Ihe mere nkwado ndị ụkọchukwu ji buru ihe ukwu na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa

Pastor Paul Enenche, Paul Adefarasin, Chris Oyakhilome

Ebe foto si, Instagram

Ọtụtụ ndị isi okpukperechi a ma ama na Naịjirịa - ma ndị nke ụka Christ ma nke ndị Alakụba - amalitela inye ndị na-eso ha ndụmọdụ gbasara onye ha ga-atụnyere na ntuliaka Onyeisiala Naịjirịa a ga-enwe n'ụbọchị satọde, bụ ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

Ụfọdụ n'ime ha na-ekwu hoohaa ma kpọọ aha onye ha chọrọ ka ndị nkwado ha tụnyere vootu, ebe ụfọdụ na-eji ilu na ụkabuilu ekwu okwu ga-arụtụrụ ndị nke ha aka onye ha na-ekwu maka ya.

Iji maa atụ, n'ọdị nso a, ụkọchukwu Paul Adefarasi onye nwe ụlọụka 'House on The Rock' gwara ndị ụka ya na ihe ga-eme na ntuliaka Naịjirịa n'afọ a bụ na "Saul ga-abịa tupu David abịa".

N'aka nke ọzọ, ụkọchukwu Chris Oyakhiloma nke ụka Christ Embassy kwuru na ya hụrụ "onye aha ya dị n'akwụkwọ nsọ" ebe o meriri ntuliaka a.

Ọtụtụ na-ekwu na ha amarala ndị ụkọchukwu abụọ a na-ekwu maka ha, maka na ihe a gba n'aka, ejighi enyo ele ya.

Mana gịnị kpatara nkwado ndị isi okpukperechi ji dị nnukwu mkpa na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nakwa na mpaghara Afrịka niile?

Ndị Naịjirịa ejighi okpukperechi egwu egwu - Bishọp Ogu

Nnyocha dị icheiche e merela gosiri na Naịjirịa bụ mba ebe okpukperechi dị oke mkpa na mpaghara cị icheiche.

"Okpukperechi na-emetụta ihe niile anyị na-eme na Naịjirịa, tinyere aha anyị na-enye ụmụ anyị maọbụ ụlọahị anyị," Bishọp Bright Ogu gwara BBC Igbo.

Bishọp Ogu bụbu onye na-elekọta ụka Anglịkan na mpaghara Mbaise, n'Imo Steeti Naịjirịa.

"Ọ ga-esi ike ịhụ onye Naịjirịa na-enweghị okpukperechi ọbụla o kwenyere na ya. Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ma nke a, ya mere ha ji etinye onwe ha n'ime okpukperechi iji nweta ike ọchịchị ha na-achọ," ka o kwuru

Ndị isi ụka nwere nnukwu nkwanye ugwu

Pastor David Oyedepo, Pastor Lazarus Muoka, Pastor Enoch Adeboye

Ebe foto si, Instagram

Nkọwa foto, Ndị isi ụka nwere nnukwu nkwanye ugwu na Naịjirịa

Bishọp Ogu gara n'ihu kwuo na ndị isi okpukperechi bụ ndị a na-akwanyere ugwu pụrụ iche n'obodo "n'ihi na ndị mmadụ na-ahụta ha dịka ndị na-anụ olu Chukwu".

O kwuru na ụfọdụ ejirila maka nke a na-eme ihe ọjọọ dị icheiche n'aha okpukperechi.

"Ọtụtụ oge ka ndị ụkọchukwu na-ekwu na Chukwu gwara ha, mana onweghị ihe Chukwu gwara ha. Na ntuliaka ndị gara aga, ụfọdụ apụtala buo amụma maka onye ga-emeri, e mechaa onye ahụ adaa. Mana o mebeghị ka nkwanye ugwu a na-enye ndị isi ụka daa."

Mana Bishop Ogu kwuru na ọ bụ ezie na ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị kwesịrị ị na-eche maka ọnọdụ okpukperechi na Naịjirịa na mkpebi ha nakwa usoro ha ji eme ihe, mana ọ dị mkpa ka ndị mmadụ ga na-atụ vootu na-eleghị anya n'okpukperechi.

Aha onyonyo, Okpukperechi mmadụ o kwesịrị ibute okwu na ndọrọndọrọ ọchịchị?