Ihe mere Nnamdị Kanu ji gbaa ngalaba DSS akwụkwọ ọhụrụ n’ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images/DSS
Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Indigenous People of Biafra, (Ipob) nke nọ na nga ndị DSS kemgbe afọ 2021 agbaala ngalaba ndị uweojii ahụ akwụkwọ ọhụrụ n’ụlọikpe.
N’ozi ọkaiwu ya bụ Ifeanyi Ejiofor zipụtara na soshal midia ya, ọ kọwara na Kanu na-agba ngalaba ndị uweojii Naịjirịa bụ ‘Department of State Service’ (DSS) akwụkwọ n’ihi ha enweghị Kanu onye ndị ọkaiwu ya kwuru ahụike ya na-adatụ hụ ndị dọkịnta ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ejiofor onye kwuru na ikpe a nọ n’ụlọikpe ukwu nke Abuja kwuru na Kanu chọrọ ka ndị dọkịnta ya mee nnyocha ime ahụ ya iji mara ihe na-eme ya kpọm kwem mana gaa n'ihu boo ebubo ndị ọrụ DSS ekweghị ka nke a mee.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'otu aka ahụ ọkaiwu Kanu bụ Aloy Ejimakor zipụtara ozi na soshal midia ya na Satọdee na-ekwu na gọọmentị Naịjirịa ma na a chọrọ iwa Kanu ahụ ma ha jụrụ itọhapụ ya dịka ụlọikpe mkpegharị siri nye kwu.
Mkpesa ọhụrụ a ndị ọkaiwu Kanu na-eme nke akara ya bụ FHC/ABJ/CS/ 2341/2022 chọrọ
"Ka e kwe ndị dọkịta ahụike ya ka ha mee nyocha ahụ ya iji mara ọnọdụ ahụike ya na-adatu ugbua, dịka Ụlọikpe ukwu nke Abuja siri nye iwu na mbụ mgbe Ọkaikpe B.F.M. Nyako, n’ụbọchị 21st nke Ọktoba, 2021 nyere ohere a dị n’akụkụ asaa n’akwụkwọ iwu mgbochi mmekpa ahụ, 2017".
Nke a na-abịa dịka ọkaiwu Kanu Aloy Ejimakor boro ebubo na nso nso a na ndị ọrụ nchekwa DSS kwuru Kanu agụụ ruo abalị itolu dịka ọ gara njem ileta ya.
Ejimakor kwuru na ndị DSS mere nke a ma jụkwa inye ya ọgwụ ya n’ihi ha sị na ha enweghị ego izụta nrị nakwa ọgwụ.
Akwụkwọ ikpe a bokwara ebubo na DSS ekwebeghi rubere iwu ụlọikpe nyere ha banyere Kanu ịnata ọgwụgwọ ahụike ya isi kemgbe.
Mana ọnụ na-ekwuru ndị DSS bụ Peter Afunanya gwara BBC Igbo mgbe ozi Ejimakor pụtara na "nleta nakwa ọdịmma ndị nọ n'aka anyị bụ ihe kacha dị anyị mkpa. Anyị anaghị emekpa ndị nọ n'aka anyị ahụ ma ncha".
Mgbe akụkọ okwu ịkwụ Kanu agụụ nakwa ndatu ahụike ya gbara n'ọha, akụkọ ọzọ pụtara na ndị mmadụ bịara jiri aha Kanu nakwa ọnọdụ ike ya egwu ndị Igbo wayo ma na-akụpụta ha ego n'akpa site n'atụmatụ ịtụkọrọ Kanu ego maka nri nakwa ọgwụ.
Etu ndị mmadụ si eji aha Mike Ozekhome na Nnamdi Kanu egwu ndị Igbo wayo

Ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Mike Ozekhome etiela mkpụ ma dọọ ọha obodo aka na ntị maka ụfọdụ ndị ekperima na-eji aha ya anakọ ndị mmadụ ego na-ekwu na ọ bụ i ji nyere Kanu aka.
Ozekhome kwuru nke a n'ime akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị iri na isii nke ọnwa Disemba 2022.
O kwuru na ọ bụ ihe mwute na ụfọdụ ndị ofeke na ndị ekperima na-eji ọnọdụ Kanu na-aghọgbu ndị mmadụ ma na-anapụ ha ego, n'aha ya onwe ya bụ Ozekhome.
"Ana m akpọku ọha obodo ka onye ọbụla mara na mụ bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu, onyeisi otu IPOB, maọbụ ụlọọrụ m, enyeghị onye ọbụla maọbụ ndị ọbụla maọbụ otu ọbụla ikike ịrịọ maọbụ ịnakọ ego n'aha m, maọbụ n'aha ụlọọrụ m, iji na-anọchite anya Nnamdi Kanu n'ụlọikpe, maọbụ iji mee ihe ọbụla. Onweghịkwanụ mgbe m ga-eme ihe dị otu a" Ozekhome kwuru.
"Ndị niile aka ha dị na wuruwuru a ga-ezute ntaramahụhụ niile nke iwu. Anyị ga-achọ onye dị otu a ebe ọbụla ọ nọ ma nye ya ụgwọ kwesịrị ya."
Ihe Ejimakopr kwuru maka ọnọdụ Kanu n'ụlọ mkpọrọ DSS

Mkpu a ọkaiwu Mike Ozekhome na-abịa dịka ọkaiwu pụrụ iche nke Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor kwupụtara na ndị ọrụ nchekwa 'Department of State Service' (DSS) anaghị enye Nnamdi Kanu nri n'ụlọ mkpọrọ.
Ejimakor kwuru na ya na nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel Kanu gara leta ya n'ụbọchị Tọzde, ha wee hụ na o ribeghị nri n'ụbọchị ahụ.
O kwukwara na Kanu sị na ndị DSS enyebeghị ya ọgwụ ya kemgbe abalị itoolu n'ihi na ha kwuru na ha enwgehi ego izụta ihe ndị a.
Oge ha jụrụ ndị DSS, ha kwuru na ha enweghị ego iji na-enye Kanu nri.

Ebe foto si, Screengrab
N'ihi nke a, nwanne Nnamdi Kanu bụ Emmanuel kwuru na ha ga-ewegara ndị DSS akwụkwọ 'cheque' otu nde naịra ka ha si na ya na-eleta Nnamdi Kanu, na-enye ya nri nakwa ọgwụ.
Emma Kanu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ eziokwu na ndị DSS sị na ha enweghị ego iji nye Nnamdi Kanu nri maọbụ ọgwụ.
"Mana taa, (bụ Tọzde, Disemba 16) SAN ga-ede akwụkwọ cheque maka otu nde naịra nke anyị ga-enye ndị DSS iji na-enye ya nri, ebe ọ bụ na gọọmentị etiti enweghị ike ileta ya anya nke ọma," ụlọ ntaakụkọ Punch kwuru.
Afunaya BBC Igbo na ebubo ndị a achịtaghị ajaa dịka ọ kọwaara BBC Igbo na ndị mmadụ ma ụma ekesa akụkọ ụgha banyere ngalaba ha iji tetọọ aha ha nakwa ọrụ ha.
Iji aha Biafra akpa ego

Ebe foto si, Screen grab
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nke a abụghị nke mbụ ọtụtụ ndị mmadụ na-eji aha Biafra anakọ ndị mmadụ ego na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Otu kpọrọ onwe ha 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) nke Nnamdi Kanu bụ onyeisi ya na-akpọ ogu ego kwa mgbe kwa mgbe n'oge gara aga, bụ nke ha sị na ha ji agba mbọ maka nnwereonwe Biafra.
Dịka gọọmentị Naịjirịa jidere Nnamdi Kanu n'ọnwa June 2021, ndị isi Ipob na ndị ọzọ na-akwado ndọrọndọrọ Biafra ka na-agakwa n'ihu na-anakọ ndị mmadụ ego.
Otu n'ime ha bụ Simon Ekpa, onye bi na mba Finland ma were akara soshal midia ya na-akpọ oku nnwereonwe Biafra.
N'ụbọchị 12 nke ọnwa Nọvemba afọ a, Ekpa hazikwara agbamọnya ego ọzọ nke o kwuru na ọ bụ iji kwadoo otu 'Eastern Security Network (ESN), maka iji na-echekwa mpaghara Biafra.
Chetakwa na Ipob - nakwa ESN - bụcha otu gọọmentị Naịjirịa machiri amachi ma kpọọ ha ndị na-eyi ndụ egwu.
N'ụbọchị 13 nke ọnwa Disemba 2022, ọkaiwu ọzọ na-anọchite Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor gbara Simon Ekpa akwụkwọ n'ụlọikpe n'ebubo ịmetọ aha Ipob na aha Mazi Kanu.
Ebee bụ Biafra

Ebe foto si, AFP
Bịafra n'oge mbụ bụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ndị dọpụrụ onwe ha n'afọ 1967 ma kwuo na ha chọrọ ịbụ mba nke aka ha.
Nke a mere ka Naịjirịa buso mpaghara ahụ agha nke a lụrụ ihe ruru ọnwa iri atọ, ma tufuo ndụ mmadụ ruru nde abụọ dịka ngụkọ si gosi.
Dịka Naịjirịa meriri agha ahụ, mpaghara a bụ Biafra lọghachiri azụ n'ime Naịjirịa.
Mana ọtụtụ ndị bi na mpaghara ahụ na-ebo ebubo na gọọmentị Naịjirịa na-emekpa ha ahụ, ma na-akpachapụ ha akpachapụ n'usoro ọchịchị.
Nke a mere ka ụfọdụ ndị ntorobịa na-ekwu na ha chọkwara isi na Naịjirịa pụọ ọzọ ma nwere onwe ha.
Ka ọ dị ugbua, enwere ọtụtụ otu na Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa na-agba mbọ maka nnwereonwe Biafra.
Ha gụnyere: 'Indigenous People of Biafra (IPOB); Movement for the Actualisation of the Sovereign State of Biafra (Massob); Biafra Independence Movement (BIM); Biafra Zionist Movement (BZM), wdg.












