Etu Alex Madiebo bụ dike Biafra si kpaa ike n'oge agha

Ebe foto si, Alex Madiebo
Onyeisiagha Biafra bụ Alex Madiebo alala mụọ ka ọ gbachara afọ 90.
Nwa ya nwoke bụ Richard Madiebo, gwara BBC Igbo na ọ nwụrụ n'ụtụtụ taa bụ Fraide, abalị atọ nke ọnwa Juun afọ 2022 ka ọ rịachara ahụ nwa oge.
" Nna m nwụru n'ụtụtụ a."
"Ọ rịarịa ahụ nwa oge. Ọ bụ onyeagha lụrụ ọgụ rue n'ọnwụ."

Ebe foto si, Alex Madiebo
Onyeagha, ma bụrụkwa onye na-ede akwụkwọ, Madiebo dere akwụkwọ banyere Agha Biafra bụ nke bụ 'The Nigerian Revolution And The Biafran War', nke o wepụtara n'afọ 1980.
Ndị Majọ Generalụ Madiebo hapụrụ na-eruru ya ụjụ bụ nwunye ya na ụmụ ya anọ.
Akụkọ ka na-abịa

Ebe foto si, Alex Madiebo
Onye bụ Alex Madiebo?

- Mejọ Generalụ Alexander Madiebo bụ ya bụ onye nke abụọ jiri ọkwa onyeisiagha Biafra, dịka a napụchara Lt Col Hillary Njoku ọkwa ahụ.
- Ọ banyere ọrụ ndị agha Naijiria n'afọ1954 oge ndịọcha ka na-achị ka ọ gụchara sekọndịrị na 'Government College' Umuahia.
- Ọ gara ọzụzụ ndịagha na Gana, Briten nakwa Amerịka.
- O so na ndị agha Naijiria mbụ ezigara mba Kongo maka ọrụ ikpe udo n'afọ 1960.N'afọ 1964, e mere ya onyeisi mbụ nke 'Artillery Regiment'.
- O si Ugwu Awụsa gbalaa ala Igbo dịka a na-egbusisi ndị Igbo na mpaghara ahụ.
- Naijiria chụrụ ya n'ọrụ agha mana Biafra nabatara ya nyekwa ya ọkwa ahụ o jibu na Naijiria.







