Ihe mere m ji laghachi ga tụọ vootu n'agbanyeghị ndị omekome wakporo m

Aha onyonyo, Ihe mere m ji laghachi ga tụọ vootu n'agbanyeghị ndị omekome wakporo m

Jennifer Efidi, nwaanyị ahụ akụkọ ya fesara na soshal midia maka etu ndị omekome si wakpoo ya ma merụọ ya ahụ oge ọ gara ịtụ vootu na Legọs, akọọrọla BBC etu ya bụ ihe si mee.

Onyonyo nakwa foto nwaada Efidi gbasara dịka o laghachiri azụ ga tụọ vootu n'agbanyeghị mmerụ ahụ ya.

"Oge m garuru ebe m ga-anọ tụọ vootu, agara m chọọ aha m n'akwụkwọ ntuliaka, hụ ya, gazie kwụnye n'ogologo ahịrị, mana emechara m chọọ otu ebe nọdụ ala," Efidi kwuru.

"Ka ọ gachara obere oge, ụfọdụ ụmụokorobịa bịara kwụrụ nso ebe anyị kwụ, ma mechaa pụọ, ịtụ vootu ka na-agakwa n'ihu oge ahụ."

"Oge ihe dịka nkeji 30 gachara, otu ihe kụrụ m n'ihu dịka onye a tụrụ okwute, anụkwara m ụda egbe, m wee chee na ọ mmadụ gbara m egbe. Ọtụtụ ndị mmadụ malitere ịgba ọsọ. Ejidere m ihu m aka, ọbara a na-awụsị ebe niile."

Efidi Jennifer
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

"Ebidoro m iti mkpu na-akpọ oku ka ndị mmadụ nyere m aka, mana onweghị onye gere m ntị.

"Abanyere m n'ime otu ụlọ ebe otu nwaanyị bi n'ogbe m bịara were 'handkerchief' ya jigide m n'ihu iji gbochie ọbara ịgba. Anyị na-eti mkpu mana ndị mmadụ na-agba ọsọ na-emechi ụzọ ha."

"Emechara m banye n'ime ụlọ otu onye ka m nọrọ ebe ahụ kpọọ di m n'ekwentị, mana ụjọ na-atụ ma ụmụ okorobịa ahụ a ga-emerụ di m ahụ, n'ihi na ha ka na-agba egbe."

Efidi kwuru na ụfọdụ ụmụ nwoke katara obi kpọrọ ya gaa na nke otu onye nọọsụ gbara mbọ ịkwụsị ọbara na-agba ya. Di ya mechara bị buru ya gaa ụlọọgwụ ebe a nọrọ kwaa ya ihu ma gbaa ya ọgwụ.

Ihe mere m ji laghachi azụ ga tụọ vootu

Efidi Jennifer

"Ekwenyere m na vootu m nwereike ime ka ihe dị iche dị. N'agbanyeghị ahụ m merụrụ, enwere m nnukwu mmasị ịtụ vootu, ọ bụ ya mere m ji gaa tụọ vootu oge m si n'ụlọọgwụ laghachi," Efidi kwuru.

O kwuru na o wutere ya na ndị ọrụ nchekwa anọghị n'ọgbọ ntuliaka iji kwụsị ọgbaaghara.

"Ndị ekperima ahụ bịara kụrie igbe ntuliaka, ọ bụrụ na ndị ọrụ nchekwa nọ ya, ụjọ gaara atụ ha ịbịa wakpo anyị, mana ọ bụ naanị anyị nọ ebe ahụ," ka o kwuru.