Ihe ọhụrụ Nnamdi Kanu, Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor kpara n'ụbọchị Disemba 5

Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

Onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Nnamdi Kanu agwala ndị nkwado ya ka ha bilie buo agha megide ndị na-eji aha ndị Ipob na-eme arụ dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Kanu kwuru nke a oge ndị ọkaiwu ya bụ Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor gara hụ ya n'ụlọ mkpọrọ ndị 'Department of State Services' (DSS) n'ụbọchị Mọnde, Disemba 5, 2022.

Cheta na ndị DSS jichiri Mazi Kanu na mkpọrọ kamgbe ọnwa June 2021 oge a nwụchiri ya na mba Kenya ma kpụlata ya Naịjirịa.

Ejiofor kwuru na Kanu gwara ndị nkwado ya ka ha gbado anya maka ndị ekperima na-eji aha ndị Ipob na-eme arụ dị icheiche dịka ịtọrọ mmadụ maka ego, igbu mmadụ nakwa izu ohi.

O zuola bụ na o zuola

Ọkaiwu Mike Ozekhome na Ifeanyi Ejiofor

Dịka Ejiofor si kwupụta n'akara Twitter ya n'abalị Mọnde, Mazi Nnamdi Kanu nyere ndị nkwado ya ndụmọdụ ka ha ghara inye ohere ka ime mpụ bụrụ ihe e ji mara ndị Ipob.

"Onye ọbụla na-amanye ndị mmadụ ka ha nọrọ n'ụlọ bụ onye iro nke mbụ nye Onyendu Nnamdi Kanu," Ejiofor dere.

"Onyendu enyeghị iwu ọbụla ka ndị mmadụ na-anọ n'ụlọ na mpaghara Biafra. Ndị be anyị ga na-agara mkpa ha oge niile iji hụ na ọnọdụ ndụ na akụnụba ndị be anyị guzosiri ike."

Cheta na ndị Ipob tinyeburu iwu ịnọ n'ụlọ iji gosi iwe ha maka etu gọọmentị Naịjirịa si jichie Mazị Kanu.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ọ bụ eziokwu na Ipob kwuru na ha ewepụla iwu a ugbua, mana ụjọ anaghị ekwe ndị mmadụ pụọ iro n'ụbọchị Mọnde ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị icheiche, n'ihi na ụfọdụ ndị ekperima awakpola ndị mmadụ n'oge gara aga n'ihi na ha pụtara ezi n'ụbọchị Mọnde.

Ejiofor kwuru na Nnamdi Kanu dọrọ ndị nkwado ya aka na ntị ka ha kpachapụ anya, maka na ndị ekperima a na-awakpo ndị mmadụ na-eyi ha egwu bụ ndị iro ya, ndị chọrọ ka gọọmentị na-ebo ya ebubo ihe ọjọọ niile a ha ji aha Ipob eme.

"Ịtọrọ mmadụ na ime mpụ bụ nnukwu arụ n'omenala anyị dịka ụmụ Chineke, onye ọbụla na-etinye aka na ya bụ onye iro Onyendu Nnamdi Kanu nakwa onye iro Igbo niile... Ozuola bụ na Ozuola bikonu," Ejiofor kwuru.

Cheta na ndị ọrụ nchekwa ebola ebubo ugboro ugboro na ọ bụ ndị Ipob nakwa ndị ọgụ ha bụ 'Eastern Security Network' (ESN) na-akpa ike ọjọọ dị icheiche nke mere ka ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ọdị nso a.

Ha kwukwara na ọ bụ ndị Ipob/ESN wakporo ụlọ mkpọrọ dị n'Owerri n'afọ 2021 ma tọhapụ ọtụtụ ndị mkpọrọ, bụzị ndị na-awakpo ndị uweojii na ndị agha na mpaghara ahụ.

Mana ndị Ipob ekwuola na aka ha dị ọcha n'ebubo niile ndị ahụ.