Nnamdi Kanu News: Ihe mere anyị ejighi ike tinye ọnụ n’ikpe ya – Gọọmentị UK

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Gọọmenti mba Briten ekwuola ihe mere na ha ejighi ike etinye ọnụ n'ikpe metụtara Nnamdi Kanu, onyendu Indigenous People of Biafra (Ipob) na Gọọmentị Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka ụlọikpe dị na mba UK lebara anya n'akwụkwọ nwanne Kanu bụ Kingsley Kanu gbara Gọọmentị Briten, n'ebubo na ha jụrụ ikwupụta n'ezie na ọ bụ mgbere ọjọọ ka a tụrụ Kanu site na mba Kenya ma lọta Naịjirịa.

N'ikpe ahụ nke malitere n'ụbọchị Tuzde 15 Nọvemba 2022, ọkaiwu Kingsley Kanu sị na ụlọọrụ gọọmentị UK bụ 'Britain Foreign Office kwesịrị ikwupụta uche ha na ọ bụ mgbere ọjọọ ka a tụrụ nwanne ya nwoke site na mba Kenya lọta Naịjirịa.

Otu n'ime ndị ọkaiwu ya bụ Charlotte Kilroy kwuru na ọ bụrụ na gọọmentị UK kwupụta uche ha banyere mgbere a tụrụ Kanu, na ọ ga-enyere ha aka ịma ụzọ ha ga-esi e nyere Kanu aka.

Ọ gara n'ihu kwuo na akaebe na-egosi na a tụrụ Kanu mgbere ọjọọ gbapụtara ihe na ozoghi ezo.

Mana James Eadie bụ ọkaiwu na-anọchiteanya 'Foreign Office' nke mba UK kwuru na ọ bụghị ọrụ Gọọmentị UK ikwupụta ma nwuchi Kanu o megidere iwu.

O kwuru na okwu banyere Kanu esepụtala ise n'ihe ruru ugboro 43 na nzuko Gọọmentị UK na nke Naịjirịa nwerela banyere mmekọrịta mba na mba.

Nnamdi Kanu n'ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images

Ọ sị na Onyeisiala Muhammadu Buhari na onye bụbu Praịm Minista mba Briten Boris Johnson kpara nkata banyere Kanu na nzuko abụọ ha nwere.

Eadie gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ Gọọmenti Briten agaala leta Kanu n'ụlọmkpọrọ. Ụlọọrụ

"Foreign Office kpebiri na ha agaghị ewepụta ozi banyere nwuchi Kanu na ọnọdụn ya, iji gbanahụ 'ọdachi ọjọọ' nye Kanu n'onwe ya."

Nnamdi Kanu na ndị ọkaiwu ya

Cheta n'ọnwa Juun afọ 2021, Gọọmentị Naịjiria site n'aka ụlọọrụ Department of State Services (DSS) nwuchigharịrị Kanu na mba Kenya ma kpọlata ya na Naịjirịa.

Ha boro Kanu ebubo iri na ise nke gụnyere ịgba gọọmentị mgba okpuru nakwa ihiwe otu na-eyi ndụ egwu.

Mana n'ụbọchị 13 Ọktoba 2022, ụlọikpe Mkpegharị na Naịjirịa kachapụrụ ebubo niile ahụ ma nye iwu ka a tọhapụ Kanu.

Gọọmentị Naịjirịa jụrụ ịtọhapụ ya kama na-ata ikike n'aka Ụlọikpe Mkpegharị ka ha jigide Kanu n'ụlọmkpọrọ ruo mgbe Ụlọikpe Kachasị ga-ekpebi ya.

Ekwentị maọbụ kọmputa gị nwereike igbochi gị ịhụ ozi a

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: