Judaism in Nigeria: Lee ndị Igbo nwere olileanya na Israel ga-anabata ha dịka ndị Jew

Ndị Jew

Ebe foto si, IRUMS

Nkọwa foto, Ọnụọgụgụ ndị na-ekwu na ha bụ ndị Jew na Naịjirịa ruru puku iri na abụọ
    • Onye dere ya, Nduka Orjinmo
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Abuja

Shlomo Ben Yaakov bụ onye okpukperechi Jew, nke olileanya ya bụ ịbụ nnukwu onye nkuzi a na-akpọ 'Rabbi'.

Ọ bụ onyeisi n'ụlọ ekpere a kpọrọ Gihon Hebrew Synagogue nke dị na mpaghara Jikwoyi, n'Abuja.

Mana ọ bụ onye Igbo. Ezigbo aha Igbo ya bụ Nnaemezuo Maduako.

O kwuru sị: "Ana m ahụta onwe m dịka onye Jew."

"Ihe niile a anyị na-eme ebe a, bụkwa otu ihe a na-eme n'Israel."

Mana mba Israel ekwetaghị na ndị Igbo si n'agbụrụ Israel pụta.

Israel anaghịkwa ahụta ndị okpukperechi Jew nọ na Naịjirịa dịka ezigbo ndị Jew.

Ndị Igbo ha abụ ndị Jew n'eziokwu?

Ndí ichie Igbo

Ebe foto si, Ezeora, Obu-Gad Enugwu Aguleri.

Nkọwa foto, Obodo Aguleri ka kwenyere na nna nna ha bụ mba Israel ka o si malite njem

O teela akụkọ gbasara ndị Igbo na ndị Israel malitere.

Mana ndị ọkachamara na ndị gụlitere akwụkwọ kwuru na enweghị ihe akaebe doro anya gosiri n'ezie na ndị Igbo si na mba Israel pụta.

Chidi Ugwu, onye bụ ọkachamara na mmụta ọdịnala na Mahadum Naịjirịa dị na Nsụkka, kwuru na ọ bụ oge a lụchara agha Biafra ka okwu ndị Igbo ịbụ ndị Jew malitere.

O kwuru na ọ bụ n'ihi ahụhụ ndị Igbo tara n'oge agha mere ha ji na-atụnyere onwe ha dịka ndị Jew.

Aha onyonyo, Sefer Torah ndị Izrel nyere anyị abụghị maka Biafra - Ndị Igbo Jew

Ugwu kwuru sị: "Ọ bụ ihe mkparị ikwu na ndị Igbo agbụrụ furu efu. Onweghị ihe akaebe ọbụla kwadoro nkw."

"Ihe akaebe rụtụrụ aka na ndị Igbo si na mba Egypt wee pụta, puku kwuru puku afọ gara aga."

"O nwere ike ịbụ n'Egypt ka ndị Jew si nwetatụ ụfọdụ omenala ndị Igbo ha na-eme."

N'otu aka ahụ kwa, Rabbi Eliezer Simcha Weisz, kwukwara na onweghị ihe gosiri na nna nna ndị Igbo si na mba Israel.

Eliezer Simcha Weisz

Ebe foto si, Youtube screengrab

Nkọwa foto, Rabbi Eliezer Simcha Weisz bụ onyeisi ngalaba gọọmentị Israel ọrụ ya bụ inyochapụta eziokwu gbasara ndị mba ọzọ na-ekwu na ha bụ ndị Israel.

Weisz bụ onyeisi ngalaba gọọmentị Israel ọrụ ya bụ inyochapụta eziokwu gbasara ndị na-ekwu na ha bụ ndị Israel.

O kwuru sị: "Ha (ndị Jew Naịjirịa) na-ekwu na ha bụ ụmụ Gad, nke bụ nwa nna nna anyị bụ Jacob, mana ha-enwebeghị ike iwepụta ihe akaebe gbara ama maka nke a."

"Omenala ha na-ekwu na o yiri nke anyị, e nwere ọtụtụ ndị na-eme omenala ndị a."

"Naanị ihe ga-eme ka anyị nabata ha bụ ma ha abụ ndị si n'okpukperechi ọzọ bata na Judaism."

"Ma ọ bụghị otu a, anyị agaghị anabata ha."

Usoro e ji esi okpukperechi ọzọ abanye Judaism buru ibu.

Otu n'ime ha bụ na onye ahụ ga-apụta n'ụlọikpe ndị Jew, mana enweghị ụlọikpe dị otu a na Naịjirịa.

Shlomo Ben Yaakov

Ebe foto si, IRUMS

Nkọwa foto, Shlomo Ben Yaakov bụ onye Igbo. Ezigbo aha ya bụ Nnaemezuo Maduako. Mana okpukperechi ya bụ 'Judaism'

Mana Mazi Yakoov na-ekwu na ọ ihe mkparị ikwu na ha bụ ndị atọghatara atọghata.

O kwuru na a na-ahụta ndị atọghatara atọghata dịka ndị mbịarambịara.

N'ime afọ olemole gara aga, ndị Igbo na-ekwu na ha bụ ndị Jew abaala ụba.

Mazi Nnamdi Kanu, onye isi otu na-azọ nnwereonwe Biafra bụ IPOB, na-akpọ onwe ya onye Jew.

Kanu nwere ọtụtụ ndị mmadụ na-akwado ya n'ala Igbo.

Rosh

Ebe foto si, Irums

Nkọwa foto, Mazi Ovadai Avichai kwuru na ụjọ tụrụ ya oge Nnamdi Kanu na IPOB malitere n'ihi na ọ ma na ha nwereike itinye ha bụ ndị okpukperechi Judaism na nsogbu.

Mana n'ime ndị Igbo na-ekpebu Judaism kamgbe ụwa, ha anaghị ahụta ndị nkwado Mazi Kanu dịka ezigbo ndị Jew.

Ovadai Avichai, bụ onye Igbo na-ekpe Judaism, kwuru na "oge IPOB malitere, e bere m akwa n'ụlọ nsọ".

"Ekwuru m na nwata nwoke a abịala ibutere anyị nsogbu, n'ihi na ihe ọ na-eme ekwesịghị."

Mazi Avichai kwuru na ụjọ ya bụ na ihe Nnamdi Kanu na-eme nwere ike ibutere ha bụ ndị Jew nsogbu.

Rudy Rochman

Ebe foto si, Rudy Rochman/Facebook

Nkọwa foto, Rudy Rochman, onye Jew si mba Israel, gara leta eze ọdịnala Aguleri oge ọ bịara njem na Naịjirịa

Ha nwuchikwara nwa ada Lizben Agha, onyeisi ụlọ ekpere ndị Jew dị n'Ogidi, ọ nọọ otu ọnwa na mkpọrọ ndị DSS tupu a tọhapụ ya.

Ka ọ dị ugbua, Yakoov na ndị otu ya ka nwekwara olileanya na ha ga-enwe ike ife Chukwu n'ụzọ Judaism etu ha si chọọ.

O kwuru sị: "Maka anyị bụ ndị ma mgbọrọgwụ anyị, obi siri anyị ike maka ebe mgbọrọgwụ anyị si."

"Ọ bụrụ na ndị oru Kraịst na ndị alakụba na-anabata ndị otu ha, na-enyekwa ha nkwado, e chere m na ndị Jew kwesịkwara igosi anyị nkwado.