World Malaria Day: Ihe Ị kwesịrị ịma maka ọgwụ mgbochi ọrịa ịba ọhụrụ Naịjirịa nabatara

Aha onyonyo, World Malaria Day: Ihe Ị kwesịrị ịma maka ọgwụ mgbochi ọrịa ịba ọhụrụ Naịjirịa nabatara
World Malaria Day: Ihe Ị kwesịrị ịma maka ọgwụ mgbochi ọrịa ịba ọhụrụ Naịjirịa nabatara

Naịjirịa esochiela mba Ghana na-azọ inye ndị mmadụ ikike ịmalite gbatuwe ọgwụ mgbochi ọrịa ịba a kpọrọ R21.

Ụlọọrụ na-enye ndị mmadụ ikike ịṅụ ọgwụ na Naịjịrịa bụ Nafdac n’ịchafụ nyere ọha ikike ịmalite gbatuwe a ọgwa n’ọnwa Eprel 2023.

Ọgwụ mgbochi ọrịa ịba

Ebe foto si, Getty Images

Kedụ ihe dị iche n’ọgwụ mgbochi a na ndị nke e mepụtabụrụla n’oge gara?

Ịdị ire ọgwụ a n’igbochi ọrịa ịba nke ndị sanyesị na mahadum Oxford mepụtara ruru pasentị 75 bụ ntuziaka otu ahụike ụwa bụ WHO nyere.

Nwale ọgwụ a e mere na mba Burkina Faso gosiri na ịdị ire ya ebe ahụ ruru pasentị 80.

Dịka a na-eche ka mpụtara nwale e mere n’ebe ndị ọzọ dị iche iche gba n’ọha, WHO ka na-atụle ma ha a ga-ebinyeaka ma nabata ọgbụgba ọgwụ ebe Naịjirịa na Ghana gbaara ọsọ binyeaka ma nabata ọgbụgba ya bụ ọgwụ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Gịnị mere Naịjirịa jiri mee nke a?

N’afọ 2021, WHO kwuru na Naịjirịa bụ mba ebe ọrịa ịba kacha gbuo ndị mmadụ n’ụwa niile.

A na-eche na ọ bụ ọnọdụ gbatagbata ya tiri ndụ ndị mmadụ na Naịjirịa mere e ji nabata ya ngwa ngwa.

Ọrịa ịba so n'ọrịa kacha egbu ụmụaka n'ụwa ugbua.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọrịa ịba so n'ọrịa kacha egbu ụmụaka n'ụwa ugbua.

Gịnịdị bụ ọrịa ịba a na-ekwu okwu ya?

Ọrịa ịba bụ ọrịa mmadụ nwereike ibute ma ma ụdịrị anwụnta nke a na-akpọ ‘Anopheles’ nke nwaanyị taa mmadụ maọbụ gụọ ọbara mmadụ.

Ọrịa na-akacha ememina ụmụnwaanyị dị ime, ụmụaka, ndị okenye, na ndị nwere ọrịa kụsasịrịla ime ahụ ha dịka ọrịa HIV/AIDS.

Ọkamụta Matt Fox na-arụ ọrụ ahụike na mba Amerịka gwara BBC na mmadụ ịgba ọgwụ mgbochi ọhụrụ a abụghịkwa na onye ahụ agaghị eme ihe dịịrị ya iji chekwaa onwe ya na ahụike ya n’aka ọrịa ịba.

Gịnị ka mmadụ nwereike ime iji chekwaa onwe ya n’aka ọrịa ịba?

Ndị mmadụ kwesịrị ịgba mbọ dobe akụkụ be ha ọcha, sụchaa ọhịa niile nọ ha nso ma zapụ ebe niile anwụnta nwere ike ibi.

Ihe ọzọ bụkwa ịgba mbọ zụta akwa mkpuchi neetị e ji egbochi anwụnta ịta mmadụ

Ọzọ bụkwa ịgba tụsa tụsa na-egbu anwụnta nakwa ihe ndị ọzọ.

Dịka ọrịa ịba so n’ihe kacha egbu ụmụaka n’ụwa ọha na-eche ịma etu ọgbụgba ọgwụ a ga-esi gaa na Ghana na Naịjirịa iji ma ma ha aga anabata ọgbụgba ya.