Etu anyị si rụpụta ogbunigwe e ji lụọ agha Biafra - Felix Oragwu

Aha onyonyo, Etu anyị si rụpụta ogbunigwe e ji luo agha Biafra - Felix Oragwu
Etu anyị si rụpụta ogbunigwe e ji lụọ agha Biafra - Felix Oragwu
    • Onye dere ya, Uche Akolisa & Vinning Ogu & Joseph Jegede
    • Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist & video journalists

Dkta Felix Oragwu bu ihe Bekee kporo "nuclear physicist" ma burukwa onye nkuzi na mahadum University of Nigeria Nsuka tupu Agha Biafra adaa.

O bukwa onyeisi otu Scientific and Technology Group, bu otu ndi sayentist na inginia no na mahadum 'University of Nigeria Nsukka' na ụlọakwụkwọ ndị ọzọ dị elu nọ n' Ọwụwa Anyanwụ ochie hiwere oge Agha Bịafra malitere iji chọpụta ihe nka dị iche iche ha nyere ọgụ ahụ aka.

Ọ bụ otu ahụ nke e mechara gụgharịa aha ka ọ zawa RAP (Research and Production) rụputara "Ogbunigwe" nke ndị agha Biafra ji yie ndị nke agha Naijiria egwu n'oge agha ahụ.

Felix Oragwu
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Na mkkparitauka BBC Igbo na Oragwu nwere na nso nso a, o kwuru na e wezuga Ogbunigwe ndị ha rụpụtara na Agha Biafra agaghị akarị otu onwa n’ihi na ọ bụ Ogbunigwe ahụ nyere ndị Biafra agbamaume ịlụ agha ruo ọnwa 30.

Ọ kọwara etụ nwalee ya bụ ngwaọgụ si chọọ ịta isi ya nakwa etụ ha si jiri ya menye dị agha Naijiria ụjọ n'Amansea, Ọka, ebe aha ahụ "Ogbunigwe"si nakwa ihe ndị ọzọ.

Kirie ihe onyonyo nọ n’elu akuko a ka ị nụrụ ihe o kwuru n’uju.

Uche Akolisa, Vining Ogu na Joseph Jegede haziri akụkọ a.

Ndị agha Biafra
Akụkọ ndị ọzọ banyere Biafra
Felix Oragwu