Sit-at-home: Ndị 'unknown Gunmen' egbuola otu nwoke n'Enugu taa

Iru uju na ibe akwa juputara taata n'Abakpa dị n'Enugwu steeti dịka ndị oji egbe kpara ike ọjọọ na Liberty Abakpa Nike were gbuo otu onye pịị.
Ndị bu egbe n'amanye ndị mmadụ nọọ n'ụlọ taa bụ Monde egbuola otu onye ma gbaa ọtụtụ ụgbọala ọkụ n' n'Enugwu taata, aba isii nke ọnwa Maach afọ 2023.
Nchọpụta Onye ntaakụkọ anyị mere gosiri na otu onye egburu nọ na ụgbọ ala Sienna na aga Nsukka were nọrọ na Liberty eburu ndị njem.
Ka o ji ọkara gafee elekere ise nke isi ụtụtụ taata (5.30am) ka ndị omekome ahụ wakporo ya bụ ebe akpọrọ T-junction were munye sienna ọkụ, ma gbakwaa keke anọ ọkụ. Ọ bụzị Otu onye nọ n'ime Sienna ahụ ka ọkụ gba gburu.
Out onye jiri anya ya hụ bụmazi Ambrose Ede gwara BBC na ndị ahụ wakporo ndị ọkwọ ụgbọala n'ike nke na ha enweghị ike ịgba ọsọ.
Nkea ga eme ya ihe ruuru ugboro ise ndị unknown Gunmen ahụ na awakpo mpaghara Abakpa- Nike ma gbuo mmadụ, ma gbaa ụgbọ ala ọkụ maka erubeghị isi na sit-at-home ha kpọrọ.
Cheta na ndị out IPOB ekwuola kwa mgbe na ọbụghị ndị otu ha na amanye sit-at-home n'ihi na ha aka gbuola ya ka mgbe afọ gara aga.

Anyi gaghachiri na ya bụ Liberty Abakpa na elekere mbụ nke ehihe tata were hụ na ebupula ụgbọ ala ndị gbara ọkụ, njem ụgbọala malitekwa gawa n'ihu dịka o sị adị na mbụ.
Onye na ekwuchitere ndị uwe ojii ọnụ ha n'Enugwu bụ Daniel Ndukwe kwuru na ọ bụ eziokwu na ụgbọala Sienna na keke anọ gbara ọkụ ma kwuo na ya amabeghị na mmadụ anwụrụ naya bụ mwakpọ ndị Unknown Gunmen.
Ndukwe kwere nkwa na aka ndị uwe ojii ga akpara ndị ahụ.















