Biafra: Ihe mere Gowon jiri gbahapụ Aburi Accord - Major General Alexander Madiebo

Aha onyonyo, Biafra: Ihe mere Gowon jiri gbahapụ Aburi Accord - Major General Alexander Madiebo

Major General Alexander Madiebo bụ osote Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu, onyendu agha Biafra, n'agha Naịjirịa na mpaghara ala Igbo lụrụ site afọ 1967 ruo 1970.

Ọ kọwarala BBC Igbo ihe mere mgbe Ọchịagha Yakubu Gowon na Major General Chukwunaeme Odumegwu Ojukwu jiri ga Aburi dị na Gana maka ikpe udo agha Biafra. Ọ bụ otu ụzọ

Madiebo bidoro n'isi kọwaa etu nwegharị ọchịhị ike jiri bido na 1967. Ọ gwara BBC Igbo ka ndụ ya jiri nọrọ na ihe izendu. Ọ kọwarala BBC ka o si gbaa ọsọndụ n'oge agha Biafra n'ime abalị ka a kpọgara ya n'ụlọ ebe o bi na Kaduna.

Ọ sị na ogbugbu ndị Igbo n'igwe n'igwe bidoro n'afọ 1966 ka e gbuchara Sadauna nke na-achị Sokoto.

"O ruru abalị iri asatọ tupu ezinụlọ m a mara na a dị m ndụ maka etu ha si wee gbarie ụlọ ebe m bi na Kaduna"

O kwuru maka etu ndị ọgbara ọhụrụ na-achọ nnwereonwe Biafra.

Madiebo nyekwara ndụmọdụ etu Naịjirịa nwere ike ji zeere ọbịbịa agha ọzọ.

Onye bụ Major General Madiebo?

Alex Madiebo

Ebe foto si, Alex Madiebo

Mejọ Generalụ Alexander Madiebo bụ ya bụ onye nke abụọ jiri ọkwa onyeisiagha Biafra, dịka a napụchara Lt Col Hillary Njoku ọkwa ahụ.

Ọ banyere ọrụ ndị agha Naijiria n'afọ1954 oge ndịọcha ka na-achị ka ọ gụchara sekọndịrị na 'Government College' Umuahia.

Ọ gara ọzụzụ ndịagha na Gana, Briten nakwa Amerịka.

O so na ndị agha Naijiria mbụ ezigara mba Kongo maka ọrụ ikpe udo n'afọ 1960.

N'afọ 1964, e mere ya onyeisi mbụ nke 'Artillery Regiment'.

O si Ugwu Awụsa gbalaa ala Igbo dịka a na-egbusisi ndị Igbo na mpaghara ahụ.

Naijiria chụrụ ya n'ọrụ agha mana Biafra nabatara ya nyekwa ya ọkwa ahụ o jibu na Naijiria.

Alex Madiebo na Odumegwu Ojukwu

Ebe foto si, Alex Madiebo

Iji kọwaa uchu Madiebo n'oge agha, ọkachamara n'akụkọ ihe mere ochie bụ Ed Emeka Keazor sị, "Ọ bụ onye agha ọkaibe.

Ọ ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara ibu agha. Ọ bụ ya gbara nkịtị Achuzia ji kara ya aza aha ndị kpara ike n'Agha Biafra."

Mana Keazor kwuru na ụfọdụ na-ata Madiebo ebo ụta maka "egosighi olileanya" oge agha malitere.

Madiebo, onye so Ojukwu gbapụ ọsọ ndụ n'abalị 8 nke ọnwa Jenụwarị afọ 1970, ka dị ndụ ugbua.

O deela ọtụtụ akwụkwọ maka ihe anya ya hụrụ n'Agha Bịafra nke gụnyere "Nigerian Revolution and Biafran War".

Onye bụ Odumegwu Ojukwu?

Ojukwu

Ebe foto si, Getty Images

Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu bụ dike, Igbo ji eme ọnụ.

Ọ bụ onyendụ Biafra bụ mpaghara ndịda na ọwụwaanyanwụ Naịjirịa nke chọbụrụ ikewa.

Nke a butere agha malitere n'ụbọchị Mee 30 nke afọ 1967 bụ ụbọchị ọ mara ọkwa na Biafra bụzị mba aka ya, rue n'abalị asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 1970 bụ oge ọ gbapụrụ ọsọ ndụ ka o nyefechara ọchịchị n'aka osote ya bụ Philip Effiong.

Chukwuemeka Ojukwu bụ nwa ọgaranya a ma ama dịka Louis Odumegwu Ojukwu.

Emeka Ojukwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Emeka odumegwu Ojukwu duru ndị Igbo

Sir Louis Ojukwu bụ onyeisi mbụ "Nigeria Stock Exchange" ma bụrụkwa ojiegoachuego aha ya na-ada ụda oge ahụ, ha bụ ndị Nnewi, n'Anambara steeti.

A mụrụ Ojukwu na Zungeru dị na Niger steeti, mana ọ gara ụlọakwụkwọ sekọndịrị 'Kings College Legọọs' ebe ọ na-agụ tupu nna ya eziga ya ala Bekee.

Ọ gụrụ na mahadum Oxford mecha lagachị bịa sonye ndịagha Naijiria.

Ọ rịrị n'ọkwa ndịagha ngwa ngwa dịka ha chọpụtara na ọ gụrụ nnukwu akwụkwọ.

E mere ya govanọ ndịagha na-achị Ọwụwa-Anyanwụ, bụ ọkwa o ji tupu mweghara ọchịchị n'ike na ọgbaghara sochiri nke mere ndi Igbo ji si Ugwu Awụsa gbaa ọsọ ndụ gbalata ala Igbo.

Ojukwu bụ ya na Yakubu Gowon bụ binyere aka na nkwekọrịta 'Aburi Accord' bụ ebe Ojukwu tụrụ alo ka mpaghara ọbụla nọọrọ onwe.

Ọ nwụrụ n'abalị 26 nke ọnwa Nọvemba afọ 2011 ka ọ gbachara afọ 78.

Ihe i kwesịrị ịma maka agha Biafra

  • Agha Biafra bụ ọgụ mba Naịjirịa lụsọrọ ndị bị na mpaghara ọwụwaanyanwụ mgbe Mejọ General Ojukwu kwupụtara na Bịafra bụ obodo nnwereonwe ya si Naịjirịa pụta.
  • Jenụwarị afọ 1966 - Ndị agha ndị nwere obere ọkwa ( bụ ndị eboro na ọ bụ ndị Igbo kacha n'ọnụ ọgụgụ)weghara ọchịchị Naijiria n'ike
  • Jenụwarị afọ 1966- E mere Odumegwu-Ojukwu gọvanọ ndị agha nke mpaghara Ọwụwa Anyanwụ
  • Julaị afọ 1966- Ndị agha ọzọ nke Murtala Muhammed bu onye du ha weghara ọchịchị ike n'aka ndị agha ji ya, Yakubu Gowon were bụrụ onyeisiala
  • Site n'ọnwa Juun ruo Oktoba afọ 1966 - Ọgbaghara dapụtara n'Ugwu Awusa megide ndị Igbo, e gburu ọtụtụ nke mere ọtụtụ ndị Igbo jiri gbaa ọsọ ndụ gbala , Ala Igbo.
  • Mee afọ 1967 - Ojukwu kwupụtara nnwereonwe Biafra
  • Abalị isii nke ọnwa Jụlai afọ - Agha Biafra malitere
  • Ọktoba 1967 - Enugwu bụ isiobodo Biafra dara
  • Mee 1968 - Pọtakọt banyerre n'aka Naijiria
  • Eprelu afọ 1969 - Umuahia, nke bụụrụ isiobod Biafra ka Enugwu dachara , daara
  • Jenụwarị afọ 1970 - Ojukwu gbagara Iviri Kostu
  • Jenụwarị afọ 1970 - Biafra chịliri aka elu

Onye bụ General Yakubu Gowon?

Naịjirịa na ọgụ ndị ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Yakubu Gowon chiri Naíjiría dịka ọchịagha site n'afọ 1966 ruo 1975

Gowon bụ onye Angas si Lur, na Plateau steeti dị na mpaghara etiti Naịjirịa.

A na-akpọkwa ya Jack Gowon. Ọ bụ onyeisiala Naịjirịa bụrụkwa onyeisiagha site1966 ruo 1975.

A mụrụ ya n'Ọktoba 19 n'afọ 1934 na Pankshin, Plateau steeti.

Lur bụ mpekele obodo dị n'okpuru ọchịchị Kanke na Plateau steeti.

General Gowon dịka e siri kọwa gara ụlọakwụkwọ ndị agha na Naịjirịa, Briten na Ghana. Ọ bụụrụ onye agha Naịjirịa n'afọ 1954 ma nwerekwa nrite ugo ya nke abụọ dịka leftenant n'ụbọchị 19 n'ọnwa October, 1955.

N'ọnwa Jenụwarị 1966 ka ọ bụrụla onye kachasị bụrụ okorọbịa n'ime ndị agha, 31.

General Gown banyere ọchịchị n'aka ike ka ndị agha chụpụrụ ma gbuo Major Chukwuma Kaduna Nzeogwu bubu onyeisiala makwa onyeisiagha Naịjirịa chụpụrụ ọchịchị onyekwuuche ya na Naịjirịa.

N'afọ1966 ka ndị agha họrọla Gowon ka onyeisiala site 1966-1975.

Ndị mere akụkọ a: Adline Okere na Chiemela Mgbeahuru.