Anyị ejichiela ụfọdụ ndị na-ejichi naịra ọhụrụ - DSS

Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ha ahụbeghị ego naịra ọhụrụ a.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

  1. Etu ndị uweojii siri zụọ ndị otu ha mmadụ 612 maka ọrụ nchekwa pụrụiche n'oge ntuliaka

    Ndị uweojii Naịjirịa

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị uweojii Naịjriịa enyela ndị otu ha mmadụ 612 ọzụzụ n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche iji buso ndị otu nzuzu, ndị ntọrị nakwa ndị na-akpata tigbuo zọgbụọ n’oge ntuliaka agha ọkachasị dịka ntuliaka 2023 ji ọsọ abịa.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Muyiwa Adejobi kwuru nke a n’ozi o zipụtara n’ụbọchị 31 nke ọnwa Jenụwarị 2023.

    Ọ kọwara na ọzụzụ a pụrụiche nke mere n’akụkụ mpaghara isii Naịjirịa malitere n’ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị ma bie n’ụbọchị 18 nke ọnwa Jenụwarị. O kwukwara na ọ ọzụzụ bụ nke ndị uweojii na otu ụlọọrụ Wan Diyos jịkọrọ aka mee.

    Adejobi kwukwara na ha tinyere anya n’ọnọdụ nchekwa nke oge ndị gaara ma mee mụta.

    Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa bụ Usman Alkali Baba kọwara na ọzụzụ dị ezigbo mkpa ọkachasị ka oge ntuliaka nọzị anyị nso.

    Adejobi gara n’ihu kọwa na ọzụzụ a ga na-aga n’ihu maọbụladị ma oge ntuliaka gachaa dịka etu o si dị mkpa .

    Cheta na ọtụtụ akụkọ mwakpo esorola ntuliaka a. A wakpoola ụlọọrụ Inec, ndị ọrụ Inec, ndị nkwado ọtụtụ pati dị iche iche, ndị ọrụ nchekwa nakwa ụlọọrụ ndị uweojii n’akụkụ Naịjirịa dị iche iche n’oge a.

  2. Poopụ Francis efebatala mba DR Congo

    Mgbe Poopụ Francis wụchiri mba DR Congo

    Ebe foto si, AFP

    Nkọwa foto, Mgbe Poopụ Francis wụchiri mba DR Congo

    Poopụ Francis abatala Kinshasa nke DR Congo dịka ọ ga aga mba abụọ n’Afrịka na njem a.

    Ọ ga-edo massị n'obodo Kinshasa nke mba ahụ n’ụbọchị Wenezde dịka gọọmentị ha hibere ụbọchị ahụ ka ọ bụrụ ụbọchị ezumike nye ọha.

    Mba DR Congo bụ mba kacha nwee ndị na-eso okpurukperechi Kraịsti nke Roman Katọlịk n’Afrịka.

    Ọha ndị mmadụ mba ahụ pụtara zute ya maka ọbịbịa ya.

    Poopụ Franis ga-ahapụ mba ahụ gaa Saụt Sudan n’ụbọchị Fraịdee.

    Gụọ ihe ndị ọzọ banyere njem a ebe a.

    Ụfọdụ ndị pụtara izute Poopụ Francis

    Ebe foto si, AFP

  3. Etu ụlọakụ etiti siri dọtịa oge ịgbanwe ego ochie Naịjirịa

    New Naira

    Ebe foto si, Reuters

    Onyeisi ụlọakụ etiti Naịjirịa bụ Godwin Emefiele emechaala zaa oku ndị kọmịtịị ụlọ omeiwu nta kọpọrọ ya maka owu megharị ego Naịra Naijirịa usoro mgbanwe ya dịka ha na-eme nnyocha ụkọ ego ọhụrụ Naịra a.

    Emefiele onye nọ na-agwa ndị kọmịtịị ahụ okwu taa bụ Tuzde kọwara na ọ nọghị na Naịjirịa kemgbe nke bụ ihe mere ọ zaghị oku ha kpọrọ ya.

    Iza ajụjụ okwu megharị ego Naịra a, o kwuru na usoro ụlọakụ etiti bụ usoro ọtụtụ mba ndị ọzọ na-eso na ya bụ atụmatụ dịka o kwuru na ha nọ n’isi ọrụ nkesa ya bụ ego kemgbe.

    Emefiele kwuru na n'afọ 2015 ego ruru otu ijere Naịra na ụma bụ ihe kesara, mana na n'afọ gara aga, ọ riri elu ruo ijeri naịra atọ na iri atọ na atọ.

    Ọ kọwara na ihe mere e ji nye iwu na ndị ụlọakụ na-ekesa ego ọhụrụ a site na naanị igwe ATM bụ ịhụ na ebelatare ego ndị mmadụ nwereike ịdọrọ kwa ụbọchị.

    Emefiele kwetara na amụmatụ a nwereike ịkpatara ụfọdụ ndị mmadụ ihe mkpagbu mana o kwuru na ọ bụ maka ọdịmma Naịjrịa ọkachasị n'ibuso enweghị nchekwa agha.

    Ọ gara n’ihu rịọ ndị ụlọ omeiwu ka ha donyere atụmatụ a ukwu ka ọ nwee ike gaa nke ọma.

    Emefiele enweghiike zaa oku ndị omeiwu ahụ kpọrọ ya dịka o ziteere ha ozi site n'akwụkwọ ozi dị iche iche ma kọwaa na ọ nọ mba Amerịka maka ọrụ dị mkpa.

    Emefiele kwuru taa bụ Tuzde na ụlọakụ ndị nọ na Naịjirịa ga-agazi n'ihu na-anabata akwụkwọ ego naịra ochie ma oge ha tinyere maka ịgbanwe akwụkwọ ego ahụ gafeee.

    Cheta na ụlọakụ etiti nke Naịjirịa dọtiri oge ha tinyere maka ịkwụsị iji ego naịra ochie atụ mgbere ahịa ruo ụbọchị 10 nke ọnwa Febụwarị Emefiele kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n’ụbọchi Sọnde.

  4. Ndị nwụrụ n'ogbunigwe gbara na Pakistan eruola 92

    Ebe ogbunigwe gbara na Pakistan

    Ebe foto si, EPA

    Nkọwa foto, Ogbunigwe ahụ gbara n'ụlọ ekpere ndị ụka alakụba

    Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ na mwakpo ogbunigwe nke mere na mba Pakistan n'ụbọchị Mọnde eruola 91 dịka ndị ọchịchị mba ahụ si kwuo.

    Ogbunigwe a gbara n'ụlọụka ndị alakụba oge a na-ekpe ekpere n'ebe elekere mbụ na ọkara nke ehihie na mpaghara Peshawar.

    Nke a so n'otu mwakpo kacha njọ merela na mba Pakistan.

    Otu onye so n'otu Taliban nke mba Pakistan kwuru na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe ahụ, mana otu Taliban pụtara kwuo na ọbụghị ha kama ọ bụ ụfọdụ ndị si n'otu ha kewapụ.

    Otu Taliban nke Pakistan anaghị ekweta na ha na-awakpo ụlọ okpukperechi, ụlọ akwụkwọ nakwa ahịa, kama ọ bụ naanị ndị ọrụ nchekwa ka ha na-awakpo ọbụghị ndị nkịtị Pakistan, mana ọtụtụ mmadụ ekwenyeghị ihe na-ekwu.

    Ọtụtụ ndị nwụrụ na mwakpo a bụ ndị ọrụ nchekwa dịka akụkọ kwuru na ihe ruru ndị ọrụ nchekwa 300 maọbụ 400 nọ na mpaghara Peshawar oge ogbunigwe ahụ gbara.

    Ndị nwụrụ na mwakpo ogbunigwe na Pakistan
    Nkọwa foto, Eliela ndị uweojii 20 nwụrụ na mwakpo ahụ

    Praịm Mịnịsta mba Pakistan bụ Shehbaz Sharif tinyere taa bụ Tuzde dịka ụbọchị iru uju maka ndị nwụrụ na mwakpo.

    "Ndị oyi ndụ egwu chọrọ itinye ụjọ n'ime ndị mmadụ site n'ịwakpo ndị ọrụ ha bụ ichekwa Pakistan," Sharif kwuru.

    "Obodo anyị niile jikọrọ aka n'ịkatọ ndị na-eyi ndụ egwu. Ha anaghị alụrụ Islam ọgụ."

  5. Etu e si gbagbuo otu onye Ebubeagu n'Isu, Ebonyi Steeti

    Ebube Agu

    Ebe foto si, Ebube Agu

    Onyeisi ndị ọrụ nche 'Ebube Agu' n'Ebonyi Steeti, bụ Friday Nnanna Ujor, agwala BBC etu ndị ojiegbe si gbuo otu onye Ebube Agu n'ụbọchị Satọde, abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2023.

    Ujor nyere nkọwa a dịka akụkọ ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ onye Ebube Agu ji egbe gbagbuo onye Ebube Agu ibe ya.

    Ya bụ ihe mere n'Obodo Isu nke dị n'okpuru ọchịchị Ọnịcha, n'Ebonyi Steeti dịka ndị pati 'All Progressives Congress' na-eme emume ịchụ nta vootu ebe ahụ.

    Ujor kọwara na ọ bụghị eziokwu na ọ bụ onye Ebube Agu gburu onye otu ya kama ọ bụ ndị ojiegbe gbagburu onye Ebube Agu ahụ.

    "Ndị nọ ebe mwakpo a mere kwuru na ọ bụ ụmụ okorobịa nọ n'ime ụgbọala Sienna gbaguru onye otu anyị," Friday Ujor kwuru.

    "Ụgbọala ahụ nọgidere ebe ahụ na-eche ruo mgbe ndị mmadụ malitere ịla. Onye otu anyị duuru otu n'ime ndị ndọrọ ọchịchị ahụ na-apụta tupu ndị ojiegbe ahụ agbaa ya egbe ma gbafuo."

    Mazị Ujor kwuru na ha amalitela nnyocha maka ya bụ ihe iji chọpụta ma jide ndị mere mwakpo ahụ.

    'Ebube Agu' bụ otu nchekwa nke Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Davidi Umahi hibere iji nye aka wulite ọnọdụ nchekwa na Ebonyi Steeti.

    Otu jikọrọ ndị gọvanọ steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kpebiri ihibe otu nchekwa a bụ 'Ebube Agu', mana ọ bụ naanị Umahi na Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma gara n'ihu hibe ya.

  6. George Weah ekwupụtala na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala ọzọ

    George Weah

    Ebe foto si, EPA

    Onyeisiala mba Liberia bụ George Weah ekwupụtala na ya ga-azọ ọkwa ahụ ọzọ.

    Na mgbasa ozi ya n'ụbọchị Mọnde, Weah kwuru na ya "ga-abịakwa ọzọ ịrọ ụmụ Liberia ka ha nyekwa ya ụdị nkwado ha nyeburu ya afọ isii gara aga oge o meriri ntuliaka onyeisiala.

    Ntuliaka mba Liberia ga-adị n'ọnwa Ọktoba afọ a.

    Ụfọdụ na-akatọ ọchịchị George Weah ma na-ebo ha ebubo ịghasa akụnụba mba Liberia.

    N'afọ 2022, mba Amerịka nyere ụfọdụ ndị welitere isi na gọọmentị Liberia ntaramahụhụ n'ihi ebubo nrụrụaka, otu n'ime ha bụ onyeisi ndị ọrụ George Weah n'onwe ya.

    Na ngwụcha afọ 2022 kwa, ụfọdụ ndị Liberia katọrọ George Weah maka ịhapụ mba ya gawa Qatar ma nọọ ogologo oge iji kirie ma kwadoo nwa ya nwoke bụ Timothy, onye so ndị otu bọọlụ nke mba Amerịka gaa asọmpi Iko Mba Ụwa.

  7. Pope Francis agaala njem nleta na mba Congo DR na South Sudan

    Pope Francis

    Ebe foto si, AFP/GETTY IMAGES

    A na-atụ anya na Onyeisi ụka Katọlik bụ Pope Francis ga-agba ụkwụ na mba Congo DR taa bụ Tuzde dịka ọ malitere njem nleta na mba ahụ nakwa mba South Sudan.

    Congo DR bụ mba ebe ndị na-aga ụka Katọlik kacha n'ọnụ ọgụgụ na mpaghara Afrịka niile.

    Ndị ọchịchị mba Congo ekwupụtala na echi bụ Wenezde, Febrụwarị 1 ga-abụ ụbọchị ezumike n'isi obodo Kinshasa, iji nye ohere ka ndị ụka Katọlik sonye n'ofufe nru nke Pope Francis ga-edo n'ọdọ ụgbọelu Ndolo.

    Pope Francis tinyekwara ozi maka njem a n'akara Twitter ya ma rịọ ndị mmadụ ka ha cheta ya n'ekpere.

    Skip X post
    Hapụ X ihe dị na ya?

    Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

    Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

    End of X post

    Pope ga-anọ na Kinshasa ruo ụbọchị Fraịde tupu ọ hapụ Congo Dr gawa South Sudan.

    N'ebe ahụ ka ya na onyeisi ụka Anglịkan bụ Bishọp nke Canterbury nakwa onyeisi ụka nke Scotland ga-enwe ọgbakọ.

  8. Anyị ejichiela ụfọdụ ndị na-ejichi naịra ọhụrụ - DSS

    DSS

    Ebe foto si, DSS

    Ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa bụ Department of State Services (DSS) ekwuola na ha ejichiela ụfọdụ ndị na-ezo ego naịra ọhụrụ nke ụlọakụ etiti wepụtara, ma na-eresi ya ndị mmadụ n'oke ọnụ.

    Peter Afunanya bụ ọnụ na-ekwuru ndị DSS kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Mọnde.

    "Anyị chọpụtakwara na ụfọdụ ndịọrụ ụlọakụ dị icheiche so na ndị na-enye aka na-ejichi ma na-erekwa ego naịra ọhụrụ a," Afunanya kwuru.

    "Anyị na-adọ ndị ọzọ ka na-eme ụdị ihe a aka na ntị ka ha sepụ aka na ya bụ agwa ọjọọ."

    Afunanya rịọkwara ngalaba gọọmentị ndị ọzọ ka ha tinye aka n'ịkwụsị ụkọ ego naịra ọhụrụ a bụ nke ụfọdụ ndị ụlọakụ na-ezupu ma na-ere n'ahịa.

    "Anyị enyela ndị ọrụ anyị na steeti dị icheiche iwu ka ha chọpụta ma jichie ndị niile na-ere ego naịra ọhụrụ ere.

    "Onye ọbụ nwere ozi gbasara etu anyị ga-esi mee nke a nwereike iwegara ndị ọrụ nchekwa ya bụ ozi," Afunanya kwuru.

    Cheta na ụlọakụ etiti bugharịrị ụbọchị ha tinyeburu maka ịkwụsị iri ego naịra ochie site n'ụbọchị 31 nke Jenụwarị ruo ụbọchị 10 nke Febrụwarị.

    Ha nyekwara abalị asaa ọzọ - malite na Febrụwarị 10 ruo Febrụwarị 17 - ka ndị ka ji ego ahụ n'aka ha gaa gbanwee ya n'ụlọọrụ ụlọakụ etiti ọbụla dị ha nso.

  9. Ụtụtụ ọma

    Ị saala chi.

    Ndewo dịka ị na-esonye anyị taa.

  10. Etu ndị ojiegbe si wakpo ọgbakọ oriri na nkwari gbuo mmadụ asatọ

    Akara ndị uweojii mba Saụt Afrịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Ndị ojiegbe egbuola mmadụ asatọ n'ebe a na-eme ọgbakọ oriri na nkwari maka ncheta ọmụmụ ma gbuo mmadụ asatọ na mgbede ụbọchị Sọnde.

    Ihe a mere n'ebe a na-akpọ Gqeberha - e jibu Port Elizabeth mara - nke dị na mpaghara 'Eastern Cape Province' nke mba Saụt Afrịka, dịka ndị uweojii mba ahụ si kwuo.

    Onye nwe ụlọ ebe a na-eme ọgbakọ ahụ so na ndị nwụrụ na mwakpo a ebe mmadụ atọ ọzọ ka mgbọ egbe merụrụ ahụ.

    Bheki Cele, bụ mịnịsta na-ahụ maka ndị uweojii na mba Saụt Afrịka, na onyeisi ndị uweojii bụ Fannie Masemola, ga-aga njem ịga mara ihe mere kpọmkwem etu mwakpo a si mee.

    Onwebeghị onye ọbụla a nwụchiri maka mwakpo a mana nnyocha amalitela dịka ndị uweojii si kwuo.

  11. 'Ihe anyị ga-eme ma anyị bụrụ Gọvanọ Legọs steeti' - ndị bịara nrụrịtaụka The Platform

    Ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ na Legọs steeti

    Ebe foto si, Theplatformng/Twitter

    Ngalaba 'The Platform' hibere ntụtịtaụka n'etiti ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ na Legọs steeti n'abalị ụbọchị ụka n'Ikeja.

    Ndị bịara ya bụ mkparịtaụka bụ AbdulAzeez Adediran na-efe ọkọlọtọ PDP, Gbadebo Rhodes-Vivour na-efe ọkọlọtọ Labour Party nakwa Olufunso Doherty nke ADC.

    Aka na-achị Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu abịaghị na ya bụ ọgbakọ n'agbanyeghi na a na-atụ anya ya.

    Dịka onye chịkọtara ya bụ ọgbakọ sị kọwa, Gọvanọ Sanwo-Olu jụrụ ịbịa na ya bụ emume n'ihi na o nwere onye nọ na ya bụ ọgbakọ wakporo ndị nkwado ya nke mere na ha abụọ agaghị anọnwu n'otu ebe.

    AbdulAzeez Adediran, PDP

    AbdulAzeez Adediran, PDP

    Ebe foto si, @theplatformng/Twitter

    Onye na-azọ ọkwa Gọvanọ n'aha otu PDP ama dịka Jandor kwuru na ihe dị mkpa ọ ga-eme bụ ịtụgharị ndị agboro bụkwa 'Area Boys' ma mee ka ha bụrụ ngwa mwulite obodo.

    Ọ kọwara na nke a bụ iji belata oke ohi na mwakpo nke na-esikarị na 'Park' ụgbọala bus dị icheiche na Legọs apụtakarị.

    O kwukwra na ọ ga-arụ akwa okporoụzọ ije belata ahụhụ ahịrị ụgbọala bụ otu ihe e ji mara Legọs.

    Gbadebo Rhodes-Vivour, LP

    Gbadebo Rhodes-Vivour

    Ebe foto si, theplatformng/Youtube

    Rhodes-Vivour na-azọ ọkwa ahụ n'aha otu Labour Party kwuru na ọ ga-eme ka ndị ntorọbịa nweta ọrụ aka iji belata ịnọ nkịtị n'etiti ha.

    O kwuru na ndị ntorọbịa adịghị ume ngwụ dịka ndị mmadụ si eche kama ha chọrọ ohere ịrụ ọrụ ga-enwe isi nke mere na ọ ga-enye ha ọzụzụ pụrụiche ga-eme ka ịnweta ọrụ dịrị ha mfe.

    Ihe ọzọ o tinyere ọnụ na ya bụ ịwụlite ụzọ ụgbọ oloko iji mee ka mwulite obodo rue ebe niile na Legọs.

    O kwukwara na ọ ga-ekpochapụ ndị agboro kpam kpam na Legọs maka nsogbu nchekwa ha na-ebutekarị.

    Olufunso Doherty, ADC

    Olufunso Doherty

    Ebe foto si, theplatformng/Youtube

  12. Ụtụtụ ọma

    Ụnụ asaala chi ụmụ Igbo.

    Nke onye chiri ya zere o.

  13. Ihe mere ndị uweojii Kano ji nwụchịe nwaada a ma ama na Tik Tok bụ Murja Ibrahim Kunya

    Murja Ibrahim Kunya

    Ebe foto si, OFFICIAL_MURJA_KUNYA/INSTAGRAM

    Ndị uweojii Kano steeti agbaala ama na ọ bụ eziokwu na ha nwụchiri otu nwaada a ma ama bụ na-eji soshal midia ‘Tiktok’ agbasaozi maka okwu ịkpa agwa mkpalite ọghaghara n’ọha.

    Akụkọ na-ekwu na nwaada Murja Ibrahim Kunya so na ndị a kacha mara ma na-ewu ewu na soshal midia na mpaghara ugwu Naịjirịa.

    A nwụchiri ya n’ụlọ ndịna Tahir Hotel nọ na Kano steeti bụ ebe e kwuru ọ nọ na-akwụ ụgwọ aga eji nye ndị ọbịa ya ụlọ ndịna ha ga-anọ dịka ọ nọ na-akwado emume ụbọchị ncheta omumu ya.

    Ọ bụ n’ọnwa Sepụtemba gara aga ka Kọmịtii ndị isi ụka alakụba zigaara Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ akwụkwọ mkpesa na-arịọ ka a nwụchịe ya nakwa ụfọdụ ndị ọzo ji Tiktok agbasa ozi maka ebubo na ụfọdụ ihe onyonyo ha na-ezipụta megidere ụkpụrụ okpukerechi alakụba.

    Ha kwukwara na ihe onyonyo ndị a nwereike ịmetọ ọha.

    Otu n’ime onyeisi ndị uweojii na Kano bụ SP Abdullahi Haruna gbara BBC ama okwu nwụchi ya ma kwuo na ga-aga n’ihu nnyocha ya nke ọma.

    O kwuru

    “Ọ bụ eziokwu na anyị nwụchiri Murja, ọ nọ n’aka anyị n’ezie ugbua.”

    Otu n’ime ihe mere e jiri mara Murja ama bụ etu ihe onyonyo si dị iche n’ime ọtụtụ ndị na-esi mpaghara ugwu apụta ọkachasị dịka agwa nke ya na-egosi mesapụ ahụ nke ukwuu.

    Cheta na ndị uweojii na Kano anwụchibuola mmadụ abụọ ji TikTokagbasaozi n’afo 2022 dịka Ụlọikpe Majistrate dị na Kano nyere iwu ka a pịa haabụọ ụtarị iri abụọ, nye ha ịda nha puku naira iri nakwa ntaramahụhụ ịzachasị ogige ụlọikpe abalị 30 maka ebubo ịkparị Gọvanọ Abdullahi Ganduje.

    Ọkaikpe nọọrọ n’isi ikpe ahụ bụ Aminu Gabari kwuru na ntaramahụhụ ahụ ga-abụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị ọzọ.

    A nwụchiri ha maka ihe onyonyo ha wepụtara nke metụtara Gọvanọ steeti ahụ.

    N'ihe onyonyo ahụ ha wepụtara, mmadụ abụọ ahụ mere ihe ejiji nke gosiri otu n'ime ha ebe o gbanwere onwe dịka onye fechara ala nna ya na nsonso a ma boo ebubo na ndị mmadụ enweghị ntụkwasaobi na otu nwoke a kporo Ganduje nke ha kwuru na ejighị anya ahụ ala ndị mmadụ, na ọ hụ ya, o ree ya.

  14. Ndị ojiegbe agbagbuola ndị uweojii atọ n’Ebonyi steeti

    Ndị ojiegbe

    Ebe foto si, Getty Images

    Akụkọ apụtala etu ndị ojigebe bụ ụgbọala abụọ siri wakpoo ndị uweojii na-anọ okporoụzọ nke okeala Ebonyi steeti na Enugu steeti ma gbagbuo mmadụ atọ n’ime ha.

    Ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii Ebonyi steeti bụ Chris Anyanwu gbara ama nke a ma kọwa na ihe a mere n’ụbọchị Satọdee dịka ndị ọrụ ha n’ihu ọrụ.

    O kwuru na ihe a mere n’ebe ekelere isii nke mgbede dịka ndị a amabeghi ndị ha bụ bu ụgbọala ha kwaa ndị otu ya mgbọ aghara aghara.

    Ọ gbara ama na ọ bụ ndị ọrụ ahụike bụ ndị kwuru na ya bụ ndị anwụọla n’ezie.

    Kemgbe afọ ole m ole, nsogbu enweghị ezi nchekwa bịara selite isi ya n’akụkụ Ọwụwa anyanwụ Naijriịa. Otu ndị ojiegbe ndị iche iche pụtara na-atọ ndị mmadụ, awakpo ndị mmadụ ọkachasị ndị ọrụ nchekwa ma na-awakpo ma na-agbakwa ụlọ gọọmentị dị iche iche ọkụ.

    Gọọmentị dị iche iche na mpaghara ahụ na-agba mbọ ịdajụ ihe a na-eme mana ọnọdụ a ka na-aga n’ihu.

  15. Ndị ojiegbe egbuola ndị uweojii atọ n'Ebonyi Steeti

    Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ egbuola ndị uweojii atọ n'okporoụzọ ebe ha na-arụ ọrụ n'abalị ụbọchị Satọde, abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Jenụwarị 2023.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Ebonyị Steeti bụ Chris Anyanwu kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Sọnde, Jenụwarị 29.

    Anyanwu kwuru na mwakpo a mere n'okporoụzọ si Enugwu abata Ebonyi steeti.

    "Ndị ojiegbe a bu ụgbọala Sienna abụọ wee wakpo 'checkpoint' ebe ndị uweojii a nọ ọrụ ha ma malite ịkwa ha mgbọ.

    "Mgbọ tụrụ ndị uweojii atọ na mwakpo a ma mechaa nwụọ oge e bugara ha ụlọọgwụ."

  16. Lee oge ọhụrụ CBN tinyere maka ịkwụsị iji ego naịra ochie atụ mgbere na Naịjirịa

    Ego naịra ọhụrụ

    Ebe foto si, Presidency

    Ụlọakụ etiti nke Naịjirịa agbatịala oge ha tinyere maka ịkwụsị iji ego naịra ochie atụ mgbere ahịa.

    Onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara taa bụ Sọnde abalị 29 nke ọnwa Jenụwarị 2023.

    "Anyị na-enyekwa ụbọchi iri ọzọ, malite n'ụbọchị 31 nke Jenụwarị 2023 ruo ụbọchị 10 nke Febrụwarị 2023, ka ndị mmadụ, ọ kachasị ndị bi n'ime obodo nwee ohere ịgbanwe ego ochie ha ma nweta nke ọhụrụ," Emefiele kwuru.

    "Ọ gafee ụbọchị ahụ (Febrụwarị 10), mmadụ agaghị enwezi ike iji ego ochie tụọ mgbere ahịa na Naịjirịa.

    "Ndị ọrụ anyị na ndị ọrụ EFCC na ICPC na-agba mbọ ugbua ịhụ na atụmatụ a gara n'ihu."

    Emefiele kwukwara na CBN nyekwara ohere abalị asaa ọzọ, malite n'ụbọchị 10 nke ọnwa Febrụwarị ruo ụbọchị 17 nke Febrụwarị iji nye ohere ka ndị ka nwere ego ochie gaa tinye ya n'ụlọakụ, mana ha agaghị enwe ike iji ya tụọ mgbere ahịa.

    O kwuru na obi dị ha ụtọ na atụmatụ mgbanwe naịra mịtara mkpụrụ maka na ihe ruru pasentị 75 ego niile dịbu n'aka ndị mmadụ alọghachila n'ime ụlọakụ dịka ha tụrụ anya.

  17. Mgbanwe naịra bụ maka ndị zopuru nnukwu egọ - Buhari

    Buhari na Emefiele

    Ebe foto si, Presidency

    Onyeisiala Muhammadu Buhari agwala ụmụ Naịjirịa ka ha ghara ịtụ egwu maka mgbanwe naịra n'ihi na ọ gaghị emetụta ndị nkịtị n'ụzọ ọbụla.

    Buhari kwuru nke a site n'ọnụ Garba Shehu bụ onye enyemaka mgbasaozi ya, dịka akụkọ na-apụta maka etu ndị mmadụ si akwụ n'ogologo ahịrị iji kwụnye ego naịra ochie ha ma nweta nke ọhụrụ.

    "Onyeisiala kwusiri ike na mgbanwe akwụkwọ naịra bụ maka ndị zopuru ọtụtụ ego n'ebe dị icheiche, ọ bụghị maka ndị nkịtị," Garba Shehu kwuru.

    Shehu kọwara na atụmatụ a dị mkpa iji gbochie ego adịgboroja, nrụrụaka nakwa iji ego akwado ndị na-eyi ndụ egwu.

    O kwere nkwa na mgbanwe naịra ga-enye aka wulite ọnọdụ akụnụba Naịjirịa ma mee ka ọ kwụsie ike.

    Garba Shehu kwuru na ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nkịtị na-enwe ihe nhịahụ dị icheiche ugbua n'ihi na ha na-edebe ego n'ụlọ iji gboo ụfọdụ mkpa, mana gọọmentị agaghị agbahapụ ha.

    O kwuru na Ụlọakụ etiti nakwa ụlọakụ niile na Naịjirịa amalitela atụmatụ iji kesaa naịra ọhụrụ ngwangwa ka o rute onye ọbụla iji gbochie ọgbaaghara.

  18. Ụtụtụ ọma

    Igbo ndị ọma, ekele o.

    Ka izuụka a maara anyị niile mma.

  19. Inec adọtiala oge nweta ‘PVC’ ruo abalị ise nke ọnwa Febụwarị 2023

    Ndị mmadụ ka na-agba mbọ inweta akwụkwọ ikike itu vootu ha ruo taa bụ Satọdee.

    Ebe foto si, Getty Images

    Ụlọọrụ na-ahụ maka nhazị ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (Inec) amaala ọkwa na ha adọtịala oge ndị mmadụ nwere iji nwata akwụkwọ ikike ịtụ vootu ha bụ ‘PVC’ n’ịchafụ.

    Ọnụ na-ekwuru ha bụ Festus Okoye kwuru na Satọdee:

    “site na ozi anyị natarala na steeti dị iche iche nakwa mkparịtaụka anyị na ndị Kọmịshọna anyị bụ ndị ‘Resident Electoral Commissioners’, anyị ekpebiela ịgbatịkwu oge nweta PVC n'ụlọọrụ anyị niile nọ na Naịjirịa ma tụkwasị otu izu ọzọ n’elu oge anyị hibebụrụ. Nweta PVC ga na-aga n'ihu ruo ụbọchị ise nke ọnwa Febụwarị 2023.”

    Inec zubere nkwụsị nweta akwụkwọ a n’ụbọchị 29 nke ọnwa Jenụwarị mana ọtụtụ ndị mmadụ kpọrọ oku na-ekwu na ha enweghị ike nweta akwụkwọ PVC nke ha n’ihi etu igwe ndị mmadụ siri ju n’ụlọọrụ Inec nakwa ihe ndị ọzọ.

  20. Ụlọikpe amaala otu nwoke ikpe ọnwụ maka igbu mmadụ, were mgbịrịafọ ya sie awayị

    Ikpemkwụmọtọ

    Ụlọikpe Ukwu nke Rịvas steeti amaala otu nwoke ikpe ọnwụ maka igbu mmadụ anọ were mgbịrịafọ ha sie awayị n' Okwalie dị n’Okpuru Ọchịchị Khana na steeti ahụ.

    A kpụpụrụ Bestman Lekia bụ onye ya na ndị otu ya a ka na-achọ achọ tọọrọ ma gbuo; Gbodu Nobaale, Etim Ekpe, Nenalebarri Mmeabe na Loveday Mmeabe ụlọikpe maka ebubo ntọ, iji egbe ezu ohi nakwa iso na otu nzuzo.

    Lekie na ndị otu ya gburu Mmeable bọkasịa ya, were mgbịrịafọ ya sie ofe ose na ogede n’afọ 2019 dịka ụlọ ntaakụkọ Punch si kwuo.

    Ọkaikpe kpere ya bụ ikpe bụ Jọstịs Adolphus Enebeli mara Lekie ikpe maka ntọ, iji egbe ezu nakwa ịnọ n’otu nzuzo.

    Jọstịs Enebelu kwuru na agwa nwa amadi ahụ kpara oge ikpe ahụ na-aga gosiri nna ọ bụ omekome arụrụala taara nchara n’ahụ, kwesịrị ka a kwụgbuo ya ugboro anọ, ya anwụ ụgbọro anọ.