Etu ịzọ okeala si bute ọnwụ ọtụtụ ndị mmadụ n'Oruku, Enugwu steeti

Obodo Oruku dị n'Enugwu steeti dịzị ka ebe agbara ọsọ agha ugbua dịka ndị amaghị ndị ha bụ egbuola ọtụtụ mmadụ.
N'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Septemba afọ 2022, ka ndị ahụ a na-atụ egwu gbagburu otu nwaokorobia a kpọrọ Chikodili Ngwu, onye Ameke dị n'Oruku, ka ọ gara ahịa.
Naanị izu ụka atọ gara aga, n'ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Ọgọst, afọ 2022, ka ndị oji egbe gbagburu Onyeisi otu ndị obodo Oruku bụ Ichie Nwatu.
Agbagburu Ichie Nwatu bụ onye uweojii lara ezumike nka tupu o were ọkwa onyeisi otu, ka o si n'ụlọ ya apụta.
Otu onye Oruku BBC gbara ajụjụ ọnụ bụ Maazị Maxwell Agu, kwuru na “Anyị amaghị ndị ahụ ji ụgbọala wee wakpo Ichie Nwatu n'ụbọchị 20 nke Ọgọstụ n'ụlọ ya ma were egbe gbagbuo ya".
Agu gara n'ihu kwuo na "Kamgbe ndị omekome ahụ gbagburu igwe be anyị na Disemba nke afọ 2020, e gbuola ihe karịrị mmadụ asaa ma gbakwaa ụlọ karịrị iri na abụọ ọkụ."
Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị Oruku agbaala ọsọ na be ha gbaga Enugwu, nakwa obodo ndị gbara ha gburugburu bụ Akpoga Nike, Owoh na Emene maka egwu ndị a na-egbu mmadụ.
Gịnị na-ese okwu n'Oruku?
Akụkọ ihe na-ebute nsogbu n'Oruku tere aka nke ukwuu.
Kemgbe afọ iri ise, ha na obodo agbataobi ha bụ Umuode, nọ n'esemokwu okeala nke buterela ọnwụ ihe karịrị mmadụ narị n'etiti Ụmụode na Oruku.
Mana nsogbu nke ikpeazụ a dị n'etiti ndị Oruku malitere ka Maazị Emma Mba weere ọchịchị dịka Igwe Oruku n'afọ 2019.
Ọtụtụ ndị obodo mere ngagharịiwe gwa gọọmentị na ha achọghị Mba dịka Igwe ha, mana ya bụ nwoke gara n'ihu na-achị obodo Oruku.
Ka o mere otu afọ Mba rigoro n'oche eze ka nsogbu igbu mmadụ malitere n'etiti ndị kwe na ndị ekweghị n'ọchịchị ya.
Igwe Mba kpọrọ nzukọ obodo n'ụbọchị 26 nke ọnwa Disemba 2021 n'Oruku Town Hall, ngwa ngwa ya bụ nzukọ na-aga n'ihu ka ndị oji egbe karịrị ise wakporo ha ma dulaa Igwe Mba mmụọ.
Kemgbe ahụ, egbuola ihe karịrị mmadụ asaa ma gbakwaa ọtụtụ ụlọ ọkụ maka ọnwụ ya bụ Igwe.
Gịnị ka gọọmentị Ifeanyi Ugwuanyi mere?
Gọọmentị atọ gara aga n'Enugwu steeti agbaala mbọ igbo mkpa ndị Oruku mana o kweghị ha.
Chimaroke Nnamani oge ọ bụ gọvanọ, kpere ikpe dị n'etiti Oruku na Umuode mana udo abịaghị.
Sullivan Chime kpekwara ikpe Oruku na Umuode oge ọ bụ gọvanọ nwakwara ike ya, mana isi apụtaghị.
Ka o ruru na nke Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyị bụ aka na-achị steeti ahụ ugbua, ihe na-ese ugbua bụ na Oruku n'ime onwe ha na-alụzị ọgụ nke mere na ọtụtụ ndụ na akụnaụba alaala n'iyi.
Gọvanọ Ugwuanyị họpụtara kọmitii n'afọ 2019, kewaa Oruku ụzọ abụọ, kewapụta otu Obodo kwụrụla onwe ya nke aha ya bụ Agụịkpa.
Mana kemgbe Gọọmenti Enugwu steeti kewapụtara Agụịkpa, ihe na-ebe ka na-ebe n'ihi na ụfọdụ kwuru na ekeghị ya bụ okeala nke ọma.
Igbu mmadụ dịzị ka omenala n'Oruku dịka obodo ha tọgbọzị chakoo
Mgbe BBC Igbo rutere n'Oruku ọtụtụ ụlọ gbachiri agbachị n'ihi na ndị bi ebe ahụ agbaala ọsọ ndụ ha.
Otu agadị nwoke na-akọ ugbo bụ Esomchi gwara BBC okwu sị "Naanị mụ nọzị na be m ugbua. Nwunye m agbaala be nna ya n'Akpoga Nike.
Ndị a na egbu mmadụ gburu nwanne m nwoke afọ abụọ gara aga"
Ọ kwara arịrị na Gọọmenti ekpezighị ikpe oruku nke oma, na ọ bụ ya meziri ha ji egbukọrịta onwe ha.
Otu nwa agbọghọ Oruku achọghị ka a kpọọ aha ya kwara arịrị na naani akwamozu ka ndị ọjọọ ahụ na-ekwe ka e mee na be ha.
Na ka mgbe otu afọ n'ụma ndị niile na-alụ nwaanyị n'Oruku na-agbazị nkwụ n'Enugwu n'ihi egwu.
Onwu Chijioke Ngwu n'ụbọchị Sọnde bụ ụbọchị 11 nke ọnwa Sepụtemba nakwa mgbagbu onyeisi otu ndị obodo Oruku n'ụbọchị 20 nke ọnwa Ọgọọst abụrụla ọkpụkpụ gbanyere ndị obodo ahụ n'olu.
Dịka ha siri kwuo, egwu na-atụ ndị obodo ahụ ugbua bụ na ndị a na egbu mmadụ ka na-aga n'ihu n'agbanyeghị na ọtụtụ anwụọla na be ha.









