Pest Control: Agụụlọ, ụchịcha na oke ọ na-enye gị nsọgbụ n'ụlọ gị? Lee ụzọ mgbapụ

Ebe foto si, BBC/Getty/EPA
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos
Ụfọdụ anụ, ahụhụ na ihe nrịgharị ndị ọzọ na-enye nsogbu n'ụlọ ma na-eme ihe ndị mmadụ echeta-ebewe.
Ihe dịka oke, ahụhụ, ijiji, anwụ, arịrị na agwọ na-ebute mgbakasị ahụ, ọrịa nakwa ihe mgbu ndị ọzọ.
Ịchụ ha na-adịka iji nkata ekute n'ihi na ị chụ ha taa, ha lọchachi echi.
Mana ị matara na i nwere ike inye ha ọsọ n'ụlọ mkpamkpam nke bụ na ha gbakata, ha jaa gị azụ?
Ihe kacha mkpa na igbochi ahụhụ na ụmụ ndị a bụ idebe gburugburu gị ọcha n'ihi na ọtụtụ n'ime ha kpọrọ ebe dị ọcha asị.
Gwa, lee ihe ndị ọzọ i nwere ike ime ndị ọnyịrị-ọnwụ dị a sọwa ụlọ gị nsọ:
1. Ọchịcha

Ebe foto si, Getty Images
Ọchịcha bụ ahụhụ na-eke ọrịa ka a na-eke ego.
A ma ya ama ya maka ikesa dịka otoro (cholera), disentrị, taifọd, salmonellosisi, na ekpenta site ịnyụnye nsị maọbụ mammiri ya na nri maọbu mmiri maọbụ ngwa e ji eri nri maọbụ esi nrị.
Cheta na Ọchịcha na-eri nsị na nrị ma na-awagharịkarị n'abalị n'usekwu, olulu nsị, abọ ntufuahịhịa, mpio mmiri na mgbawara aja.
WHO kwuru na ụchịcha nwere ibu agwa okpo na ebute ọrịa akpụkpọ ahụ, ọkọ na ọrịa metụtara ọwa e si eku ume.
Ụzọ iji chụọ ya: Mana i nwere ịchụ ha ọsọ site na ịgwakọ'baking soda' na shuga ma tụsacha ha n'akụkụ ụlọ gị niile ebe zoro ezo.
Mmanụ dịka ụdịrị nke Bekee kpọrọ "mint oil", "spearmint oil" na "euclatypus" nwerekwara ike ịchụ ha ọzọ dịka WHO siri kwuo.
Ọzọ, gbaa mbo na-edewe ehufu ahịhịa dị n'usekwu gị mgbe abụla mgbe. Sachapụ efere na ite nri oge ọbụla ọ luru unyi.
2. Oke

Ebe foto si, AFP via Getty Images
Oke ọ talara gị asambodo maọbụ akwụkwọ ọzọ dị oke mkpa?
Oke bụ ajọ anụ na-atakasị ihe dị iche iche n'ụlọ; akwụkwọ: akwa, osisi were dịrị gawazie.
Oke nwekwara ike ikesa ọrịa dị iche che gụnyere 'lassa fever', salmonellosis.
Mamịrị oke nwere ike ịkpalite agha asthma na onye nwere ọrịa asthma.
Ọ bụghị naanị ikesa ọrịa, oke nwere ike ibubatara gị igwu n'ụlọ dịka ha nwere ike ị labara n'ajị ya so ya si ọhịa bata n'ụlọ.
Ụzọ iji chụọ ya: Isi kemikal Bekee kpọrọ 'ammonia' na 'bleach' na-achụ oke ọsọ.
Oke na-asọkwa ebe dị ọcha nsọ.
3. Agụụlọ

O nweghị ọrịa a ma na sayensi na agụụlọ na-ebute mana ọtụtụ ndị na mpaghara ọdịda anyanwụ Afịka ejighị anya ahụ agụụ1ọ.
Ụfọdụ nwere nkwenye na ọ bụ amusu na-egbu mmadụ nke nwere ike ọdanye na nri gị o gbuo gị pịị.
Mana ndị ọkachamara kwuru na nke ahụ abụghị esi okwu.
Kama ha kwuru ha dịka agụụlọ na amanye ọnụ na ụkwụ ya n'ihe dị iche iche , a o nwere ike ikesa nje na ebute ọrịa nke Bekee kpọrọ 'bacteria".
Ụzọ iji chụọ ya : Gwakọ 'garlic na nnu ma tụsa sịa ya n'akụkụ ụlọ ebe ị na-ahụkarị agụ ụlọ.
4. Ijiji

Ebe foto si, EPA
Ijiji na-eme ihe ịso oyi; ọ na-eri nsị, nri maọbụ mkpuruosisi fọtọrọ afọtọ.
Ọ na-eke ọrịa gwogwo. Ọrịa dịka taifọd, otoro, disentrị na E. coli.
Ụzọ iji chụọ ya: Ịkụ osisi na flawa dịka akwụkwọ "basil" na "bay" na-achụ ijiji. Ijiji na-asọkwa isi 'camphor', mmanụ "peppermint oil".
5. Anwụnta

Ebe foto si, Getty Images
Omekataraihedaaụjọ a na-ebute ọrịa ịba nke na-ata isi karịrị mmadụ 409 000 n'afọ 2019 n'ụwa dịka WHO siri kwuo.
Ụzọ iji chụọ ya: Gbaa 'Garlic spray', anwụ kpọrọ isi garlic asị.
Inwekwara ike ibewa oloma 'lemon' tinye clove ma dowe ya na mpio ụlọ gị.
Ọkammụta Aline Noutcha nke mahadum "University of Port-Harcourt" bụ ọkachamara n'ihe gbasara etu ahụhụ si arụ ọrụ n'ikesa ọria nke Bekee kpọrọ "Molecular Entomologist"sị na ịkụ "lemon grass" maọbụ nchụanwụ na gburugburu gị.
Ndị ọkachamara na-adụkwa ọdụ ka ịhụ na ọwammiri dị ụlọ gị nso dị ọcha, sụọ ahịhịa dị na gburgburu gị.
Ha rịọkwatra ka ịhụ na 'tyre' ochie maọbụ komkom mmiri nwere ike ịdọ adịghị gị nso ụlọ n'ihi na anwụ na-amụba na mmiri dọ adọ, na-adịghị ọcha.
Agwọ

Ebe foto si, Getty Images
Agwọ bụ ajọ anụ nwere ike igbu mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ enwetaghị nleta ngwangwa ọ tara ya.
Ụzọ m iji chụọ ya: Ndị ọkammụta siri kwuo, ngoro nke ụfọdụ ndị na-akpọ akụilu, lemon grass , tobacco na-enye agwọ ọsọ dịka ọ naghị anabata isi ha.
Ọkammụta Aline Noutcha nke mahadum "University of Port-Harcourt" bụ ọkachamara n'ihe gbasara etu ahụhụ si arụ ọrụ n'ikesa ọria nke Bekee kpọrọ "Molecular Entomologist" sịrị Ịkụ osisi ụtaba, cacti na achụọ agwọ."
Eucharia Nwaichi, onye nkuzi ọzọkwa na ngalaba ọzụzụ ụmụanụmanụ na mahadum"University of Port-Harcourt" si kwuo, "I nwere ike iberisi ugoro, fee ya n'ebe ndị ị ma agwọ nwere ike isi bata n'ụlọ."
"Nke a bụ n'ihi na ugoro nwere ihe isi ya na-achụ agwọ."
Chinchi










