Twitter ekwuola na ha ga-agba 'Meta' akwụkwọ n'ụlọikpe maka imepụta 'Threads'

Ebe foto si, EPA
Ụlọọrụ 'Twitter' ekwuola na ha ga-agba ụlọọrụ Meta akwụkwọ n'ụlọikpe maka imepụta akụrụngwa soshal midia ọhụrụ a kpọrọ 'Meta'.
Nke a na-abịa dịka ihe karịrị mmadụ nde 30 debanyere aha n'ọbaozi Threads n'ime ụbochị mbụ Meta ji wepụta ọbaozi ahụ.
Onye nwe Twitter bụ Elon Musk kwuru na ha anaghị atụ egwu mmadụ ịma ụlọọrụ ha aka, kama ha agaghị anabata iji ụzọ aghụghọ mee ya.
Threads na Twitter yiri onwe ha nke ukwuu dịka onye ntaakụkọ Tekịnụzụ BBC bụ James Clayton si kwuo.
Ọkaiwu Twitter bụ Alex Spiro degaara ụlọọrụ Meta akwụkwọ ma bo ha ebubo "izuru ụfọdụ ihe nzuzo nke Twitter ma were ya mepụta ọbaozi 'Threads'".
Spiro kwuru na Meta were ọtụtụ ndị ruburu ọrụ na Twitter n'ọrụ, bụ ndị ma ọtụtụ ihe nzuzo gbasara Twitter, nke ha jizi were rụpụta Threads.
Mana ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Meta bụ Andy Stone kwuru na "onweghị otu onye so na ndị mepụtara Threads' bụbu onye ọrụ Twitter - ụdị ihe ahụ adịghị."
Threads: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka akara mgbasaozi a

Ebe foto si, Threads/screengrab
Meta, ụlọọrụ nwe Facebook na Instagram ewepụtara akara mgbasaozi ọzọ a kpọrọ Thread, taa bụ Tọzde.
Dịka onye nwe ụlọọrụ ahụ bụ Mark Zuckerberg si kwuo, ebumnobi ha bụ na Thread ga-eche Twitter aka mgba ma merie ya.
Zuckerberg kwuru sị. “Ọ ga-ewetu obere oge mana e chere m na ọ ga-abụ ọbaozi ebe mmadụ karịrị otu ijeri ga-enweike na-ezukọ ma na-akpa nkata.”
Naanị awa ole ma ole e ji mepee ya bụ ọbaozi , ihe karịrị mmadụ nde iri atọ gunyere onyeisiala Naijiria bụ Bola Tinubu, Otiegwe Phyno nakwa ndị ejije Nollywood a ma ama dịka Chizzy etinyela aha ha na ya bu ọba ozi na-akpọtụ n'ụwa kemgbe ụbọchị Tọzde.
Etu ị ga-esi banye
Na -agbanyeghị na 'Thread kwụrụ onwe ya, onye ọbụla chọrọ ibanye ya ga-enwe akara Instagram bụ ebe ọ ga-esi abanye ya.
Ịbanye na 'Playstọrị maka ndị nwere ekwentị Android maọbụ Appstore maka ndị nwere ịPhone, dọrọ 'app Thread dọbata n'ihu ekwentị gị.
Ị pịa ya maọbụụ na i nwere akara Instagram n'ekwentị gị, ọ ga-egosi ohere itinye aha jị ma dọọkwa ozi dị n'akara Instagram gị.
Threads ga-enye gị ohere ịkpochi ọbaozi gị ka ọ bụụ naanị ndị na-eso gị na-ahụ ozi gị maọbụ ohere ịgbara ọha n'anwụ ihe ọbụla i mere n'elu ọbaozi ahụ.
Ihe ndịiche dị na Threads na Twitter
- Threads nwere ohere mkpisi edemede 500, ebe Twitter nwere 280.
Nke pụtara na mmadụ nwere ike iji ya dee ogologo ahịrịokwu karịa ihe i nwere ike ide na Twitter.
- Na Threads, i nwere ike itinye onyonyo, toro ogologo rue nkeji ise mana Twitter bụ iheonyonyo nkeji abụọ na ọkara
- I nwere ike ikerịta ozi izipụrụ n'Instagram na Threads maọbụ nke Threads n'Instagram
- Ị chọọ iwepụ akara gị na Thread, ị mara na ị ga-ewepụ akara gị na Instagram n'ihi na ọ bụ na Ịnstagram ka ị ga-eme nke a.












