Onyeka Nwelue: Etu mahadum 'Oxford University' si chụọ nwaafọ maka ebubo ịbụ 'Professor' adịgboroja

Ebe foto si, Emmanuel Ikechukwu Umeonyirioha/Facebook
Mahadum 'Oxford University' dị na mba Briten agwala nwaafọ bụ Onyeka Nwelue na ha achọghịkwa ya ọzọ dịka ọbịa agụmakwụkwọ pụrụ iche (Academic Visitor)."
Ọnọdụ 'ọbịa agụmakwụkwọ pụrụ iche' bụ ọnọdụ nke mahadum na-enye onye degara ha akwụkwọ mmasị , ha nwee nkwekọrịta ịbịa nọọ onwa mgbeta na ngalaba onye ahụ gosiri mmasị iji mụta ma kuziere ndị ọzọ, nke ha anaghị akwụ onye ahụ ụgwọ maọbụ nye ya ohere ịrụrụ ha ọrụ.
Nke a na-abịa dịka ụmụakwụkwọ mahadum ahụ nyere mkpesa na Nwelue na-ekwu okwu na-egosi nleda anya nye ụmụnwaanyị n'ụlọakwụkwọ ahụ nakwa okwu akpọmasị megide agbụrụ.

Ebe foto si, Screengrab
Nwaamadi ahụ na-emepụta ihe ejije bụ onye na-agwa ndị mmadụ na ya bụ ọkammụta n'Oxford University' nakwa Cambridge, bụ onye a kpọrọ oku ka ọ nọnyere ngalaba mmụta banyere Afrịka, (African Studies Centre)," dịka 'visiting fellow' maka afọ agụmakwụkwọ 2021-2022.
Nwelue na-agwa ndị mmadụ na ya bụ ọkammụta na mahadum 'Oxford University' na Cambridge mana akwụkwọ ntaakụkọ mahadum 'Oxford University' a kpọrọ Cherwell kwuru na nnyocha ha gosiri na nke a bụ ụgha.
E bokwara ebubo ebubo na Nwelue ji akara njirimara mahadum Oxford University' were mee emume o jiri kpaa ego.
Na mmalite afọ, Nwelue na onye ntakụkọ Naijiria bụ David Hundeyin mere emume mwepụta akwụkwọ nke Hundeyin dere n'ọha bụ nke ha nara ndị bịara ya ego na anataghị ikike mahadum ahụ.

Ebe foto si, David Hundeyin/Twitter
Mbọ BBC gbara ịnụta olu mahadum Oxford na Nwelue ahụ amịtaghị mkpụrụ.
Oxford University azaghị ekwentị ha , ha asabeghịkwa ozi anyị zigara ha na email oge akụkọ a pụtara.
Nwelue azaghị ekwentị ya oge anyị kpọrọ akara ekwentị ya na mba Briten.
David Hundeyin kwuru n'akara soshal midia na ebubo e boro ya bụ ebubo ụgha.
Hundeyin sịrị na ya sara onye ntakụkụọ Cherwell jụrụ ya ajụjụ maka ebubo ahụ , mana o tinyeghị ọsịsa ya nyere n'akụkọ ahụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ka ọ dị ugbua , Nwelue ehichapụla akara ya na Twitter nakwa Instagram.
Nwelue wuru ewu na sohal midia n'afọ 2022 dịka akụkọ gbara n'intanetị na site na nkwado ya na a malitere nkuzi asụsụ Igbo na mahadum Oxford.

Ebe foto si, Screngrab












