Atọhapụla ndị e chere bụ ndị IPOB anwụchiri kemgbe afọ 2020

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Naijirịa atọhapụla ndị e chere bụ ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) ndị agha Naịjiria nwụchiri kamgbe ụbọchị 27 nke ọnwa Febrụwarị afọ 2020, na mpaghara Imo Riva nke Abịa Steeti.
Ndị a bụ Sunday Nwafor dị afọ 59, Uzonwanne Ejiofor dị afọ 48 na Wilfred Dike dị afọ 36 enwerela onwe ha dịka ha nọ na 14 Brigade ndị agha Naijirịa dị n'Ohafia, Abia Steeti.
N'otu aka ahụ ka otu Amnesty International na-ekwu na ha nabatara ya bụ ntọhapụ.
N'akwụkwọ ozi ha depụtara n'abali wenezde, ha kwuru ka gọọmentị Naijirịa kwuputa ebe ndị ọzọ a na-achọ achọ na ndị anwụchiri a na-anụbeghị maka ha nọ.
Ha kwukwara ka ha nye ezinaụlọ ha nakwa ndị ọkaiwu ha ohere ịhụ ha, kpụpụ ha ụlọikpe maọbụ tọhapụ ha ma ọ bụrụ na a chọtaghị ihe n'aka ha.
Akụkọ ka na-abịa.
Kedụ ndị bụ ndị Ipob?
Ipob nke pụtara Indigenous People of Biafra bụ otu Nnamdi Kanu hiwere dịka ọ na-agba mbọ ịchọta nwereonwe Biafra.
Ya bụ otu bụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ka otu kacha akpaike.
Gọọmentị Naijirịa amchiela ya bụ otu ma kpọọ ya otu oyiegwu.
Ebe ndị Ipob na-ebo gọọmentị Naijirịa ebubo ịgbagbu ndị bị na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijirịa ebe ndị Igbo juputara.
Kanu mechara kewapụta nke ọ kpọrọ Eastern Security Network bụ ESN n'aha ịchafụ nke ọ sị na ọrụ ha bụ ịchụpụ ndị ọchiehi o siri na-wakpo ma na-akpa nkata ịwakpo ọwụwa anyanwụ.
Kedụ ndị bụ ESN?
Cheta n'ọnwa Disemba afọ 2020, Nnamdi Kanu malitere otu ọrụ nche o kwuru ga-echekwa Ọwụwa Anyanwụ megide mwakpo ndị ọ nke ọ kpọrọ 'Eastern Security Network'.
Malite mgbe ahụ rue ugbua, tigbuo zogbuo rịrị eru n'a mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ụdị a hụbeghị mbụ ma e wezuga n'oge Agha Biafra( 1967-1970).
A gbazaala ọtụtụ ogige ndị uweojii na ụlọ ndị nkịtị ọkụ ma gbusịa ọtụtụ ndị uweojii na ndị Igbo nwere agba.
Ndị ọrụ nchekwa nakwa Gọọmentị Naijiria eboola Ipob na ESN ebubo ịbụ ndị na-akpa arụ ndị a ahụ n'ala Igbo mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.









