Twitter ewepụla ihe Simon Ekpa dere maka Joe Igbokwe

Ebe foto si, Simon Ekpa/Facebook
Ụlọọrụ Twitter ewepụla ihe Simon Ekpa dere n'akara Twitter ya banyere onye bụbu ọnụ na-ekwuru pati All Progressives Congress (APC) na Legọs Steeti bụ Joe Igbokwe.
Maazi Ekpa, bụ onye e ji ikwu okwu banyere nwereonwe mara dere n'akara Twitter ya sị ka Joe Igbokwe kwado maka ọnwụ ya.
O dere nke, dika o siri kọwa, makana ọ sị Maazị Nnamdị Kanu - bụ onyeisi Ipob ma bụrụkwa onye o na-akwado - ga-apụta na mkpọrọ ọ nọ.
Cheta na Maazị Igbokwe nwere ezigbote aṅụrị dịka gọọmentị Naịjirịa nwụchịrị Maazị Kanụ ma kpụpụ ya n'ihu ụlọikpe ka ọ ga zara ọnụ maka ebubo na ọ na-akpa nkata iji megide Naịjirịa.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Igbokwe sị na aṅụrị ya bụ makana Kanu asịla ka ndi otu ya gbuo ya na ezinaụlọ ya.
N'ihe Twitter dere n'elu ebe akụkọ ahụ kwesiri ịdị, ha sị na Ekpa dara iwu megidere ịkparị mmadụ.
Ha sị na inwe olileanya na mmadụ ga-enwe mmerụ ahụ so n'ime ihe e ji ada iwu na Twitter.
Twitter mechara gbochie ụfọdụ atụmatụ na Twitter Ekpa mana ka chi foro, ha nyere ohere ka ọ laghachie etu ọ dị mbụ.











