Gịnị mere ndị uweojii ji ekonye mwakpo ụlọọrụ Inec n'isi Ipob? - Emma Powerful

Ọnụ na-ekwuru ndị otu Indigenous People of Biafra bụ Emma Powerful etiela mkpu na aka Ipob adịghị na mwakpo a na-awakpo ụfọdụ ụlọọrụ ndị Inec dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ, mana ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-achọ imetọ aha Ipob site n'ibo ha ebubo na ọ bụ ha na-eme mwakpo ahụ.
Powerful kwuru nke a site n'ozi o ziteere BBC Igbo n'ụtụtụ Tuzde, ma kwukwaa na ha bụ ndị Ipob ga-achọpụtarịrị ndị ekperima ji aha ha na-achọ ịkụsa ntuliaka Naịjirịa nke afọ 2023.
"Ntuliaka nke a ga-eme na Naịjirịa na 2023 agbasaghị Ipob," Emma Powerful kwuru. "Anyị anaghị akwado nke anyị ji achọ ịkụsa ntuliaka ọbụla, n'ihi na ọgbaaghara abụghị etu anyị si eme ihe."
"Gịnị mere ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ji agba mbọ oge niile imetọ aha Ipob?"
"Onwebeghị otu mgbe ndị uweojii Naịjirịa mere nnyocha ọbụla gbasara mwakpo niile ndị a ha na-ebo n'isi ndị Ipob."
"Onyendu anyị bụ Mazi Nnamdi Kanu ekwuola ugboro ugboro na onweghị onye o nyere iwu ime mwakpo ọbụla n'aha ya, ya mere onye ọbụla akpọla aha Ipob na mwakpo ụlọọrụ Inec nke mere n'Imo steeti."
"Ipob bụ otu na-agbaso ụzọ iwu iji chọta nnwereonwe Biafra. Anyị abụghị ndị mpụ maọbụ ndị ekperima, anyị esokwaghị na ndị na-aghasa ntuliaka."
Mwakpo ụlọọrụ Inec n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa

Agụgọ a ndị Ipob na-agọ bụ maka etu e si awakpo ụlọọrụ ngalaba na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Inec, n'okpuru ọchịchị dị icheiche na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
N'ime izuụka gara aga, awakporo ụlọọrụ Inec dị n'Orlu nakwa nke dị n'isi ụlọọrụ Oru-West, n'Imo steeti, ma gbaa ya ọkụ.
Bido n'ọnwa Mee 2021 ruo ugbua, awakpola ụlọọrụ ndị Inec n'Izzi, Ebonyi Steeti, nke dị na Ahiazu Mbaise, nke dị n'Igboeze, Enugwu steeti, nakwa nke dị n'Awka, Anambra steeti.
N'ime ha niile, onweghị nke ndị ọrụ nchekwa jidere ndị mere ya bụ mwakpo, mana ha kwuru na nnyocha ha mere gosiri na ọ bụ ndị Ipob/ESN na-eme mwakpo ndị a.
N'ihi oke mwakpo ndị a, n'ụbọchị 11 nke ọnwa Nọvemba, Inec kpọrọ ọgbakọ nke ndị isi ọrụ nchekwa niile dị na Naịjirịa sonyere na ya, iji mara ihe a ga-eme maka ya.
N'ọgbakọ ahụ, onyeisioche Inec bụ Yakubu Mahmood kwuru na ọ bụrụ na ụdị mwakpo a mere na-aga n'ihu, o nwereike imetụta nhazi ntuliaka 2023, maka na Inec agaghị enwe ohere idoghachi ihe ndị e mebiri emebi n'ụlọọrụ ha bụ ndị a wakporo.









