Amụma ndị ụkọchukwu a ma ama buru maka afọ 2023

David Oyedepo, Lazarus Muoka, Enoch Adeboye

Ebe foto si, Instagram

Naịjirịa bụ mba e ji okpukperechi mara, nke a mere na n'ụbochị ikpeazụ nke afọ ọbụla, maọbụ na mmalite afọ ọhụrụ, ụfọdụ ndị ụkọchukwu a ma ama na-ekwu ihe ha ndị mmadụ nwereike ịtụ anya ya n'ime afọ ahụ.

Lee ihe ụfọdụ n'ime ha kwurula maka afọ ọhụrụ a bụ 2023:

A ga-ebupu ihere Naịjirịa - Bishọp Oyedepo

David Oyedepo

Ebe foto si, Davidoyedepo/Instagram

Bishọp David Oyedepo bụ onyeisi ụlọụka Living Faith nke e ji Winners' Chapel' mara.

Na nnukwu emume ọgbakọ ekpere nke ụlọụka ya na-ahazi kwa afọ a na-akpọ 'Shiloh' Oyedepo kwuru na ọ dị mkpa ikpere Naịjirịa ekpere ka Chineke bupu ihere chere ya n'ihu.

"Ala a ga-enwe ezumike. Ala a ga-enwe ezumike. Ị gaghị abụ onye gbara ọsọ ndụ gbaga mba ọzọ. Agha agaghị ada na Naịjirịa. Nkwafu ọbara agaghị adị na Naịjirịa," ka Oyedepo kwuru.

"Naịjirịa ga-enwe ọganihu ọzọ. Ihere mba a ka a ga-ebupu. Ndị aka ha adịghị ọcha ga-ata ahụhụ...

Oyedepo kwuru na ihe dị Naịjirịa mkpa na 2023 abụghị onye ọchịchị ọhụrụ kama ọ bụ onye nnapụta, dịka Chineke ziteere Israel onye nnapụta we mee ka ala ha nwee udo ruo afọ 80.

Udo ga akawanye mma n'ụwa - Ụkọchukwu Adeboye

Enoch Adeboye

Ebe foto si, Pastoreaadeboye/Instagram

Onyeisi ụlọụka 'Redeem Christian Church of God' bụ ụkọchukwu Enoch Adeboye kwuru na udo ga-adị n'okirikiri ụwa niile na 2023 karịa etu ọ dị na 2022.

Adeboye kwukwara na ihu eluigwe ga-akawanye njọ n'ebe ụfọdụ na 2023.

Ọ gara n'ihu kwuo na "ọtụtụ ndị na-akpata nsogbu agaghị enwe ike ịme ya ọzọ na 2023".

"Ụfọdụ ndị mpako, a ga-ebutu ha ala n'afọ a," Adeboye kwukwara.

Uche Chineke ga-emezu - Lazarus Muoka

Lazarus Muoka

Ebe foto si, tlccrmofficial

Onyeisi ụlọụka Chosen Charismatic Revival Ministries' bụ lazarus Muoka kwuru na uche Chineka ga-emezu na 2023.

Na mkparịtaụka ya na ụlọntaakụkọ 'Guardian' oge a jụrụ ya maka amụma o nwereike ibu maka afọ 2023, o kwuru sị: "Naanị ihe m ga-ekwu bụ na Chineke ga-eme ihe bụ uche ya".

"Amụma banyere ọgwụgwụ oge ga na-abịa na mmezu. Chineke nwere ebumnuche maka ndị mmadụ, Jesus na-abịa ịkpọrọ ndị nke ya, Chineke na-atụ anya ka anyị niile dị njikere maka oge ọ ga-abịa. Nke a bụ amụma m na-ebu."

E nwereike ire akpa osikapa N80,000 - Primate Ayodele

Primate Ayodele Elijah

Ebe foto si, primateayodele

Onyeisi ụlọụka INRI Evangelical Spiritual Church bụ Primate Elijah Ayodele kwuru na afọ 2023 nwereike ibute nnukwu ahụhụ na Naịjirịa ma ọ bụrụ na "onye ọjọọ" banye n'ọchịchị.

Ayodele kwuru na "otu onye n'ime mmadụ atọ a ma ama na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa abụghị ezigbo ya".

"Ụmụ Naịjirịa ga-azụ akpa osikapa si mba ofesi n'ọnụego N80,000 ma ọ bụrụ na anyị tụnyere onye abụghị ezigbo ya."

"Mmanụ 'diesel' nwereike iru N1,500 maka otu lita... anyị kwesịrị ịmụ anya.

"Ihe anyị ga-eme bụ isekpuru ala kpee ekpere ka Chineke nye Naịjirịa onye kacha mma dịka onyeisiala na 2023, ọ bụghị ime mkpọtụ.

"Ọ dị mkpa ka Chineke họpụtara anyị onye kacha mma, ịjụ mmadụ maka ndụmọdụ ga-eme ka ihe kawanyere anyị njọ, maka na onye kacha mma n'anya mmadụ nwereike ọ dịghị mma n'anya Chineke.

"Ka Chineke mee uche ya na 2023."

Ọdachi agahị adị na ntuliaka dịka ndị mmaọ̄ụ si eche - Joshua Iginla

Joshua Iginla

Ebe foto si, joshuaiginla/Instagram

Onye amụma Joshua Iginla, bụ onyeisi ụlọụka 'Champions Royal Assembly' kwuru na agaghị enwe nnukwu ọdachi dịka ụfọdụ ndị mmadụ na-atụ egwu na ntuliaka 2023.

"Mana onye ọbụla kwesịrị ị na-ekpesi ekpere ike, onye egena ndị amụma na-ekwu na a ga-enwe ọgbaaghara ntị," Iginla kwuru.

"Aka Chineke dị na obodo a. Aka Chukwu jidere obodo a.

"Mana ka anyị kpee ekpere maka Abuja iji gbochie mwakpo ndị iro n'ebe a.

Afọ "ọnwụ na mbilite n'ọnwụ - Daniel Olukoya

Daniel Olukoya

Ebe foto si, Daniel Olukoya

Ọkammụta Daniel Olukoya bụ ụkọchukwu nwe ụlọụka a ma ama na Naịjirịa bụ 'Mountain of Fire and Miracles Ministries, maọbụ MFM n'ịchafụ.

Ewepụ na ọ bụ onye ụkọchukwu, Olukoya bụkwa ọkammụta na ngalaba 'Biotechnology'. Ọ kụziela na mahadum dị icheiche na Naịjirịa.

N'ofufe nru nke ndị ụka MFM ji nabata afọ ọhụrụ, Olukoya kwuru ka ndị mmadụ mụrụ anya ma na-ekpesi ekpere ike n'afọ a.

"Afọ a bụ afọ mgbanwe na nnwereonwe nye ọtụtụ mmadụ

"Ọ bụ afọ Chineke ga-ebutu ndị mpako

"Ọ bụ afọ ịma ikpe maka ndị ọchịchị ọjọọ na ndị nkwado ha

"Ọ bụ afọ Chineke ga-ekwu okwu megide ndị ọjọọ" wdg.