2023 General Elections: Lee ndị ikuku 'Labour Party' kubara n'ọkwa Ụlọomeiwu Naịjirịa

Thaddeus Attah, Ireti Kingigbe nakwa Chimaobi Atu

Ebe foto si, Facebook/Twitter/Ireti Kingibe

Otu Labour Party nke Peter Gregory Obi ji azọ ọkwa onyeisiala bụ otu ebe anya ndị mmadụ dị na ntuliaka e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febụwarị.

Ọ bụghị naanị maka Peter Obi mana maka etu ndị ọzọ na-azọ ọkwa dị icheiche n'aha otu ahụ sị chụpụ ndị nọbu n'ọkwa ahụ ogologo oge.

Ụfọdụ n'ime ha bụ ndị mmadụ anụbeghị aha ha chaachaa n'ihe metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị na Naịjirịa ebe ụfọdụ bụ ndị a ma ama.

Lee he niile ebe a.

Ireti Kingibe

Ireti Kingibe

Ebe foto si, Ireti Kingibe

Ireti Kingibe bụ nwunye onye bụbu Odeakwụkwọ ala Naịjirịa bụ Babagana Kingibe.

Mgbe a kpọpụtara mpụtara ntuliaka, o nwetara 202,175 o ji merie Phillip Aduda nke PDP nọ n'ọkwa ahụ kemgbe 2011.

Ọ malitere ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 1990 mgbe o sonyere otu SDP. Ọ banyere PDP n'afọ 2006 ma banye APC n'afọ 2014.

Ọ banyere Labour Party n'ikpeazụ n'afọ 2022 ebe ọ nọ rite ọkwa a.

Thaddeus Achief Attah

Thaddeus Attah

Ebe foto si, JT Attah/Twitter

Thaddeus Attah bụ onye ọhụrụ n'ihe gbasara ntuliaka nke mere ya na Labour Party bụ ọkwa gọọmentị mbụ ọ banyere.

O ritere vootu 24,075 o ji merie Bankole Wellington nke PDP nakwa Musiliu Obanikoro nke APC.

Obanikoro bụ onye nọ n'ọkwa ịnọchi anya Eti Osa dị na Legọs n'ụlọomeiwu nta kemgbe 2019.

Attah sonyere na ya bụ otu naanị ọnwa atọ tupu e mee ntuliaka mana tupu ọ banye nke a, ọ bụ ojiegiachụego.

Victor Umeh

Victor Umeh

Victor Umeh bụ omeiwu nọbụ n’ọkwa n’Anambra Central rue afọ 2019 tupu Uche Ekwunife nke otu PDP emerie ya ma napụ ya ọkwa ahụ.

Umeh nọbụ n'otu APGA si ebe ahụ pụọ ma sonye otu Labour n'afọ 2022.

Ọ zọrọ ikike ịnọchị Labour Party nke mere ka ọ gbaa ụnụ n'ụlọikpe tupu o nweta ya bụ ikike ma merie na ntuliaka.

Chimaobi Sam Atu

Chimaobi Atu

Ebe foto si, Chimaobi Atu/Facebook

Ginger Onwusibe

Ginger Onwusibe

Ebe foto si, Ginger Onwusibe/Facebook

Ekene Adams Abubakar

Ekene Adams Abubakar

Ebe foto si, @Adamekene/Twitter

Oby Lilian Orogbu

Oby Lilian Orogbu

Ebe foto si, Prof Oby Lilian Orogbu TV

Ibe Okwara Osonwa

Ibe okwara Osonwa

Ebe foto si, Ibe Okwara

Tony Nwoye

Tony Nwoye

Ebe foto si, Tony Nwoye/Facebook

Paul Nnamchi

Paul Nnamchi

Ebe foto si, Raymond Okechukwu Ugwu/Facebook

Afam Ogene

Afam Ogene

Ebe foto si, Afam Ogene/Facebook

Ezenwa Onyewuchi

Ezenwa Onyewuchi

Ebe foto si, Ezenwa Onyewuchi/Facebook

Neda Imasuen

Neda Imasuen

Ebe foto si, Neda Imasuen/Facebook

Okechukwu 'Okey' Ezea

Okey Ezea

Ebe foto si, Okey Ezea/Facebook

Donatus Matthew

Donatus Matthew

Ebe foto si, Hon_Donatus/Twitter