Gịnị na-akpata ahụ ọkụ? Kedụ mgbe ị ga-akpọ ya nnukwu ihe?

Ebe foto si, Getty Images
Mmadụ ọbụla na-enwe ahụ ọkụ oge dị icheiche. Ndị ụfọdụ ka ekpomọkụ ahụ ha na-agbago maọbụ na-agbadata ugboro ugboro n'ime otu ụbọchị.
Mana gịnị na-ebute ahụọkụ, kedụkwanụ etu ị ga-esi mata na ekpomọkụ ahụ gị arịala elu nke ukwu nke na ị ga-achọ enyemaka?
Akụrụngwa nke na-ahazi ekpomọkụ ahụ mmadụ dị n'akụkụ ụbụrụ a na-akpọ 'hypothalamus', ọ bụ ya na-enye aka ijikwa ekpokụ akpụkpọ ahụ nakwa ọbara mmadụ.
Ahụ ịma jiji bụ ụzọ ahụ mmadụ ji eme ka ekpomọkụ gbalite n'oge oyi na-atụ, ebe ọsụsọ na-apụta iji mee ka ahụ mmadụ jụlata oyi n'oge oke ekpomọkụ; ihe ndị a bụcha ụzọ ahụ mmadụ si echekwa onwe ya.
Kedu mgbe a na-asị na mmadụ nwere ahụọkụ?

Ebe foto si, Iwaria
Onye ọbụla ekpomọkụ ahụ ya gafere degree 'Celcius' 37 maọbụ degree 'Fahrenheit' 98.6, bụ onye a ga-ekwu na o nwere ahụ ọkụ.
N'ahụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise, ekpomọkụ ruru degree 'Celcius' 38 bụ nnukwu ahụọkụ nke bekee na-akpọ 'high fever'.
Ọtụtụ ihe dị icheiche nwereike imetụta etu ekpomọkụ ahụ mmadụ si agbago maọbụ gbatuo.
- Ihe ndị a gụnyere:
- Afọ ole mmadụ dị
- Okike (nwoke maọbụ nwaanyị)
- Ebe mmadụ nọ
- Oge ụbọchị
- Ọnọdụ ihu eluigwe, dgz
Ahụ mmadụ na-aka ajụ oyi n'ebe isi ụtụtụ, ma kara ekpo ọkụ n'ebe ehihie.
Ọzọkwa bụ na ekpomọkụ na-agbali elu n'ahụ ụmụnwaanyị ma ha nọrọ na nsọ ha, maọbụ oge nsọ ha ruwe nso.
Ndị merela agadi na-aka enwe ahụ njụ oyi, ya mere o ji dị mkpa ime ihe ngwangwa ma onye agadị nwee ọbụladị ntakịrị ahụ ọkụ.
Ihe nwereike ịkpata ahụọkụ
Ọrịa dị icheiche nwereike ibutere mmadụ ahụ ọkụ. Nke a gụnyere:
- Nje si na 'virus'
- Nje si na 'bacteria'
- Ọrịa dịka ịba na ndị ọzọ
- Ọrịa ahụ mmadụ ibuso onye ahụ agha (autoimmune disease)
- Ịgba ọgwụ mgbochi
- Ọrịa Cancer dị icheiche
- Oke ekpomoku ihu eligwe ọ kachasị n'oge ọkọchị
Oge ụfọdụ ka ihe dịka etuto na-apụta mmadụ n'akụkụ ọnụ, onye ahụ echee na ọ bụ ahụọkụ kpatara nke a, mana ọbụghị eziokwu.
Ihe na-akpata ihe dị otu a bụ ọrịa nje 'virus' nke pụtara ihe n'ihi na akụrụngwa na-ebuso nje agha n'ahụ mmadụ, a kpọrọ 'immune system' gbaturu ala.
Ọ bụrụ na mmadụ na-eri nri na-edozi ahụ dịka akwụkwọ nri na mkpụrụosisi, 'immune system' ya gbalite, ihe ndị ahụ ga-ala.
Etu ị ga-esi jikwaa ahụ ọkụ

Ebe foto si, Iwaria
Ọ bụrụ na mmadụ nwee ahụ ọkụ, ọ dị mkpa ka e jikwaa ya ngwangwa, ma ọ bụghị ya, mmiri dị mmadụ n'ahụ nwereike ịgbatu.
Ọ bụrụ na ahụ ọkụ na-anọte aka, ọ na-esiwanye ike ịkwụsị ya, ọ kacha n'ahụ ụmụaka na ndị agadi.
- Na-aṅụ mmiri nke ọma iji gbochie mmiri dị gị n'ahụ ịgbatu (dehydration)
- Ọ bụrụ n'ahụọkụ ahụ ka njọ, were akwa metụ na mmiri dị ṅarịṅarị ma hichaa ahụ gị iji jikwaa ekpomọkụ ahụ. Ejila mmiri oyi maka na o nwereike ibute nkụja (shock).
- Buru ụzọ hichaa aka gị na ụkwụ gị tupu i hichaa ahụ niile
- 'Paracetamol' bụ ọgwụ maka ahụọkụ
- Ọ bụrụ na ahụọkụ akwụsịghị n'ime abalị abụọ, gaa hụ dọkịta
- Aṅụkwala ọgwụ e ji egbu nje bakteria maka na ị mabeghị ihe kpatara ahụọkụ ahụ, ọgwụ 'antibiotics' na-ebute ike ọgwụgwụ karịa
Ọ bụrụ nwata ka ahụọkụ na-eme:
- Na-enye ya mmiri ọṅụṅụ
- Ọ bụrụ na ọ na-ekwe iri nri, nye ya nri
- Na-eleta ya ugboro ugboro dịka ọ na-arahụ ụra abalị
- Nye ya 'paracetamol', tulee akwụkwọ dị n'ọgwụ ahụ nke ọma iji mara ma ọ bụ ụdị ụmụaka nwereike ịṅụ
- Gaa ụlọọgwụ ngwangwa iji mata kpọmkwem ihe na-eme nwa gị
Ihe ndị ikwesịghị ime:
- Eyipụchala ya akwa ya niile ma chee na ọ ga-eme ka ahụ ya jụlata oyi
- Ejila ọtụtụ akwa kpuchie ya
- Ya nọrọ n'ụlọ, akpọgala ya ụlọ akwụkwọ
- Enyekwala nwata erubeghị afọ 16 ọgwụ 'aspirin
- Enyekọtala nwata ọgwụ paracetamol na ibuprofen
- Enyekwala nwata erubeghị ọnwa abụọ ọgwụ 'paracetamol'
- Enyela nwata erubeghị ọnwa atọ, maọbụ nwata ibu ya erughị 5kg ọgwụ ibuprofen
- Enyela nwata nwere ọnọdụ 'asthma' ọgwụ ibuprofen, ma ọ bụrụ na ọ bụghị dọkịta nyere ntuziaka
Ọ dị mkpa ịmata na ahụọkụ n'onwe ya abụghị ọrịa, kama ọ bụ ihe ngosi na mmadụ nwere ọrịa.









