Anambra Insecurity: Ugboro ise ndị ‘unknown gunmen’ cheerela Gọvanọ Soludo aka mgba

Chukwuma Soludo

Chukwuma Charles Soludo bụ gọvanọ nke ise Anambra Steeti nweterela site n'ụzọ ntuliaka, kamgbe afọ 1999 Naịjirịa lọghachiri n'ọchịchị onye kwuo uche ya.

Ọchịchị Soludo n'Anambra steeti erubeghị ọnwa isii - cheta na e duru ya n'iyi ọrụ n'ụbọchị 16 nke ọnwa Maachị - mana ọnọdụ enweghị nchekwa ekwebeghị ya saa anya.

Ugboro ugboro ka ndị ekperima a na-akpọ onwe ha 'unknown gunmen' na-awakpo ọtụtụ mpaghara n'Anambra steeti, tinyere obodo Soludo si na ya pụ, okpuru ọchịchị ya, maọbụ ọgbakọ ọ nọ na ya.

Nke a mere ka ndị mmadụ na-ajụ sị "ọnwụ gburu nne oke, gịnị ka ọ ga-eme ụmụ ya?"

Lee ugboro ole ndị ojiegbe manyerela Soludo aka n'anya

Ndị uweojii na Charles Soludo

Ebe foto si, Police

1) Mwakpo Soludo na ogbugbu ndị nchekwa ya: Ndị ojiegbe wakporo Soludo n'ọnwa Maachị 2021, n'obodo ya bụ Isuofia.

Nke a mere oge ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị ka na-achụ nta vootu maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ Anambra Steeti.

Soludo na ndị ntorobịa Isuofia nọ ọgbakọ n'ụlọ ọgbakọ a kpọrọ Isuofia Civic Centre oge ndị ekperima ahụ wakporo ha ma kwaa ha mgbọ.

Ndị uweojii abụọ na-eche Soludo nche tụfuru ndụ ha na ya bụ mwakpo, ebe ndị ekperima ahụ tọọrọ otu onye aha ya bụ Emeka Ezenwanne.

E mechara tọhapụ nwa amadị ahụ, dịka ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela mmadụ itoolu e cheere na aka ha dị na mwakpo a.

Ndị Anambra pụtara n'igwe ma jụụ ụjọ dịka ha tụrụ vootu ha n'ụbọchị ntulika e mere n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvamba 2021

2) Atụmatụ ịkagbu ntuliaka Anambra: Ọnọdụ enweghị nchekwa gbaliri elu nke ukwuu n'oge a na-akwado maka ntuliaka n'Anambra Steeti.

Ndị ekperima na-akpagharị na-awakpo ndị ọrụ nchekwa dị icheiche, na-emebi ụlọ gọọmentị dị icheiche, ma na-eme ndị mmadụ ụra aga n'anya.

Tinyere nke a, otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ IPOB kwuru na agaghị enwe ntuliaka n'Anambra ma ọ bụrụ na gọọmentị etiti atọhapụghị onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu.

N'oge ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ chị obi n'aka, mana ya bụ ntuliaka mechara nwee isi dịka ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa wụchiri n'Anambra n'oge ntuliaka ahụ.

Ọ bụ na ntuliaka a ka Soludo si bụrụ gọvanọ Anambra steeti taa.

Isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Aguata nke Anambra steeti na-agba ọkụ

Ebe foto si, Screenshot

Nkọwa foto, Isuochi bụ obodo Soludo dị n'okpuruọchịchị Aguata

3) Mwakpo isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Soludo:N'abalị asaa nke ọnwa Eprel afọ a, ndị ekperima wakporo isi ụlọọrụ okpuruọchịchị Aguata, gbaa ya ọkụ ma gbakwaa ọtụtụ ụgbọala ọkụ.

Ndị ekperima ahụ kpọchibidoro ndịọrụ na-arụ ọrụ n'ebe ahụ ụzọ tupu ha esunye ya ọkụ.

Ọtụtụ ndịọrụ ahụ bụ na mpio ka ha si zọọ ndụ ha ụbọchị ahụ.

Ndị uweojii n'abalị

Ebe foto si, AFP

4) Mwakpo ndị uweojii n'akụkụ be gọvanọ Soludo: Ọzọkwa, n'abalị iri na ise nke ọnwa Eprel afọ a ka ndị ojiegbe wakporo ndị uweojii nọ ọrụ n'okporoụzọ n'Isuofia.

Nke a mere ka akụkọ malite ifegharị na ọ bụ n'ụlọ Soludo ka ndị ekperima a wakporo.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Toochukwu Ikenga kọwara na ọ bụghị na be Soludo ka a wakporo.

Ikenga kwuru na mgbọ tụrụ ndị uweojii atọ dịka ha na ndị ekperima ahụ kwakọrịtara mgbọ.

Ndị oji egbe eyi egwu
Nkọwa foto, Ndị oji egbe eyi egwu

5) Ogbugbu onye omeiwu Anambra bụ Okechukwu Okoye:Nke mere n'ọdị nso a bụ ntọrọ nakwa ogbugbu onye omeiwu na-anọchite anya mpaghara Aguata II n'ụlọ omeiwu Naịjirịa.

A tọọrọ onye omeiwu a bụ Okechukwu Okoye na onye enyemaka ya bụ Cyril Chiegboka n'ụbọchị 15 nke ọnwa Mee afọ 2022.

Mana ọ bụ n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Mee ka a hụrụ ozu ha abụọ; ndị ekperima ahụ gbupuru Okechukwu Okoye isi.

Ihe Gọọmentị Soludo na-eme maka nke a

Soludo onye malitere ọchịchị ya n'ụbọchị Maachị 16, o kwuru na nchekwa ndị Anambra bụ otu n'ime ihe kacha eche ya.

Ebe foto si, Soludo TV/Facebook

Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwubuola na ya dị njikere ka ya na ndị ntorobịa na-enye nsogbu a nwee mkparịtaụka.

O kwuru na ya dị njikere ịmata ihe bụ iwe ha nakwa ime ihe niile o nwereike iji mee ka iwe ha dajụọ.

Soludo kwekwara nkwa inye ndị ekperima mgbaghara pụrụ iche bekee na-akpọ 'amnesty', ma nyekwa ha ọzụzụ iji mee ka ha bụrụ mmadụ.

Dịka akụkọ pụtara maka ọnwụ Okechukwu Okoye, Soludo kwere nkwa nde naịra iri maka onye ọbụla ga-enye aka ka a nwụchie ndị niile aka ha dị n'ọnwụ ya.

Gọvanọ Soludo ekwuola na mkparịtaụka nke udo bụ ụzọ a ga-esi nweta udo na ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

Ebe foto si, Soludo TV/Facebook

Nkọwa foto, Gọvanọ Soludo kwere nkwa ịhụna gọọmentị etiti tọhapụrụ onyeisi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Nsogbu enweghị nchekwa malitere ịka njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ oge gọọmentị etiti nwụchiri onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob).

Ipob bụ otu na-azọ ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụrụ mba nọọrọ onwe ya a kpọrọ Biafra.

Mana Soludo ekwela nkwa ịgba mbọ ole ike ha ya ka a tọhapụ Nnamdi Kanu.

N'ọdị nso a, Soludo gara leta Nnamdi Kanu n'ebe e ji ya n'ụlọ mkpọrọ n'Abuja.

Atụmatụ 'sit-at-home' na ọnọdụ enweghị nchekwa n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Aha onyonyo, Nyocha BBC ekpuhela ndị ji Soshal Midịa ebute ọgbaaghara na ogbugbu ndị ha sị na-egbochi nwereonwe Biafra.

Dịka a nwụchiri Mazi Kanu, ndị Ipob kwuru na ha etinyela mmachi mkpagharị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ niile, kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.

Ọ bụ eziokwu na ha mechara kwuo na ha ewepụla iwu a ha tiri, mana ndị ekperima bucha egbe ka na-eyi ndị mmadụ egwu n'ihi ya bụ 'sit-at-home'.

Onweghị onye ụjọ na-ekwe ka ọ pụta ezi n'ụbọchị Mọnde ọbụla n'ala Igbo niile.

Soludo akpọọla oku ugboro ugboro, rịọ arịrịọ, baa mba, ma tie mkpu ka a kwụsị ọnọdụ ịnọ n'ụlọ a, n'ihi na ọ na-emebi ọnọdụ akụnụba ala Igbo, mana ihe niile a amịtabeghị mkpụrụ.