Ebe niile a wakporo n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa maka Sit-at-home

Dịka otu kpọrọ onwe ha Biafran Auto Pilot nke onyeisi ha bụ Siomn Ekpe hiwere ọnọdụ onye apụtala ezi ụbọchị ise dịka ụzọ ha ga-esi enweta mwereonwe Biafra, ndị mmadụ pụtara gaara mkpa dịịrị ha kama nke a adabachaghị ọfụma n'ebe ndị otu Auto Pilot nọ.
Nke a butere mwakpo n'ụfọdụ ebe na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nke akụkọ na-ekwu na ọ bụ ndị omekome na-ehiwe iwu onye apụtala ezi a kpara arụ a.
Cheta na tupu ụbọchị mmachị ngagharị a bidoro, enwere ihe onyonyo nke gosiri ndị ji egbe ma olu na-ekwu na onye ọbụla pụtara ezi ga-ahụ ihe ọkụ ji ntị oke eme.
Na nchịkọta, lee ihe BBC Igbo ma maka mwakpo ndị a :
Nke mere n'Imo Steeti.

Owerre bụ isi obodo Imo Steeti kworo ekwo n'ụbọchị Frịde agbanyeghị na ọ bụ ya bụ ụbọchị Ekpa na ndị otu ya siri na mmachi onye apụtala ezi ga-ebido.
Kama Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu onyeisi otu Ipob bụ Nnamdi Kanu depụtara n'akara Twitter ya ma sị na ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo obodo ya nke bụ Uruala dị n'okpuruọchịchị Ideatọ Nọt n'Imo Steeti n'ụbọchị Fraịde.
Ejimakor depụtara na ndị a gbara ọtụtụ ọdọahịa nke dị n'ahịa Afọ Ilo ma gbaa kwaa ụgbọala ndị mmadụ ọkụ.

Ebe foto si, Screengrab
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mwako ụlọọrụ Inec nke Imo Steeti

N'otu aka ahụ ka ndị ekperima amaghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) dị n'Owerri, Imo Steeti n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Michael Abattam kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ atọ n'ime ndị bịara mwakpo a ebe otu onye uweojii nwụkwara.

Otu onye uweojii ọzọ merụkwara ahụ dịka ha na ndị ekperima ahụ na-akwakọrịta mgbọ.
"N'elekere iri na abụọ nke isi ụtụtụ taa, ndị a na-eche na ha bụ ndị otu Ipob/ESN wakporo ụlọọrụ Inec, tụọ ogbunigwe 'dynamite' nakwa ogbunigwe e ji petrol rụọ," Abattam kwuru.
"Mana ndị uweojii lụsoro ha ọgụ ma chụọ ha ọsọ, dịka ha na-agba ọsọ, ha hapụrụ otu ụgbọala lexus ojii, mana ndị uweojii gburu mmadụ atọ n'ime ha.
"Anyị napụtara ha egbe AK47 atọ, egbe pump action atọ, ogbunigwe abụọ na-agbabeghị agba, ogbunigwe petrol ndị ọzọ, nakwa ọtụtụ ọgwụ a gwọrọ agwọ."
"Anyị ejidekwala mmadụ abụọ n'ime ha ndị mgbọegbe tụrụ."
Mwakpo e mere n'Enugwu Steeti

Ihe onyonyo na-efegharị nke BBC hụrụ anya na-egosi ebe ozu mmadụ atọ tọgbọ n'ala dịka e kwuru na ndị na-amanye sit at home n'Enugwu gbara egbe iji chụlaa ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'ụzụ ụtụtụ.
Nke a mere ka kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ahmed Ammani gwa ndị Enugwu steeti ha gaa mkpa ha n'atụghị ụjọ ọbụla.
Ammani zipuru ndị otu ya n'igwe na mpaghara Enugu ịhụ na o nweghi onye manyere ndị mmadụ 'sit at home' bụ nke iwu machiri.
Onyekwara ndị otu ya iwu ha nwụchie ndị omekome na-achọ ibute ọgbaghara na steeti ahụ site n'imanye ya bụ 'sit at home'.

Mwakpo e mere n'Ebonyi Steeti

Ndị ekperima wakporo mpaghara dị icheiche n'Ebonyi Steeti n'ụtụtụ taa bụ Mọnde, Disemba 12, 2022.
Onye ntaakụkọ anyị n'Abakiliki, isi obodo Ebonyi steeti, kwuru na ụmụ nwaanyị na-azụ ahịa na 'Margaret Umahi Int'l Market' jị ọsọ gbasasịa dịka ha nụrụ ụdaegbe na-ada aghara aghara.
Ọzọkwa, akụkọ kwuru na ndị ojiegbe wakporo ahịa dị n'Ishieke ma tinye ya ọkụ n'ụtụtụ taa.
Ndị ekperima a wakpokwara otu ụgbọala na mpaghara 'New Market' Abakiliki ma gbakwaa ya ọkụ.

Ụfọdụ kwukwara na ndị ojiegbe ahụ gbara otu onye uweojii egbe na mpaghara Kpirikpiri dị nso n'ama egwuregwu Abakiliki.
Ka ọ dị ugbua, ahịa, ụlọakwụkwọ, ụlọakụ nakwa ụlọorụ niile emechiela, ebe ụfọdụ ndị mmadụ pụtara apụta na-achọzi etu ha ga-esi laghachi be ha, dịka onye ntaakụkọ anyị si kwuo.
A hụkwara ka ụgbọala ndị uweojii na-akpagharị n'obodo Abakiliki niile iji mee ka obi dajụọ ndị mmadụ.
Mana oge ndị ntaakụkọ kpọtụụrụ onyeisi uweojii Ebonyi Steeti bụ CP Garba Aliyu, o kwuru na onweghị ebe ọbụla a wakporo na steeti ahụ, maka na ndịọrụ ya kwụ chịm n'ebe niile.










