2023 Election Result: Aga m agbagha mpụtara ntuliaka 2023 n'ụlọikpe- Peter Obi

Peter Obi

Onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'aha Labour Party bụ Peter Obi ekwuola na ya ga-aga n'ụlọikpe ịgbagha mpụtara ntuliaka 2023.

Obi kwuru nke a ụbọchị Tọzde oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu banyere ihe o chere maka ntuliaka e mere n'abalị 25 nke ọnwa Febụwarị afọ 2023 nke Inec kpọpụtara Bola Tinubu nke APC dịka onye meriri na ntuliaka ahụ.

O kwuru na "Anyị meriri na ntuliaka. Aga m agbagha ya(mpụtara) iji gosi na ọ bụ m meriri n'ezie."

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Obi, onye anyammiri pụrụ n'anya dịka ọ na-ekwu okwu sịrị, "N’oge achụmntavootu, e kwere m nkwa na-anyị ga-agbaso usoro etu e si eme ihe."

"Na nke a, ana m agbagha usoro e si mee ya."

O kwuru sị na "ihe a na-azọ abụghị maka m, ọ bụghị maka gị. Ọ bụ maka ụmụ anyị n'ọdịnuhu."

" Anyị mere ntuliaka ebe otu onye nọ na-eti mkpu si lee etu a ga-esi mee ntuliaka. Otu afọ ka e kwubere otu ọ ga-esi gaa. O rue ka oge ruziri, anyị nile pụta kwụrụ n'ahịrị, otu onye mapụta bịa were nrite dị na ya, e kwuwe ihe ọzọ."

N'okwu ndị na-akpọ ya oku ka ọ chọwa udo, obi kwuru sị, “Ị gaghị ekwu okwu udo ma ọ bụrụ na ịguzoghị n’ezi ntọala.”

Ọ gwara ndị chọrọ ịgbapụ na Naijiria sị, "Bikọ nọrọnụ, anyị agaghị apụ. Ana m ekwe ụnụ nkwa, anyị ga-enwe mmeri."

Akụkọ na-efegharị kwuru na Peter Obi na ndị pati ndị ọzọ akpaala ijikọọ ọnụ, Mana Obi kwuru na o nweghị pati ọbụla ya na ya nwere nkwekọrịta ijikọta ọnụ.

N'okwu ntuliaka na-abịa, Obi gwara ndị ntọrọbịa chọrọ imebi akwụkwọ PVC ha n'ihi nkọropụobi ka ha pụta n'igwe tụọ vootu maka ntuliaka ọkwa Gọvanọ nakwa ụlọomeiwu nke steeti na-abịa.

" Tụọrọ ndị ezigbo mmadụ, tụọrọ Labour Party."

"Ọ bụ ogologo ije, anyị ga-ejikọ aka gaa ya bụ ije."

Ihe ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ Obi kwuru

Peter Obi
  • "Na 2015, ihe dịka mmadụ nde 67 denyere aha maka atụmvootu, pasent 29.4 tụrụ vootu. N’afọ 2019, ihe dịka nde 80 denyere aha ha, mmadụ nde 24 tụrụ vootu, o rue na 2022, mmadụ 11 million ọhụrụ denyere aha iso tụọ vootu nke mere ya mmadụ 87 denyere aha mana naanị mmadụ 23.3 tụrụ vootu. Nke a pụtara mgbada ruru pasent 300. Ihe butere nke a bụ ịkpachi ndị mmadụ ịtụ vootu nakwa idegharị ihe a tụtara.”
  • Ọ bụrụ na anyị jiri usoro anyị ji mee ntuliaka a gaa n’ihu, kedụ ihe anyị ga-eji asị onye ntọ kwụsị na ihe ị na-eme adịghị mma?”
  • "Ọ bụ n’afọ ojuju ka m ji ekela ụmụ Naijiria ọkachasị ndị ntotobia bụ ndị rụrụ ọrụ ezughị ike maka ntuliaka. E kelele m ndị Obidients bụ ndị kwenyere na ‘a ga-enwenwụ Naijiria ọhụrụ. Mụ na Datti kwenyesiri ike na Naijiria ọhụrụ.
  • “Ntuliaka a erughị ihe a ga-akpọ ntuliaka e mere n’usoro kwesịrị ekwesị ma tozuo etozuo.”
  • “O nweghị oge mụ kwuru n’ ọha kemgbe m tụchara vootu. Okwu ikpeazụ m kwuru bụ ozigbo m tụchara vootu. Ihe ọbụla i hụrụ a sị m kwuru ọ bụghị m kwuru ya.”
  • Amaghị m ka obi dị ha ka ihe si gaa, mana etu ha si dere jụụ na agbanyeghị etu ihe si gaa bụ ihe akaebe na Naijiria ọhụrụ ga-ekwe omume.
  • Anyị na-aga n'ihu ikpe ekpere ka mkpụrụobi ụmụ Naijiria e gburu n'oge achụmntavootu, ndị a wakporo anyị na-ekpere ha ekpere mgbake. Anyị na-akatọsi ike mwakpo nile e mere ma na-akpọku ndị ọrụ nchekwa ka ha kwụsị ndị na-eme mwakpo ma kpụpụ ha ụlọikpe.
  • Jennifer Efidi mwaanyị a zụkakasịị mana ọ gbara isis akwara tụọ vootu na ụmụ NAijiria ndị ọzọ tụụ vootu oge ntuliaka a bụ kpakpando na-amụkesị na-eduga anyị na Naijiria ọhụrụ.