A gbaala ọtụtụ ụlọ ọkụ dịka a sị otu onye nwụrụ n’ọgbaghara nke Oruku, Enugu steeti

Dịka ndị mmadụ na-enwe aṅụrị oge ekeresimesi a, akụkọ na-ekwu na ndị obodo Oruku ji ọgụ, ịgba ụlọ ọkụ na igbu mmadụ were na mee mmemme nke ha.
N’ụbọchị 27 nke ọnwa Disemba afọ a, akụkọ si akụkụ okpuruọchịchị Nkanu East na mpaghara kwuru na ndị omekome gbara ọtụtụ ụlọọkụ dịka ọgbaghara ọhụrụ dapụtara ebe ahụ.
Ụfọdụ ndị bi ebe ahụ gwara onye ntaakụkọ anyị n’Enugu na ndị omekome ahụ wụbatara obodo ahụ n’igwe agbaala ih ruru ụlọ iri ọkụ ma gbagbuo otu onye n’ihi ọgụ na-adakọrịta n’etiti ndị obodo ahụ na onwe kemgbe afọ ole m ole gara aga.
Ruo ugbua, ọnụ ekwuru ndị uweojii n’Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe asabeghị ozi anyị zigaara ya gbasara ihe ndị uweojii na-ekwu maka mwakpo a ọhụrụ nakwa ọnọdụ mpaghara ahụ.
Obodo a bụrụla ebe dịzị ka ebe a gbara ọsọ agha n’ihi etu ọtụtụ tigbuo zogbuo siri adapụta ebe ahụ.
Mgbe anyị rutere obodo ahụ n’oge ọnwa ole m ole mgbe ọgbaghara dapụtara ebe ahụ, malite n’okporo ụzọ e si abanye ebe ahụ enweghị onye na-agagharị na be ha ma ncha.
O dobeghị anya ihe kpatara tigbuo zogbu nke a dapụtara na nso nso a mana ntụala nsogbo na-ada n’obodo ahụ malitere n’ebe afọ 2020.
Gịnị kpatara nsogbu na-ada n’Oruku na nso nso a?
Akụkọ pụtara n’ụbọchị 26 nke ọnwa Disemba 2020 na ndị oji egbe gbagburu Igwe ndị Oruku bụ Emma Mba ebe ọ nọ nzụkọ n’etiti obodo.
Odobeghi anya ndị mere ya bụ mwakpo maọbụkwanụ ebumnobi ha mana kemgbe Igwe ahụ nwụrụ, ọtụtụ ndọrọ ndọrọ na-egosi na ndị otu Igwe ahụ nakwa ndị alaaka ndị ọzọ na alụ ọgụ.
Ndị obodo ahụ na-ekwu na e gbuola ihe ruru mmadụ otu nari ma gbakwaa ụlọ karịrị iri ise ọkụ ọkụ kemgbe ya bụ malitere.
Na mwakpo a a sị mere n’ọnwa Disemba afọ a, ndị obodo kwuru na a gbara ụlọ aka chịburu okpuruọchịchị Nkanu East bụ Mazi Ejike Ani ọkụ, a gbakwara ụlọ igwe ahụ e gburu egbu bụ Emma mba ọkụ, gbakwara ụlọ a sị bụ nke otu nwoke a kpọrọ Agọzie Ani bụ nwanne Ejike Anị ọkụ nakwa ọtụtụ ụlọ ndị ọzọ.
Ndị omekome ahụ kpara ike abali atọ n’obodo Obinagu nakwa Ameke, ma gaa n’ihu gbagbuo otu onye Oruku bụ onye a sị bụ onye ọrụ ndị agha Naịjirịa.
Gịnị kpataburu nsogbu a na mbido?
Na mbụ, obodo Oruku na agbataobi ha bụ obodo Umuode na-alụ agha ịzọ okeala kemgbe ihe ruru afọ iri ise dịka ndị obodo ahụ siri kwuo.
Ha kọwara na nke na gọọmenti nakwa ọchịchị aka ndị chịbụrụ steeti ahụ bụ Okwy Nwodo, Chimaroke Nnamani, Sullivan Chime nwara ịdajụ ya bụ okwu.
Gọvanọ Ifeanyị Ugwuanyi na-achị steeti ahụ gbalịrị ikpe ya bụ ikpe site na itinye okeala, mana ya bụ ihe amịtaghị ezigbo mkpụrụ. A na-ekwu na nke a mere obodo abụọ a jiri bụrụ ndị iro ruo ugbua.

Gini ka gọọmenti Enugu steeti na-eme ugbua?
iji kwọọ onye ukwu wara, Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi kewara Oruku abụọ, were kepụta mpaghara ‘Autonomous community’ ọhụrụ, were kpọọ ya Agụ-Ikpa. Mana ya bụ ihe kpaliteziri ọgụ n’ihi na ọtụtụ ndị Oruku kwuru na ekeghị ya bụ okeala nke oma.
Ka ọ dị ugbua, ọgụ a na ata isi ndị mmadụ nakwa ọtụtụ ụlọ bụ ọgụ na-ada n’etiti ndị Oruku na ndị Oruku.
Oge ọbụla nsogbu a dapụtara, a na-enwe ebubo ndị ọ dịka ọ bụ ha na ebute ya bụ tigbuo zọgbuo.
Mana ihe ịgba ama adịbeghị n’okwu ndị nọ n’isi ya bụ mwakpo na-ada ebe ahụ.
A ka na-eche ka a nụ olu ndị uweojii dịka ha asabeghi ozi anyị ọbụla n'okwu ọhụrụ a.









