Etu 'sit-at-home' si ebi anyị aka ọjọọ - Ụfọdụ ndị bi n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Ọ karịala otu afọ kamgbe ụbọchị Mọnde ji bụrụ ụbọchị ezumike na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa niile.
Nke a malitere mgbe gọọmentị Naịjirịa nwụchiri onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) bụ Mazị Nnamdi Kanu, na mba Kenya ma kpụlata ya na Naịjirịa tụkpuo ya na mkpọrọ.
'Sit-at-home' bụ ụzọ ndị Ipob ji egosi iwe ha maka nke a, ma na-akpọ oku ka a tọhapụ onye ndu ha.
BBC Igbo jụrụ ajụjụ n'akara facebook ka ndị mmadụ kọọrọ anyị etu ọnọdụ 'sit-at-home' a si emetụta ha; ndị zitere ọsịsa ha maka ajụjụ a karịrị mmadụ 170, lee ihe ụfọdụ n'ime ha kwuru.
Anyị ahụsiela anya...

Ebe foto si, screengrab
Otu n'ime ndị ziteere anyị ozi kwuru na atụmatụ 'sit-at-home' emeela ka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa "dịzie ka ọhịa Sambisa".
Ọhịa sambisa bụ ebe ndị ọgụ nnupuisi Boko Haram ji mere isi ụlọọrụ ha na mpaghara Ugwu Naịjirịa; ọ bụ ebe anaghị aga aga ugbua.
N'ọdị nso a, na mpaghara Ọwụa Anyanwụ Naịjirịa, ọtụtụ akụkọ apụtala etu ndị ekperima si awakpo ndị mmadụ, na-emebi ngwaahịa ha, ma gbukwaa ụfọdụ, n'ụzọ iji manye ndị mmadụ ka ghara ịpụta iro n'ụbọchị Mọnde.
Nke a emeela ka egwu jide ọtụtụ ma mekwaa ka onye ọbụla na-anọdụ n'ụlọ kwa Mọnde ọbụla iji zọọ ndụ ya.
Onye ọzọ kwuru na ya bụ 'sit-at-home' emetụtala azụmahịa ya n'ụzọ ọjọọ. "Chukwu mezienụ ebere," ka onye ahụ aha ya bụ Chisom dere.
Henry, onye ọzọ tinyere ọnụ n'okwu ahụ, kwuru na "ala igbo dịzị ka oge agha...amaghị m na a na-ata ụdị ahụhụ a n'ala Igbo."
Otu nwaada aha ya bụ Adaobi Eze... kwukwara na ọnọdụ 'sit-at-home' "jọgburu onwe ya, o butekwara ihe ọjọọ dị icheiche n'ala Igbo. Ọ dịghị mụ mma chaachaa."

Ebe foto si, screengrab
Ọdịchaghị mma, mana...

Ebe foto si, screengrab
Ụfọdụ kwukwara na ọnọdụ 'sit-at-home' adịghị mma maka azụmahịa ha, mana ha nabatara ya dịka ọ bụ iji gosi iwe ha maka njide gọọmentị jidere Mazi Nnamdi Kanu.
Otu onye aha ya bụ Eze kwuru sị: "...ọ bụrụgodi na o nwere etu o si emetụta azụmahịa anyị, nsogbu adịghị ya..."
Ọ kọwara na ebe ọ bụ na Mazi Nnamdi Kanu ka nọ n'ụlọ mkpọrọ, na ọ dị mma ka 'sit-at-home' gaa n'ihu.
Prince Anakwe kwukwara ihe yitere nke Eze kwuru.
Ọ sị na ọ bụrụ na onyeisiala Naịjirịa atọhapụ onyendu Mazi Kanu, udo ga-adị, "ndị Igbo ga-akwụsị elelebe eje ọrụ n'ala Igbo".
Anyị jizi Mọnde ezu ike...

Ebe foto si, Screengrab
Ụfọdụ ndị ọzọ kwuru na 'sit-at-home' dị ha ahụ mma, maka na o nyekwuola ha otu ụbọchị n'izuụka iji zuo ike.
Chukwunenyenwa kwuru na ọ chọrọ ka 'sit-at-home' dịrịzie gawa ruo mgbe ebighịebi. "Ọ bụzi ngwụcha izuụka anyị ugbua," ka o kwuru.
Ifeanyi Agugbue kwuru na ọnọdụ 'sit-at-home' egosila na ndị Igbo abụghị ndị hụrụ ego n'anya karịa ndụ ha.
"Satọde, Sọnde, na Mọnde bụzi 'weekend'. Ihere megbuo ndị niile na-asị na Igbo anaghị eji otu obi eme ihe, ma na-asịkwa na e dobe ego debe ndụ, onye Igbo ga-achụwa ego hapụ ndụ," Agugbue dere.
Ihe 'sit-at-home furula mpaghara Ọwụwa Anyanwụ

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ọtụtụ ndị mmadụ atụfuola ndụ ha n'ihi atụmatụ 'sit-at-home', maka na ụfọdụ ndị ekperima na-akpagharị n'ebe dị icheiche kwa ụbọchị Mọnde, na-awakpo ndị pụtara ịchọ ihe ha ji enyere ndụ ha aka.
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ka ọnọdụ 'sit-at-home' mere ka ha ghara isonye n'ule akwụkwọ dị icheiche, dịka Waec, Neco, na Jamb.
Onwebeghị nnyocha miri emi e mere iji chọpụta ego ole na-efulahụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ihi atụmatụ 'sit-at-home' nke a gaferela otu afọ.
Mana ụfọdụ ndị ọnụ na-eru n'okwu nakwa ndị ọkachamara n'okwu akụnụba ekwuola na ọtụtụ ego na-efulahụ gọọmentị nakwa ndị mmadụ n'ihi sit-at-home'.
N'ọnwa Sepụtemba 2021, Moses Ezukwo, bụ osote onyeisi otu a kpọrọ 'Nnewi Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture' (NCCIMA), gwara ụlọ ntaakụkọ 'Daily Independent' na ego ruru ijeri naịra iri ise (N50 billion) efulahụla mpaghara Abia, Anambra, Ebonyi, Enugwu na Imo, n'ihi sit-at-home.
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ David Umahi, kwukwara na ụbọchị Mọnde ọbụla ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ n'ala Igbo, Najirịa na-atụfu ego ruru ijeri naịra iri (N10 billion).









