Ebe gọọmentị mba Finland kwụ ugbua gbasara mkpesa megide Simon Ekpa

Simon Ekpa

Ebe foto si, Embassy of Finland in Abuja/Simon Ekpa

Ụlọọrụ na-anọchite anya mba Finland na Naịjirịa ekwuola na ha enwetala mkpesa gbasara Simon Ekpa, onye ndị mmadụ na-ebo ebubo ịkpata ọgbaaghara na enweghị nchekwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ ndị mmadụ na soshal media malitere ime mkpesa, ma na-agbakwụnye akara soshal midia Simon Ekpa, iji kpọọ oku ka gọọmentị Finland tinye anya n'ebubo niile a na-ebo nwa amadị ahụ.

Oge BBC Igbo kpọtụụrụ ụlọọrụ nnọchite anya mba Finland na Naịjirịa iji jụọ ha maka mkpesa ndị a ndị mmadụ na-enye gbasara Simon Ekpa, otu onye ọrụ ha zara anyị sị: "Anyị anụla mkpesa ndị a, anyị ezigarala ha gọọmentị Finland ka ha leba ya anya."

Onye ọrụ a gwakwara BBC Igbo ka ha zite ozi na Email iji jụọ ọsịsa n'uju gbasara okwu. BBC ezigabuola ụdị ozi a na 'email' ma nweta ụsa nke kwuru na gọọmentị Finland na-etinye ya bụ okwu anya.

Gịnị mere ndị mmadụ ji eme mkpesa maka Simon Ekpa?

Mkpesa megide Simon Ekpa

Ebe foto si, Screengrab

Simon Ekpa bụ onyeisi otu kpọrọ onwe ha 'Auto-Pilot', nke si n'otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) kewapụ, mana o bi na mba Finland, bụ ebe ọ na-esi agbasa ozi ya.

Ọ bụ ya tinyere iwu 'sit-at-home' abalị ise na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa malite n'ụbọchị itoolu rụọ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Disemba 2022.

Nke a mere ka ndị ekperima na-akpagharị ma na-awakpo ndị mmadụ na-agara mkpa ha na steeti dị icheiche na mpaghara ahụ iji manye ha ka onye ọbụla ghara ịpụta ezi.

Mkpesa megide Simon Ekpa

Ebe foto si, Screengrab

Nkọwa foto, Mkpesa ndị mmadụ mere na Twitter megide Simon Ekpa

Ọzọkwa bụ na Mazi Ekpa ejirila akara soshal midia ya (Twitter na Facebook) gbasaa ozi ugboro ugboro nke ndị mmadụ kwuru na ọ na-ebute ọgbaaghara n'ala Igbo.

Iji maa atụ, Ekpa na-ekwu na agaghị enwe ntuliaka ọbụla na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ma ọ bụrụ na gọọmentị Naịjirịa atọhapụghị Nnamdi Kanu.

N'otu oge, Ekpa dere ozi iyi ndụ egwu na Twitter megide Joe Igbokwe, onye ndọrọndọrọ ọchịchị nọ na pati APC na Naịjirịa, mana Twitter mechara wepụ ozi ahụ.

Onye bụ Simon Ekpa?

Simon Ekpa

Ebe foto si, Simon Ekpa

Ihe gbasara ndụ Simon Ekpa edochaghị anya, mana ihe ndị a ma maka ya gụnyere:

  • Ọ bụ onye si n'okpuru ọchịchị Ohaukwu, dị n'Ebonyi Steeti
  • Dịka e si hụ n'ụfọdụ akwụkwọ ndekọ n'ịntaneetị, a mụrụ Ekpa n'ụbọchị 21 nke ọnwa Maachị 1985
  • Ọ nọchitere anya Naịjirịa n'asọmpi ọsọ na 2003 na mba Kamerun
  • O bi ugbua na mba Finland ebe ọ bụzi nwaafọ (citizen)
  • Ọ na-ekwu na ya sonyeburu n'otu ndịagha na Finland n'oge gara aga
  • O dere n'akara LinkdIn ya na o nwere nzere 'masters' na mmụta ọkaiwu

Ọtụtụ nnyocha egosila na ụfọdụ akụkọ Simon Ekpa kesara na soshal midia ugboro ugboro bụ akụkọ ụgha.