Ihe Fr Magnus Ebere, Ohaneze, Ipob kwuru maka 'sit-at-home' abalị ise, Simon Ekpa

Ebe foto si, Fr Magnus Ebere/Simon Ekpa/Facebook
Ụkọchụkwu Katolik a ma ama ma bụrụkwa onye nchịkọta "Cannaland Adoration Ministry" a ma dịka "E Dey Work Ministry" bụ Fada Magnus Ebere na otu Ohaneze Ndigbo agbarụọla ihu maka oku nọrọ n'ụlọ abalị ise nke ndị e chere bụ alaka otu Ipob kpọrọ ka e mee n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Nke a na-abịa dịka akụkọ nakwa ihe onyonyo na-efegharị na social midia na-ekwu na onye pụtara ama malite n'abalị itoolu(9) ruo abalị iri na anọ(14) nke ọnwa Disemba afọ 2022 ga-eji anya ya hụ ntị ya.
Fada Ebere kwuru n'oziọma o ziri n'ọgbakọ "Gathering of Eagles" n'Imo steeti n'abalị Wenezde sị,:
"Kedụ ka ị ga-esi tinye iwu nọrọ n'ụlọ na-agwaghị ndị mmadụ ihe iji maka ya kpọọ oku ahụ?"
" Ka anyị ghara igbusisi onwe anyị tupu ndị bụ ndị iro abịa."
" Ọ bụrụ na i kwuo nọrọ n'ụlọ, onye ga-enye ndị mmadụ nri abalị ise?"
Fada Ebere, onye gbara ama na oge ịkpeazụ a kpọrọ oku 'nọrọ n'ụlọ' na ọtụtụ ndị mmadụ kpọrọ ya oku ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka n'ihi agụụ, gara n'ihu rụtụ aka na ọ bụ ndị nọ ala Bekee na-ekpori ndụ ha, na-amanye ndị Igbo iwu nọrọ n'ụlọ kwụwa agụụ, ebe ha nọ na mba ofesi na-enweta onwe ha."
"Ị nọrọ ala ebe ọzọ na-enweta onwe gị, ị si ndị be anyị tawa ahụhụ."
Fada Ebere gara n'ihu tụọ arịrị na ọtụtụ ndị mmadụ ebupụla ọdọahịa ha gaa na steeti ndị ọzọ ha n'Ọwụwa Anyanwụ gbara agbata obi dịka Bayelsa, Asaba dị na Delta Steeti n'ihi 'nọrọnụlọ. kwamgbe ,kwamgbe.
N'aka nke ọzọ, Otu Ohaneze ndigbo katọrọ oku nọrọ n'ụlọ n'Ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nke ha sịrị na Simon Ekpa, kpọrọ ma sị na ọ bụ iji kwado ndị Ọwụịwa Anyanwụ maka ọpụpụ ala Biafra na Naijiria.
"Ọnọdụ akụnaụba ala Igbo na-agbada."
"
Otu Ọhanaeze kwuru

Ebe foto si, George Obiozor
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Otu Ohanaeze Ndịgbo gbarụrụ ihu n'oku Simon Ekpa kpọrọ ka a nọrọ n'ụ;ọ abalị ise.
Onyeisi Ohaneze bụ George Obiozor kwuru site n'ozi nke ọnụ na-ekwuru otu ahụ bụ Alex Ogbonnia ya binyere aka ma wepụta sị, " Onyeisi Ohaneze Ndigbo gburu gburu bụ George Obiozor nakwa ụmụ Igbo nwoke na nwaanyị Igbo ihe ọma na adị mma na-akpoku onye nọ dịka eze obodo Umueziaka bụ onbodo Simon Ekpa; Onyeisioche Okpuru Ọchịchị Ohaukwu bụ Hon Ikechukwu Odono; oOmeiwu na-anọchite Ohaukwu South n'ụlọomeiwu Ebonyi steeti;bụHon. Chinedu Onah; Omeiwu na-anọchite Ohaukwu na Ebonyi n'Ụlọnnochietanya bụ Hon. Chukwuma Nwazunku; nakwa Senetọ na-anọchite Ebonyi _North n'Ụlọomeiwu nUkwu Naijiria bụ , Sen. Dr. Sam Ominyi Egwu nakwa aka na-achị Ebonyi steeti bụ Dave Umahi jide Simon Ekpa aka, hụ na ọ kwụsị oke aghara ndị ntorobia dị ya n'ahụ."
"Ha chetara Ekpa na o nwenubeghị onye na-alụ ọgụ nnwereonwe na-eche ihu egbe na ndị ọ na-alụrụ ọgụ."
" Ajụjụ onye ọbụla anya doro kwesịrị ịjụ nwa okorobia bụ ihe mere oji teta ụra si na ọ ga-atọgbu ndị ọ sị na ọ na-echekwa."
"Mgbe ndị Igbo na-agabiga oke ihe isi ike sitere na mkpagbu, ka otu nwokorobia maọbụ onye si na ọ na-alụrụ ọha Igbo ọgụ gbadoro anya na-emebila akụnaụba Igbo, si etu a na-etinye mmanụ n'ọkụ na-agba."
Ọhaneze gara n'ihu gbarụọ ihu etu ụfọdụ nd ndị ntorobia Igbo dịka Ekpa nakwa si emechu Igbo ihu site n'ikwu okwu ataghị eze were kwuo n'ọha, rụtụrụ aka n'oge onye ndu Biafra bụ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, bụ aka na-achị Ọwụị̀a Anyanwụ ochie oge Agha, nọ n'ọkwa ahụ na ọ na-akpọ ọgbakọ ndị ọnụ na-eru n'okwu na mpaghara ahụ gụnyere Bayelsa, Rivas, Akwa Ibom, Krọs River, Abia, Imo , Anambara, Enugwu, Ebonyi nakwa Anioma dị na Delta Steeti tupu e kpebie okwu maọbụ o wepụta ntuziaka ọbụla na Biafra.
Ihe Ipob kwuru maka oku 'nọrọ n'ụlọ' abali ise a

Cheta na n’ụbọchị Wenezde, otu Indigenous People of Biafra (Ipob) wepụtara ozi nke na-ekwu na ọbụghị ha wepụtara ihe onyonyo na-akpọ oku nọrọ n'ụlọ n’Ọwụwa Anyanwu Naịjirịa malite n’abalị itoolu ruo abalị 14 nke ọnwa Disemba afọ 2022 na-efegharị na soshal midia.
N’ozi ahụ nke ọnụ na-ekwuru ndị Ipob bụ Emma Powerful binyere aka, ọ sị: “Ipob enweghị iwu nọrọ n’ụlọ ha tinyere maka ụbọchị ndị a, maka anyị abụghị ndị agboro na-enweghị uche, maọbụkwanụ na-enweghị aka ọrụ.”
“Nwa bịafra ọbụla maọbụ onye ọbụla bi n’ala Biafra gbaa ụdị ozi a nkiti bụ ozi si n’aka ndị azụghị azụ na ndị enweghị ụbụrụ ndị ebunombi ha bụ ime ka ọha kpọọ mbọ nnwereonwe Biafra asị.”
“Onye Biafra ọbụla gawa mkpa ya n’ụbọchị ndị ahụ.”
“Ọ na-ewute Ipob, ndị nke anyị agaghị etinyere ndị be anyị iwu ịnọ n’ụlọ abalị ise dịka ọnọdụ dị ugbua n’ọgwụgwụ afọ ndị mmadụ na-agba mbọ ihe ha ga-achụta tupu afọ agwụ.”
Powerful gara n'ihu boo ebubo na-ekwu:
“Atụmatụ itinye nọrọ n’ụlọ abalị ise bụ aka ọrụ ndị na-arụrụ Naijiria ọrụ nke gosiri obi ọjọọ na akpọmasị ha.”
“ Ebumnobi ha bụ ibute ndakpọ nchekwa nakwa ihe isi ike nye ndị be anyị iji mee ka ha gbahapụ okwu ịchọ Biafra”
Ihe Simon Ekpa kwuru

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook
Na mkparịtaụka ya na otu Biafra nwere na ọbaozi Facebook n'abali ise nke ọnwa Disemba afọ 2022, Simon Ekpa bụ onye ndu otu kpọrọ onwe ha 'Autopilot' kwuru na nso nso a na Facebook na ihe ha ji kpoo oku nọrọ n'ụlọ abalị ise bụ iji kwado ndị Ọwụwa Anyanwụ maka ihe ga-eme n'afọ 2023 - "nkewapụ Biafra na Naijiria".
Ebe Nnamdi Kanu kwụ n'okwu 'sit at home'
Nnamdi Kanu bụ onye ndu otu Ipob nke ndị uweojii Naịjirịa ji eji kemgbe afo 2021 n'ụlọ nga Department of State Services (DSS) zipụtara ozi ugboro ugboro nke gụnyere n'izu gara aga site n'ọnụ ndị ọkaiwu ya na-ekwu na ọ kwadoghi atụmatụ ọbụla na-akpata itigbuo zọgbuo maọbụkwanụ atụmatụ ọbụla ga-ata ndị Igbo ahụhụ.
O teela Ipob kwuru na ha akwadoghị atụmatụ nọrọ n'ụlọ ọbụla nke na-abụghị ụbọchị onye ndu ha na-apụta ụlọikpe maka ikpe ya na gọọmentị Naịjirịa ji.












