Ihe anyị ma maka ndị nche obodo a sị ndịagha gbagburu n'Eke Udi, Enugwu Steeti

Aha onyonyo, Ndị ọrụ nche "Neighbourhood Watch' n'Enugwu sị na ndị agha gbaguru onye otu ha

Ndị obodo Eke dị n'okpuruọchịchị Udi nke Enugwu Steeti etiela mkpu akwa etu ndịagha Naịjirịa si gbagbuo ndị ọrụ nchekwa 'Neighbourhood watch' ma sị na ha cheere na ọ bụ ndị ntọrị.

Mmadụ abụọ ha gbagburu gụnyere otu nwoke, Ebuka Oke bụ onye nchekwa na otu nwaanyị, Nkechinyere Udegbulam bụ nwunye otu onye nchekwa, ebe mmadụ anọ ndị ọzọ merụrụ ahụ.

Ndịagha na ndị nchekwa obodo n'Enugu steeti

Ebe foto si, Getty Images

Kedụ etu ihe a si mee?

Ugwu dị nsọ dị n'Eke Udi Enugwu steeti
Nkọwa foto, Ugwu dị nsọ dị n'Eke Udi Enugwu steeti bụ ebe ihe a mere

Mkpa mkpa a mere n'ụbọchị Tọzde 29 Juun, 2023 n'ebe a kpọrọ 'Cashew' dị n'ama Ekpere Ugwu dị nso Eke.

Onye ndu ndị nchekwa ahụ bụ Emeka Anigbo gwara BBC Igbo na o mere mgbe ha gara emume idu n'iyi ọrụ n'ụbọchị Tọzde ahụ ma nata ozi na e nwere ebe ndị ntọrị na-akpa ike.

"Ngwa ngwa nwetere ozi a, anyị gawara n'ụzọ Ugwu dị nsọ ka anyị nyere ndịagha aka jide ndị ntọrị ahụ. Anyị yi uwe ọrụ nchekwa anyị."

Mgbe anyị ruru n'Ugwu dị nsọ ahụ, ndịagha tụgidere anyị egbe, anyị welie aka elu ma gwa ha na anyị bụ ndị ọrụ nchekwa, gosikwa ha akwụkwọ njirimaara (Id card) mana ndịagha egeghị anyị ntị ma malite ịgba anyị egbe aghara aghara.

O kwuru na ndịagha a gbagburu onye otu ha bụ Ebuka Oke nakwa Nkechinyere Udegbulam bụ nwunye onye otu ha e bu n'ọgbatumtum.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ ghọtaghị ihe mere ndịagha jiri malite ịgba ha egbe ebe ha yicha uwe nchekwa ha ma gosikwa akwụkwọ njirimaara ha.

Mmadụ anọ ndị ọrụ nchekwa ahụ a gbara ebge ka nọ n'ụlọọgwụ ugbua anata ọgwụgwọ.

Ebe ihe a mere n'obodo Eke dị n'Enugwu

"Ndịagha ga-akọwa ihe mere ha jiri gbagbuo ndị nche anyị"

Onyeisioche Ogui Eke Development Union bụ Gerald Obodo gwara BBC na obi na-agbawa ha maka na ọ bụ ha dunyere ndị a ọrụ nchekwa obodo ha.

"Ọ gbagwojuru anya ihe mere ndịagha jiri gbagbuo ndị nchekwa anyị na-agbanyeghi na ha gosiri akwụkwọ njirimaara ha.

Ọ kpọkuru gọọmentị ka a gbatara ha ọsọ enyemaka ma sị na ndịagha ga-akọwa ihe ha nọ na-eme n'ime ọhịa dị nso n'obodo ha.

N'otu aka ahụ onyeisi ụlọomeiwu Gọomenti Enugwu steeti bụ Uche Agwu bịara ileta ndị a gbara egbe n'ụlọọgwụ kwuru na gọọmenti ga-eme nyocha ịchọpụta ihe mere ndịagha jiri gbaa ndị ọrụ nchekwa obodo a egbe.

"Ọ bụ ndịagha na ndị omekome kwatara mgbọ"

Ndịagha Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa nke ngalaba 82 Division bụ Jonah Unuakhalu kwuru na ọ bụ ndịagha na ndị omekaome kwatara mgbọ n’obodo Eke.

N'ozi o wepụtara, Unuakhalu kwuru na ọ bụ ihe mwute na otu nwaanyị, Nkechi Udegbunam nwụrụ site na mgbọ tụụrụ ya n'oge ọgụ ahụ ha na-ada, kama na ọ maghị maka nke nwoke a kpọrọ Ebuka Oke.

O kwuru na ha nwetere ozi na ndị omekaome nọ na-akpa ike n'obodo Eke, na ha gara ebe ahụ rụọ ọrụ ha.

Ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ n'Enugwu steeti na nso nso a, ọkachasị na mpaghara Enugwu gawa Nsukka, okporoụzọ si Enugwu gawa Pọtakọt nakwa ebe ndị ọzọ.