Lee etu Ifeanyi Ejiofor si gbaa Simon Ekpa akwụkwọ n’ụlọikpe

Ebe foto si, Ifeanyi Ejiofor/Facebook
Otu n’ime ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor agbaala Simon Ekpa akwụkwọ n’ụlọikpe.
Ejiofor kwuru nke a n’aka soshal midia ya taa bụ Tuzde, abalị 13 nke ọnwa Disemba, 2022.
Na foto gosiri akwụkwọ ikpe a nke Ejiofor kesara na soshal midia ya, o kwuru na o wegarala ụlọikpe ukwu nke Abuja mkepsa megide Simon Ekpa.
Akwụkwọ ikpe a na-achọ ya Ekpa jiri aka bịa zara ọnụ ya maọbụ zite ndị ọkaiwu ga-ekpechitere ya n’okwu Ejiforo dobere n’isi ya ugbua.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị
N’ozi ya, o kwuru na ọ na-agba Ekpa akwụkwọ maka ebubo tigbo zọgbuo ọnụ okwu ya kpara.
O kwuru na o nwereike hara izipụta ọtụtụ ihe ndị zoro ezo maka ikpe a ugbua dịka o kwuru na agbanyeghi mba ọbụla Ekpa nọ na ikike iwu ka ejide ya.
O kwukwara na nke a bụ nke mbụ na-abịa dịka atụmatụ ndị ọzọ ga-emegide ya na-abịa n’oge adịghị anya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Cheta na otu n’ime ihe jịkọrọ Simon Ekpa na Ifeanyi Ejiofor bụ Nnamdi Kanu. N'afọ 2021, Ekpa so n'ime ndị Kanu họpụtara ga na-arụ ọrụ mgbasaozi site na igwe redio ya bụ 'Radio Biafra. Dịka gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu ọzọ n'afọ 2021, Ifeanyi Ejiofor so na ndị ọkaiwu na-ekpechitere ya ikpe.
Cheta na Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Indigenous People of Biafra (Ipob), nke bụ otu na-achọ nwereonwe mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Mana gọọmentị Naịjirịa machiri otu Ipob ma kpọọ ha ndị oyi ndụ egwu.
Gọọmentị Naịjirịa nwụchịrị Kanu na mba Kenya n’afọ 2021 ma jichie ya n'ụlọ mkpọrọ ndị uweojii pụrụiche bụ DSS n’ịchafụ dịka e dobere ọtụtụ ebubo n’isi ya nke ka na-aga n’ihu n’ụlọikpe ugbua.

Ebe foto si, Simon Ekpa
Ụfọdụ ihe Simon Ekpa merela na nso nso a
Simon Ekpa bụ onyeisi otu kpọrọ onwe ha 'Auto-Pilot', nke si n'otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) kewapụ, mana o bi na mba Finland, bụ ebe ọ na-esi agbasa ozi ya.
Ọ bụ ya tinyere iwu 'sit-at-home' abalị ise na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa malite n'ụbọchị itoolu rụọ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba 2022.
Nke a mere ka ndị ekperima na-akpagharị ma na-awakpo ndị mmadụ na-agara mkpa ha na steeti dị icheiche na mpaghara ahụ iji manye ha ka onye ọbụla ghara ịpụta ezi.
Ọtụtụ mwakpo mere n'ụbọchị ndị e hibere iwu nke gụnyere:
- Mwakpo Aloy Ejimakor bụ ọkaiwu Kanu depụtara n'akara Twitter ya mere n'obodo ya bụ Uruala dị n'okpuruọchịchị Ideatọ Nọt n'Imo Steeti n'ụbọchị Fraịde.
- Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ wakporo isi ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ 'Independent National Electoral Commission' (Inec) dị n'Owerri, Imo Steeti n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde a. Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Michael Abattam kwuru na ndị uweojii gburu mmadụ atọ n'ime ndị bịara mwakpo a ebe otu onye uweojii nwụkwara.
- N'ihe onyonyo na-efegharị nke BBC hụrụ si Enuwgu dapụta, e gosiri ebe ozu mmadụ atọ tọgbọ n'ala dịka e kwuru na ndị na-amanye iwu 'sit at home' n'Enugwu gbara egbe iji chụlaa ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'ụzụ ụtụtụ.Nke a mere ka kọmịshọna ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ahmed Ammani gwa ndị Enugwu steeti ha gaa mkpa ha n'atụghị ụjọ ọbụla.
- Ndị ekperima wakporo mpaghara dị icheiche n'Ebonyi Steeti n'ụtụtụ Mọnde Disemba 12, 2022. Onye ntaakụkọ anyị n'Abakiliki, isi obodo Ebonyi steeti, kwuru na ụmụnwaanyị na-azụ ahịa na 'Margaret Umahi Int'l Market' jị ọsọ gbasasịa dịka ha nụrụ ụda egbe na-ada aghara aghara. Akụkọ kwukwuru na ndị ojiegbe wakporo ahịa dị n'Ishieke ma mụnye ya ọkụ n'ụtụtụ ụbọchị ahụ.
- Akụkọ si Imo steeti pụta n'oge 'sit at home' a kwuru na ndị ojiegbe e chere na-amanye ya bụ iwu gbagburu nwanne nwoke Osita Iheme, omeeihe ejije Nollywood a ma ama dịka "Paw-Paw" bụ Chidi Iheme n'Ụbomiri dị n'Okpuru Ọchịchị Mbaitoli n'ehihie Fraide dịka ha na-aga oku achumtavootu nke Akarachi Amadi bụ onye APC na-azọ ịnọchịte ndị Mbaitolu /Ikeduru n'Ụlọomeiwu kpọrọ.
Ụlọọrụ na-anọchite anya mba Finland na Naịjirịa ekwuola na ha enwetala mkpesa gbasara Simon Ekpa, onye ndị mmadụ na-ebo ebubo ịkpata ọgbaaghara na enweghị nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ na soshal media malitere ime mkpesa, ma na-agbakwụnye akara soshal midia Simon Ekpa, iji kpọọ oku ka gọọmentị Finland tinye anya n'ebubo niile a na-ebo nwa amadị ahụ.

Ebe foto si, Simon Ekpa
Onye bụ Simon Ekpa?
Ihe gbasara ndụ Simon Ekpa edochaghị anya, mana ihe ndị a ma maka ya gụnyere:
- Ọ bụ onye si n'okpuru ọchịchị Ohaukwu, dị n'Ebonyi Steeti
- Dịka e si hụ n'ụfọdụ akwụkwọ ndekọ n'ịntaneetị, a mụrụ Ekpa n'ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị 1985
- Ọ nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi ọsọ na 2003 na mba Kamerun
- O bi ugbua na mba Finland ebe ọ bụzi nwaafọ (citizen)
- Ọ na-ekwu na ya sonyeburu n'otu ndịagha na Finland n'oge gara aga
- O dere n'akara LinkdIn ya na o nwere nzere 'masters' na mmụta ọkaiwu
Ọtụtụ nnyocha egosila na ụfọdụ akụkọ Simon Ekpa kesara na soshal midia ugboro ugboro bụ akụkọ ụgha.










