Ihe D’banj kwuru maka ebubo nzufu ego gọọmentị nọ n'isi ya

Ebe foto si, iambangalee/Instagram
D'banj onye ụlọọrụ a na-enyocha nrụrụaka, mpụ na okwu ndị nyiri ha na Naịjriịa bụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) tọhapụrụ n'abali itolu nke ọnwa Disemba ezipụtala ozi banyere ebubo nọ n'isi ya, nwụchi nakwa ntọhapụ ya.
A nwụchiri n’ụbọchị Tuzde maka ebubo nzufu ego gọọmentị nke n’atụmatụ N-Power.
N'ozi o zipụtara n’akara Instagram ya na Fraịdee a, o kwuru “enweghi ihe jịkọrọ mụ na nzufu ego, naanị ikpori ndụ ka m ma”.
“A tọhapụrụ m dịka m pụtara gosi ụlọọrụ a onwe m, enweghi ihe ha hụrụ n’aka.”
Ọ gbara ama na ọ bụrụla onye nweereonwe ya ugbua.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1

Ebe foto si, Pelumi Olajengbesi
Etu e si tọhapụ ya
A tọhapụla D’banj bụ onye ụlọọrụ a na-enyocha nrụrụaka, mpụ na okwu ndị nyiri ha na Naịjriịa bụ Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission (ICPC) nwụchiri n’izu a.
Ọkaiwu ya bụ Pelumi Olajengbesi gbara ama nke a na soshal midia ya n’ụbọchị Fraịdee dịka ọ kesara foto na-egosi ebe D’banj nọ n’azụ otu ụgbọala.
Olajengbesi kwuru na a tọhapụrụ maka na ọ bịara zara oku a gosi ụlọọrụ ahụ onwe ya.
Cheta na ụlọọrụ ICPC gbara BBC ama n'ụbọchị Tuzde na ha nwụchiri otiegwu a ma ama dịka D’Banj.
Ụlọọrụ a kwuru na ha nwụchiri Daniel Oyebanjo (D’Banj) n’okwu metụtara nzufu ego nke atụmatụ gọọmentị etiti wepụtara a kpọrọ N-Power Programme.
Atụmatụ N-Power a so na atụmatụ Onyeisiala Muhammdu Buhari wepụtara n’ebe mmalite ọchịchị ya n’afọ 2016 iji nyere ndị ntorobịa na-enweghị ọrụ aka ma wulite ọdịmma ndụ ndị mmadụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1

Ebe foto si, Dbanj/Facebook
Kedụ ihe ICPC kwuru na D’Banj mere?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
N’ozi nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Azuka Ogugua, binyereaka, ha kwuru na:
“Dịka ọrụ anyị siri dị, anyị anatala ọtụtụ mkpesa banyere nzufu ego ruru nde kwuru ijeri naịra dịka gọọmentị etiti binyereaka ma wepụta ego ndị ahụ ka ha ruo n’aka ndị na-enweghị ka ọ hara ha”
“Ọtụtụ n’ime ndị kwesiri irite uru n’atụmatụ a ezitereala anyị ozi na-ekwu na ego anaghị abata n’ọba ego ha agbanyeghị na gọọmentị na-ekwu ha akwụọla ha ụgwọ ha.”
“Ụlọọrụ ICPC akpọọla ihe ruru mmadụ 10 oku ka ha zara ọnụ ha n’ihe gbasara nzufu ego a mana e mechara nye ha ohere ka ha si n’ụlọ na-abịa ikpe okwu a.”
“Anyị kpọrọ Maazị Oladipo Daniel Oyebanjo oku ugboro ugboro ka ọ bịa zara ọnụ ya maka ọ kpọrọ ekwu nkụ ghara ịbịa.”
Ha gara n’ihu kwuo na D’Banj mechara were aka ya bịa isi ụlọọrụ ha nke mere ha jiri nwụchie ya n’ụbọchị Tuzde bụ ụbọchị isii nke ọnwa Disemba 2022.
ICPC kwuru na Oyebanjo na-enyerezi aka n’ọrụ nnyocha ha na-eme ugbua n’okwu ebubo nzufu ego ndị a.
Ha kwukwara na nnyocha ha metụtara ndị kwesiri irete uru n’aka atụmatụ ahụ, ụfọdụ ụlọakụ, nakwa ndị ọzọ ya bụ okwu dakwasiri.

Ebe foto si, Dbanj/Facebook
Gịnị jịkọrọ D'Banj na atụmatụ N-Power a?
N’otu ozi ọ zipụtara n’akara Instagram ya n’ụbọchị 24 nke ọnwa Ọọgọst 2021, D’Banj kwuru na ọ bụ otu n’ime ndị nnọchịteanya ya bụ atụmatụ N-Power dịka ọ bụ onye a ma ama.
N’ozi ahụ, o dere “A na m ekpughe agba BATCH C1 nke atụmatụ a so n’ime ọrụ ụlọọrụ NSIP”
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Ọ kesara foto emume ebe e mere ya bụ mkpughe dịka o kwuru “A ga-ahọpụta ndị ntorobịa mmadụ otu nde ma nye ha ego N30,000 kwa ọnwa ruo otu afọ dịka a ga-enye ha ọzụzụ n’ọrụ ọbụla ha họọrọ.”
Mana gọọmentị etiti site na Ministri na-ahụ maka enyemaka ndị mmadụ bụ Federal Ministry of Humanitarian Affairs ezipụtala ozi gọpụ onwe ha na mmekọ ọbụla maọbụkwanụ njịkọ ọbụla n’ebe D’Banj nọ.
Ministri bụ ndị ọrụ N-Power nọ n’aka kwuru na D’Banj bịara naanị ya bụ emume na ọ bụghị onye nnọchịteanya ha.
Minista na-ahụ maka enyemaka ndị ọdachị zutere bụ Sadiya Farouq kwuru “Biko leghara ozi ọbụla na-ekwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

Ebe foto si, Dbanj/Instagram
Onye bụ D'Banj?
- Oladapo Daniel Oyebanjo nke ọtụtụ ji aha D’banj mara bụ onye Otiegwe, bụrụ onye na-ahazị egwu ma bụrụkwa onye ọgba mbọ n’ọrụ iji ego achụ ego.
- Ụfọdụ jikwa aha ‘Kokomaster’ maọbụ ‘Bangalee’ mara ya
- Ọ bụ onye Ogun steeti
- A mụrụ ya n’ụbọchị itoolu nke ọnwa Juun, n’akụkụ Zaria, Kaduna steeti
- N’afọ 2005, o wepụtara nchịkọta egwu ya nke mbụ nke isi okwu ya bụ ‘No Long Thing’.
- Ya na ogbo ya bụ Don Jazzy bụ ndị hazịri egwu nchịkọta egwu n’okpuru otu nchikọta egwu nke Mo'Hits label mgbe ahụ.
- Ọ malitere asọmpị ihe onyonyo pụrụiche a kpọrọ ‘koko mansion’ n’afọ 2009 ma meche mee agba nke abụọ asọmpị ahụ n’afọ 2014.
- N’afọ 2010 ya na Otiegwu mba Amerịka a ma ama bụ Snoop Dogg tịkọrọ egwu ọnụ dịka n’afọ 2011 ya na ụlọọrụ G.O.O.D. Music label bụ nke Otiegwu mba Amerịka ọzọ, Kanye West nwere nkwekọrịta ịrụkọ ọrụ ọnụ.
- N’otu afọ ahụ, o wepụtara egwu ya kacha wuo ewu bụ “"Oliver Twist”, ya bụ egwu bịara bụrụ mmaṅụ anụ na ntị ndị mmadụ n’akụkụ Afrịka, Amerịka nakwa Yuropụ.
- Ugbua, o nwere ụlọọrụ nhazị egwu nke ya bụ DB Records.
- Ọ lụọla nwunye nke aha ya bụ Lineo Didi Kilgrow dịka ha abụọ ji ụmụ abụọ ugbua.









