ime ọhịa na-esi imi n'ala ịchọpụta ndị omekome ahụ gbabara n'ime ọhịa.

Rabiu Hussaini bụ Kọmishọna uweojii nke steeti ahụ ji ohere ikele ndị uweojii maka mbọ ha gbara ichekwa onwe ha na ụlọọrụ ha, rịọ ndị Imo steeti ka ha gbaa mbọ kpesa onye ọbụla ha hụrụ bu ọnya si na mgbọ maọbụ onye ọbụla ha hụrụ na-agwọ mmerụ si na mgbọ egbe.

Mara na Omuma bụ obodo ebe aka na-achị Imo steeti bụ Gọvanọ Hope Uzodimma si.

Ndị ojiegbe wakpokwara Abba n'Imo steeti

Ndị ojiegbe wakporo ndị ọrụ nchekwa na mpaghara Abba, n'Okpuru ọchịchị Onuimo nke Imo steeti, jiri egbe chụsaa ha ma mụnye ụgbọala ha ọkụ, n'abalị Satọde, 19 nke ọnwa Maachị.

Otu ichie n'obodo ahụ na-achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ndị ojiegbe ahụ ji ọgbatumtum ruru iri zute ndị nchekwa ahụ n'ụzọ, mere ka ha hapụ ụgbọala ha gbaba n'ime ọhịa.

Chetakwa na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Umuguma, Owerri West, gbuo ndị uweojii abụọ ma mụnye ụlọorụ ahụ ọkụ n'ụbọchị Satọde, 19 nke ọnwa Maachị 2022.