Ihe Ipob kwuru maka ndị mechiri ụlọọrụ, ụlọakwụkwọ n'ike n'ihi egwu 'unknown gunmen'

Ipob asaala ebubo ndị mmadụ na-ebo ha na nso nso maka ozi iyi egwu otu kpọrọ onwe ha 'unknown gunmen' zipụtara

Ebe foto si, Getty Images/BBC

Nkọwa foto, Ipob asaala ebubo ndị mmadụ na-ebo ha na nso nso maka ozi iyi egwu otu kpọrọ onwe ha 'unknown gunmen' zipụtara

Otu Indigenous People of Biafra (Ipob) agọọla na aka na ụkwụ adighị n'okwu otu 'unknown gunmen' zipụtara ozi mmaja nye ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na nso nso a.

Ozi ọhụrụ a otu a zipụtara kwuru na ha ga-ememila ndị ọbụla gara ụlọakwụkwọ maọbụ ụlọọrụ ụbọchị Monde ọbụla kwa izu.

Akwụkwọ ozi a sị otu a kpọrọ onwe ha 'unknown gunmen' wepụtara nke fegharịrị n'Owere, isiobodo Imo steeti, Ụmụahịa, isiobodo Abia steeti nakwa na soshal midia na nsonso a menyere ọtụtụ egwu.

N'akwụkwọ ozi ahụ, ha dọrọ aka na ntị na onye ọbụla gara akwụkwọ, ọrụ maọbụ mepe ọdọahịa ya n'ụbọchị Monde ọbụla maọbụ gụọ egwu ala Naijiria(National Anthem) ji ndụ ya agba okoso.

Dịka ozi ahụ pụtachara, egwu jidere ọtụtụ ndị mmadụ n'Owere nakwa Umuahịa nke mere ka oke nọrọ n'ọsọ, ngwere n'ụzọ n'ụbọchị Monde dịka ndị gara ọrụ na ụlọakwụkwọ mechiri n'ike.

Mana dịka ụfọdụ ndị mmadụ nọ na soshal midia na-arụ otu Ipob na otu nchekwa ha bụ Eastern Security Network (ESN) aka maka ozi iyi egwu ahụ, mana otu ahụ agọrọla onwe ha n'okwu a.

Ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful gwara BBC Igbo n'ekwentị, na "onye ọbụla na-ekwu maka 'National Anthem' na 'Sit-at-home' ugbua abụghị onye Ipob maọbụ ESN".

"Mmechi ụlọakwụkwọ abụghị ihe Ipob chọrọ."

Ọ gara n'ihu boo ebubo na ọ bụ ndị ndọrọndọro ọchịchị ji ndị ekperima na-akpa arụ n'ala Igbo ma na-ebo ya otu Ipob/ESN,.

Ọ gara n'ihu kwee nkwa na oge na adịghị anya, aka Ipob ga-akpara ndị ọjọọ ahụ na-eme ihe ndị a n'ala Igbo.

N'izu ole na ole gara aga, ogbugbu mmadụ, na tigbu-zogbuo ndị ọzọ si na aka ndị ojiegbe riri elu na mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwu Naịjirịa nke butere ndị mpaghara ahụ egwu na ahụ ọmariri.

Etu ndị ọrụ Abia steeti High court si mechie ọrụ n'ike n'ihi egwu 'unknown gunmen'

Ụlọikpe Ukwu nke Ụmụahịa

Ndị ọrụ ụlọikpe ukwu Abịa steeti ji ọsọ mechie na mbido izu a dịka ha bịachara ọrụ hụ ozi ndị kpọrọ onwe ha 'unknown gunmen' n'ọnụama ụlọikpe 'Abịa State High Court' dị n'Ikpot-Ekpene Road, nke Ụmụahịa bụ isiobodo Abia Steeti.

Nke a na-abịa dịka nke yiri ya mere n'Imo steeti ebe ọtụtụ ụlọọrụ nakwa ụlọakwụkwọ mechiri n'ike n'ihi egwu so ozi ndị ojiegbe eyi egwu zitere ebe ahụ n'ụbọchị Mọnde.

Ndị amaghị ndị ha bụ mapanyere akwụkwọ ozi n'ọnụ ama nke na-adọ aka na ntị na "Ụlọọrụ ọbụla maọbụ otu ọbụla a hụrụ na-arụ ọrụ ụbọchị Monde maọbụ ụbọchị ikpe (Nnamdi Kanu), aga e mechi ya ebebe ebebe."

Ozi ahụ kwukwara na "Onye nwe ụlọọrụ ahụ ga-agba egwu anyị ga-akụrụ ya."

Onye ntaakụkọ anyị gagharịrị n'Ụmụahịa kwuru na ozi ahụ tinyere egwu n'ahụ ndị Abịa ọkachasị ndị ọrụ Bekee n'Abia steeti gụnyere ndị ọrụ ụlọikpe Abịa nke mere ka ha were ọsọ mechie ọrụ n'ike ụbọchị Monde.

Mbọ inweta olu ndị uweojii amịtaghị mkpụrụ dịka ọnụ na-ekwuru ha n'Abia steeti bụ Geoffery Ogbonna azaghị ozi ezitere ya.

Etu ụlọakwụkwọ siri mechie n'ike n'Owere n'ihi egwu 'unknown gunmen'

Ụmụakwụkwọ

Ndị uweojii n'Imo steeti adọọla otu ndị na-emenye ndị mmadụ ụjọ kpọrọ onwe ha 'unknown gunnmen' aka na ntị ka ha wepụ aka enwe n'ofe tupu ọ ghọ aka mmadụ.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ụlọakwụkwọ mechiri n'ike n'ụbọchị Monde n'ihi egwu ndị ojiegbe-eyi-egwu iwakpo ụlọakwụkwọ ha.

N'ozi wuru ewu na soshal midia na nsonso a, nke a sị otu ndị a kpọrọ onwe ha 'unknown gunmen' wepụtara, a dọrọ aka na ntị n'ihe egwu ga-ezute onye ọbụla gara ụlọakwụkwọ, ọrụ maọbụ mepee ụlọahịa ụbọchị Monde maọbụ ụbọchị ọbụla e nwere ikpe Nnamdi Kanu nke bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob).

Ozi ahụ a mapara n'ebe dị iche iche n'Owere isiobodo Imo steeti makwara iwu na ọ bụ ukwe Biafra ka a ga na-ekwezị n'ụlọakwụkwọ dị n'Ọwụwa Anyanwụ tinyere ahụ ọma jiji n'ahụ ọtụtụ ndị mmadụ n'Imo steeti ọkachasị n'Owere.

Ọtụtụ ndị nwe ụlọakwụkwọ nakwa ndị nkuzi na steeti ahụ nke BBC Igbo gbaliri ịnụta ọnụmmiri okwu ha, ekweghị atụnye ọnụ n'okwu ahụ n'ihi egwu.

Aha onyonyo, Ihe ndị Igbo nwere ikwu maka Ipob sit at home otu ọnwa

Mana onye ntaakụkọ anyị nọ n'Owere gwara anyị na ọtụtụ ụlọakwụkwọ mechiri n'ike ụbọchị Monde, sị ụmụakwụkwọ ha lawa.

Nke a bụ n'ihi oke ogbugbu mmadụ gụnyere ndị uweojii nke malitere riwa ibe ya elu ọzọ na steeti ahụ.

Na nso nso a, ndị a mabeghị ndị ha bụ gbara ogbunigwe n'ụlọ onyeisi Ohaneze ndigbo bụ George Obiozor.

Nke a mere onyeisiala Muhammdu Buhari ji gbarụọ ihu ma zipụta ozi iti aka n'obi banyere ya bụ ihe mere.

Ndị ụmụakwụkwọ na-aga akwụkwọ n'ụbọchị 'Sit at home'

Mbọ anyị gbara ịnụta ọnụ Gọọmentị Imo steeti amịtaghị mkpụụ dịka Kọmishona mgbasaozi steeti ahụ bụ Declan Emelumba azaghị ekwentị ntị ya.

Kemgbe Gọọmenti Etiti ji nwụchie onye ndu otu Ipob bụ Nnamdi Kanu ma kpụpu ya ụlọikpe, ndị otu Ipob tinyere nọrọ-na-ụlọ ụbọchị Monde ọbụla nakwa ụbọchị ọbụla ọ na-apụta ụlọikpe.

Ha mechara wepụta ozi na ha ewepụla ya mana ndị ojiegbe ka na-egbuso ndị nupuru isi iwu ịnọọ n'ụlọ a agha nke mere ka ọtụtụ jiri egwu ka na anọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.

Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta olu ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful maka mgbachị akwụkwọ a mere n'ụbọchị Mọnde amịtaghị mkpụrụ dịka azaghị ozi e zigara ya.

Akụkọ ka na-abịa.