Gastroenteritis: Gịnị bụ ọrịa a na-ata n'afọ na-egbusisi ndị mmadụ n'Ebonyi

Ụlọọgwụ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị nọ ụlọ ọgwụ

Ọrịa otoro a na-enyo nwere i bụ ihe Bekee kpọrọ "gastroenteritis" egbuola mmadụ itolu n'obodo Ndiegu Amagu dị n'okpuru ọchịchị Ikwo n'Ebonyi steeti, dịka otu onye ọrụ gọọmentị siri kwuo.

Nke a na-abịa dịka kepụ kepụ pụtara na ndị mmadụ na-anwụ aghara aghara n'okpuru ọchịchị Ikwo.

Ụfọdụ akụko a na-ekwu na ndị nwụrụ site n'ọdachị a eruola 65.

Mana, otu n'ime ndị enyemeka onyeisi okpuruọchịchị Ikwo bụ Ugonna Utulor depụtara n'akwụkwọ ozi n'ụbọchị Tọọzde were kọwa na ọnụ ọgụgụ ndị a abụghị eziokwu.

Maazị Utulor kwuru na akụkọ ndị na-efeghari na soshal midia na mmadụ iri isii na ise nwụrụ n'ọrịa bụ akụkọ ụgha.

Mana, o kwukwara na o bu eziokwu na ọrịa afọ gburu ndi mmadụ n'obodo Ndiegu Amagu na mbido ọnwa Nọvemba.

Maazị Utulor sị na dịka ọdachi a mere, ha ezigarala ngalaba ahụike steeti, nke okpuruọchịchị, otu ahụike mba ụwa bụ WHO n'ịchafụ na ndị isi okpuruọchịchị Ikwo ozi banyere ọrịa a.

N'okwu ya, ọ sị "Ngalaba ndị a zitere anyị ndị ọrụ ahụike, ha nnyochara ime ahụ ọtụtụ ndị obodo anyị mana e kwuru na ọ bụghị otoro kpọmkwem."

Akwụkwọ ozi ya kwukwara na ndị ndu okpuruọchịọchị ahụ agbaala mbọ zụta ọgwụ, bute ihe eji echekwa mmiri ọṅụnụ, nakwa ihe ndị ọzọ e ji enyere ndị afọ na-asa aka.

Ọ gara n'ihu kwuo na mgbe ha mere ọnụ ọgụgụ n'ụbọchị Tọọzde bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Nọvemba, 2021 na ndị nwụrụla n'ọrịa bụ mmadụ itolu.

Ọ sịkwa na mmadụ iri na asatọ (18) butere ya bụ ọrịa ahụ anatala ọgwụgwọ, ebe mmadu iri n'ime ha agbakeela.

Gịnị bụ rịa "gastroenteritis" a na-enyo n'okwu ọnwụ ndị a?

Aha onyonyo, World Water Day 2020: Anyị enweghi mmiri ọṅụṅụ n'obodo Ezeukwu-Alayi

Ọrịa a na-akpọ "gastroenteritis" na-eme ka afọ na-ata mmadụ nke ukwuu.

Dọkịnta Udodi Kachikwuru Okoli gwara BBC Igbo na ọrịa a na-akacha e si na mmiri a nesighi esi nwee ṅṅọọ maọbụ a na-etinyeghi ọgwụ e ji eme ka mmiri di ọcha.

Ọ kwuru na mmadụ iri nrị aghara aghara ọ na-amaghi ebe maọbụ etu e si sịe ya bụkwa ụzọ ọzọ esi ebute ọrịa.

N'okwu ya, Dkt Okoli kwuru na ụmụaka ndị okenya bụ ndị kacha e bute ọrịa maka ime ahụ ha esighị ike ka nke ndị ntorobia.

Mgbe ụfọdụ ndị butere ọrịa na-enwe afọ mgbu.

Dọkịnta Okoli kwuru n'ebe a na-akacha ebute ọrịa a bụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ bịkọ ọnụ maọbụ na-anọkọ ọnụ dịka ụlọezụmịke ụmụakwụkwọ, ebe ndị agha na-ebịkọ, ụlọ nga, ụlọọgwụ, ndị bịtere aka n'ime ụgbọ mmiri nakwa ndị nwere ọrịa n'ime ahụ ha.

Dkt. Okoli kwukwara na "Oria a nwereike ikpalite ahụọkụ, ịgbọ agbọ, otoro ịgba mmadụ maọbụ mmadụ ịnyụ nsi ị bụ ihe na-adịghị mfe"

Ọrịa a na-efe efe

Ọrịa a na-efe efe site na onye ahụ dị mma na onye bu ọrịa a ịnọkọ, ịrịkọ nrị ọnụ, dịka nje ọrịa a na-esi na nsị maọbụ agbọ onye bu ọrịa efesa onye ọzọ.

Ya mere na-etu e si ezere ọrịa a bụ site na ihichasi na nzacha ụlọ ọbịbị nakwa ebe a na-esi nrị, ịkwọ aka kwa mgbe, kwa mgbe, ezere ndị bu ọrịa a, ịsacha nrị maọbụ mkpụrụ osisi tupu ataa ya, isi nrị na mmiri n'ọkụ tupu erie ya.

Úmúaka n'eku mmiri na-agbapúta n'ala

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụkọ mmiri so na ihe na-ebute mkesa ọrịa a na-ebute na mmiri

Etu e si agwọ ya

Dọkịnta Okoli gwara BBC Igbo na ọrịa bụ ihe a na-agwọ agwọ site na ịṅụ ọgwụ pụrụịche Beekee na-akpọ 'antibiotics'.

O kwukwara na ịṅụ mmiri kwa mgbe kwa mgbe ga-enyere onye bu ọrịa a aka igbake dịka ya bụ ọrịa na-eme ka mmadụ nyụọ oke nsi nke bụ na ọtụtụ mmiri ga-apụ ya n'ahụ.

Na nchịkọta o kwuru na mmiri ọgwụ Beekee na-akpọ 'Oral Rehydration Solution' bụ ọ pụrụịche na inyere ndị bu ọrịa a aka.

'Oral Rehydration Solution' bụ mmiri, Sụga na nri.