Sefer Torah ndị Izrel nyere ndi ntoroọbịa Jew na Naịjirịa ọ bụ maka Biafra?
Onye ndu ndị ụka Jew n'Abuja bụ Shlomo Yaakov Maduakor sị na onye butere ihe a bụ onye bịara ịmata maka omenla Igbo.
O kwukwara na ya bu onye Igbo mana "o nwere ihe dị iche na ofufe nakwa ndọrọndọrọ ọchịchị".
Ọ sị na nke a bụ maka ịchụnta nwereonwe abụghị ihe ofufe, ọ bụ ihe metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị.
Shlomo Maduakor sị na tupu amalite okwu Biafra ofufe ndị Jew nọ ya.
Ọ sị; "Ọ bụ ihe mwute na ndi mmadụ na-etikọta ha abụọ."
Maduakor dokwara anya na Sefer Torah e butere ha abụghị nke mbụ nọ na Naịjirịa.
Ọ sị na ha nwere ya n'ụlọ ụka ha n'ebe dị iche iche na Naịjirịa.
"Anyi na-ebupute ha Satọde niile iji ya aka ụka."
Ọ sịkwa na ihe mere nke a jiri pụọ iche bụ na ọ bụ ndị ntoroọbịa ka enyere ya ka ha ghara ịna aga n'ụlọ ụka ndị ọzọ ebute Sefer Torah.
Na nkọwa Maduakor, njem Rudy Roichman na ndị ọzọ ibutere Sefer Torah bụ maka ịmata omenala Igbo.
Ha mecha nchọpụta, ha ewere ya laghachie Izrel.